Sunday Igboho: Anyị gburu mmadu abụọ nwuchie mmadụ 13 na be ya - DSS

Ebe foto si, DSS
Ọnụ na-ekwuru ngalaba uweojii pụrụiche nke Bekee kpọrọ "Department of State Service" (DSS) bụ Peter Afunanya ekwuola na ọ bụ ha gara njem na ụlọ Sunday Adeyome (Eji Sungay Igboho mara ya) n'ọnụ ụtụtụ Tọzde.
Cheta na akụkọ pụtara na Tọzde kwuru na ndị yi uwe ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ Sunday Igboho ma gbuo ọfọdụ mmadụ.
Maazị Afunanya gwara ndị ntaakụkọ sị eeh, na ọ bụ mmadụ abụọ ka gburu dịka ha na ndị nche Maazị Igboho malitere ịkwa mgbọ dịka ha rutere ebe ahụ n'isi ụtụtụ Tọzde.
Ọ sị na ha nwuchiri mmadụ iri atọ n'ebe ahụ dịka Maazị Igboho ji ohere ahụ a na-akwa mgbọ gbaraga.

Ebe foto si, DSS
Maazi Afunanya sị na ugbua Sunday Adeyemo bụ onye a na-achọ achọ.
DSS sị na ha nwetere egbe AK-47 ise nakwa nke Bekee na-akpọ pump action na bee Igboho.

Ebe foto si, DSS
Ha sịrị na ha na-eche na ụfọdụ n'ime ha bụ egbe anarala ndị ọrụ Customs na oké ala Ịdị Iroko dị n'Ogun Steeti.
Mgbọ tụtara otu onye DSS n'aka na mwakpo ha mere.

Ebe foto si, Sunday_igboho1/Instagram
Sunday Adeyemo pụtara ụnyaahụ lkwu na ya akagbuola ngagharịiwe ya nd ndị otu ya chọburu ime n'ụbọchị Satọde, abalị atọ nke ọnwa Julaị afọ 2021.
Igboho kwuru nke a dịka nọ sị na ndị agha wakporo ụlọ ya n'Ibadan nisi ụtụtụ ụbọchị Tọzde a.
Na mkparịtaụka ya na BBC, o kwuru na ihe o ji kagbuo ngagharịiwe a bụ iji wee zọọ ndụ ya.
Igboho kwukwara na mmadụ abụọ nwụrụ n'ụlọ ya na mwakpo ahụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka a na-achọ achọ.
Mana ndị uweojii Oyo steeti gwara BBC na ha anụbeghi maka ya bụ ihe mere na be Sunday Igboho.
Ngozi Onadeko, bụ Kọmishọna ndị uweojii n'Oyo steeti kwuru na ya anụbeghị maka ihe a, ma kwuo na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ka nwere ike iwepụta ozi maka ya.
Etu ya bụ ihe si mee

Ebe foto si, Elites Media
Na mkparịtaụka ya na BBC, Sunday Igboho kwuru sị: "Anọ m n'ụlọ m ihe dịke elere nke mbụ na ọkara n'ime abalị."
"M wee malite ịnụ ụda egbe n'ihu be m, nụkwa ndị tiri mkpu sị 'anyị bụ ndụ agha, anyị bụ ndị DSS, Sunday Igboho pụta ebe a'".
"Mgbe m leputere anya na windo, ahụrụ m ndị yicha akwa ndị agha na ndị DSS."
"Ihe a gbagwojuru m anya n'ihi na onweghị onye ọbụla m gburu."

Ihe jikọrọ Sunday Igboho na Nnamdi Kanu
Mwakpo ụlọ Sunday Igboho na-abị abalị olemole gọọmentị Naịjirịa nwuchiri Mazi Nnamdi Kanu, onye isi ndị otu nwereonwe Biafra bụ IPOB.
Kamgbe ahụ, akụkọ malitere ifegharị na e nwekwara ike inwuchi Sunday Igboho.
Mana onwebeghị onye ma ndị wakporo ụlọ Igboho n'abalị Tọzde. Nke a abughị nke mbụ a na-awakpo ụlọ Sunday Igboho.

Ebe foto si, Igboho and Kanu Instagram/Facebook
Mazi Sunday Igboho bụ onye na-akwado Nnamdi Kanu ma bụrụkwa onye chọrọ ka ala Yoruba si na Naịjirịa pụọ bụrụ mba nke aka ha a kpọrọ 'Oduduwa Republic'.
Ugboro ugboro ka Igboho kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị etiti wakpo Nnamdi Kanu na ndị otu ya bụ IPOB, ya onwe ya bụ Igboho ga-ebusokwa gọọmentị Naịjirịa agha.
Kamgbe akụkọ pụtara na Nnamdi Kanu nọzị n'aka ndị DSS Naịjirịa, Sunday Igboho ekwuola na nke ahụ agaghị eme ka ya na ndị otu ya daa mba.
Ọnụ na-ekwuru ya bụ Olayomi Koiki kwuru sị: "Nwuchi Nnamdi Kanu anaghị amapụ Sunday Igboho obi."
"O meghịkwanụ ka ọ kwụsị nkwado ọ na-enye ndị na-achọ Biafra."
"Nke a agaghị eme ka anyị kwụsị ngagharị nke a nyị kwadoro ime na Legọs n'ụbọchị atọ nke ọnwa Julaị 2021 iji kpọọ oku maka nnwereonwe ala Yoruba."













