Willie Obiano's Wife: Ndị ekperima awakporo ụgbọala nwunye Obiano?

Ebe foto si, Ebere Obiano
Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na ha anụghị maka akụkọ mwakpo a sị na ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ụgbọala nsonso (convoy) nwunye Willie Obiano bụ aka na-achị steeti ahụ bụ bụ Ebere Obiano.
Akụkọ na-efegharị na-ekwu na a wakporo ụgbọala nsonso Oriaku Obiano n'Afọ Nnobi dị n'Okpuru ọchịchị Idemili-Saụt dị n'Anambara steeti n'ehihie Fraide.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo sị, " Enwetaghị m ụdị ozi ahụ."
"Anọ m ebe ụlọ ọzụzụ, ebe ọzụzụ na-aga n'ihu n'udo. Anyị enweghị nsogbu ọbụla ebe a."
N'otu aka ahụ otu onye dị Gọvanọ Obiano nso sị na ihe ndị a bụ akụkọ ọjọọ nke ndị achọghị ka e mee ntuliaka gọvanọ na-agbasa iji tinye egwu n'ahụ ndị chọrọ ịpụta tụọ vootu ụbọchị ntuliaka.
Emeka Ozumba bụ osote onyeisi mgbasaozi nye gọvanọ Obiano gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ mwakpo bụ akụkọ ụgha ndị mmadụ na-ebugharị iji gosi Anambara dịka ebe ọgbaghara dị.
O kwuru sị "nke a bụ akaọrụ ndụ na-achọ ite Anambara steeti ure ma me ka ọ dị ka ebe ọgbaghara dị n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na enweghi ihe ọbụla mere Dkt. Ebele Obiano, na ọ nọ n'ezigbo ahụike, na ọ ka si Ekwulọbịa bụ ebe ọ so ndị APGA gaa achụmnta vootu n'okpuruọchịchị Agụata.
O kwuru na enweghi mgbe e ji wakpoo ụgbọala nsonso ya, ma mgbe ọ na-aga aga ma mgbe ọ na-alọta alọta.
Nke a na-abịa dịka izu ole na ole a wakporo ụgbọala nsonso Gọvanọ Obiano n'ihiala oge ndị APGAa gara achụmtavootu Charles Soludo bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha otu pati APGA.
Akụkọ ka na-abịa.














