State of Emergency in Anambra State: "Onyeisiala Buhari akwadoghi ọnọdụ a n'Anambra"

Ebe foto si, NGR Govt.
Gọvanọ Willie Obiano apụtala na njem ọ gara ị hụ onyeisiala Muhammadu Buhari n'ụtụtụ Tọzde.
Obiano sị na Onyeisiala Muhammadu Buhari nabatara ya n'obi ya nke ọma.
Obiano sị na Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ọnweghị mgbe gọọmentị ya bụ n'ụche ihiwe ọnọdụ gbata gbata Bekee kpọrọ "state of emergency" na steeti ahụ.
Kama ọ sị na Buhari kwuru na Gọọmentị etiti ga-ewelita ọnụọgụ ndị agha nọ n'Anambra steeti iji welita ọnọdụ nchekwa.
Ọ sịkwa na Buhari gbarụrụ ihu maka ndị na-eji aha ha nakwa aha gọọmentị ya akpagbu ndị mmadụ.
Ọ bụ ndị agaghị emerinwu na ntuliaka chọrọ ka e tinye ọnọdụ gbatata - APGA

Ebe foto si, APGA/Facebook
Otu All Progressive Alliance (APGA ) agbaghala ihe mere Gọọmenti Etiti ji chọọ itinye ọnọdụ gbatagbata n'Anambara steeti oge ọ fọrọ nanị otu ọnwa tupu e mee ntuliaka gọvanọ .
N' ozi mgbasaozi ha nke odeakwukwo pati ahụ binyere aka ya, APGA boro ya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-atụ egwu na ha agaghị enweta vootu ebubo ịkpa nkata isi azụụlọ weghara ọchịchị n'Anamabra.
" Anyị chere na ọ bụ ndị ma na ha agaghị emerinwu na ntuliaka bụ ndị na-achọ ụzọ ịkpachi uche ọha."
APGA kwuru na kama ịtinye ọnọdụ gbata gbata, Gọọmenti maa imi n'ala chọpụta ndị na-akpa mkpamkpa ha .
APGA na-ajụ ihe mere Gọọmentị Etiti ji chọọ itinye gbatagbata n'Anambra steeti ebe ha etinyeghị na steeti dịka Borno, Yobe, Kaduna, Niger na Nassarawa bụ ebe ha sịrị na mkpamkpa ka njọ na-akpa .
PDP adọọla aka na ntị maka ime 'state of emergency' n'Anambra steeti

Ebe foto si, Kola Ologbondiyan
Otu pati Peoples Democratic Party (PDP) adọọla aka na ntị na ọ gaghị adị mma ime ọnọdụ gbatagbata nke Bekee kpọrọ 'state of emergency', n'Anambra steeti.
PDP kwuru na atụmatụ itinye ya bụ ọnọdụ gbatagbata bụ atụmatụ pati nọ n'ọchịchị etiti bụ All Progressives Congress (APC) chọrọ iji napụ ndị mmadụ ikike ma zọtara onye nke ha oche gọvanọ steeti ahụ.
Ha kwuru na ihe mere ha ji ekwu nke a bụ n'ihi ụjọ ndị mmadụ na-atụ na nsogbu nchekwa dapụtara na steeti ahụ bụ nke e sinyere n'ọkụ iji kwasaa usoro onye-kwuo-uche-ya.
N'ozi Kola Ologbondiyan bụ ọnụ na-ekwuchitere pati ahụ ziputara, ha sị na gọomentị etiti Naịjiria nwere ikike ịhụ na udo dị n'Anambra steeti tupu e mee ntuliaka, ma a na-eme ntuliaka ya na mgbe e mechara ya bụ ntuliaka a na-eme n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2021, ma ọ bụrụ na ha chọọ.
"Anyị na-akpọku gọọmentị nọ n'ọchịchị nke Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya, ka ha mee ihe ha kwesịrị ime," ka o kwuru.
State of Emergency: Nke anyị ọ ga-adịzị iche? - Gọọmentị Anambra

Ebe foto si, Willie Obiano
Gọọmentị Anambra steeti katọrọ ihe gọọmentị etiti kwuru na e nwereike itinye ọnọdụ 'State of emergency' na steeti ahụ.
Kọmishọna mgbasaozi Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru nke a na mparịtaụka ya na ndị Channels TV.
Adinuba kwuru na gọọmentị etiti egosila na ihe na-eme n'Anambra steeti ugbua bụ ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpata ya.
O kwuru sị: "Kedụ ka ọnọdụ dị na Borno, Niger, Plateau, Adamawa, Taraba na ebe ndị ọzọ? Mana INEC mechara ntuliaka ebe ndị a ma kpọpụta mpụtara ha."
"Kamgbe ọgbaaghara a bidoro n'Anambra, ndị nwụrụla na ya akarịbeghị iri na ise."
"Gịnị mere nke Anambra ga-eji pụọ iche nke ga-eme ka gọọmentị etiti na-ekwu okwu itinye ọnọdụ gbata gbata?"
Adinuba kwuru na ihe niile dị mma n'Anambra, "ndị mmadụ na-akpagharị, ahịa na-azụ, ụlọ akwụkwọ na-agụ. Gịnịzị ka a ga-eji tinye ọnọdụ gbatagbata?"
Lee ihe ise ga-eme ma gọọmentị etiti tinye 'state of emergency n'Anambra steeti

Ebe foto si, Presidency
Gọọmenti etiti ekwuola na e nwere ike itinye ọnọdụ gbatagbata nke bekee kpọrọ 'state of emergency' n'Anambra steeti.
Nke a na-abịa dịka ọnọdụ enweghị nchekwa na-arị elu na steeti ahụ.
Chetakwa na ndị otu IPOB ekwuola ugboro ugboro na ha agaghị ekwe ka e mee ntuliaka ọbụla n'Anambra steeti
Abubakar Malami kwuru okwu 'state of emergency' a n'ụbọchị Wenezde dịka e mechara ọgbakọ 'Federal Executive Council' nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.
Malami kwuru sị: "Anyị ga-eme ihe ọbụla anyị nwere ike iji hụ na ntuliaka gara n'ihu n'Anambra steeti."
"Dịka ndị ọchịchị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ịhụ na e nwere nchekwa ndụ na akụnụba n'obodo."
"Ọ bụrụ na anyị chọpụtara na gọọmentị steeti enwenwughị ike ime ka e nwee nchekwa, anyị ga-eme ihe anyị nwere ike iji weta nchekwa, nke gụnyere 'state of emergency."
Mana gịnị ka 'state of emergency' pụtara?

Ọnọdụ 'state of emergency' bụ ọnọdụ gọọmentị na-etinye iji hụ na udo chịrị n'obodo.
Ọ bụ mgbe enweghị nchekwa dịka ọ gafeela oke ka gọọmentị nwere ike itinye ọnọdụ a.
Nke a mee, ọ bụ ndị agha ga-eweghara ọnọdụ, ma n'ọchịchị ma n'ihe niile.
Ọ pụtara na ikike dịịrị gọvanọ steeti ahụ agaghịzi adịrị ya n'ihi na ndị agha ga-eweghara ọchịchị nwa mgbe nta.
Ihe nwere ike ime ka e tinye ọnọdụ 'state of emergency'
Akwụkwọ iwu Naịjirịa kọwara ihe asaa nwere ike ime ka e tinye ọnọdụ gbata gbata
- Ọ bụrụ na Naịjirịa nọ n'agha
- Ọ bụrụ na egwu dị na Naịjirịa ga-abanye n'agha
- Ọ bụrụ na ọnọdụ enweghi nchekwa rịa elu na Naịjirịa maọbụ na mpaghara ọbụla ruo nke na ọ dị mkpa ka e mee ihe anabụghị eme iji weta nchekwa
- Ọ bụrụ na egwu dị na ọnọdụ nchekwa ga-arị elu gafee oke
- Ọ bụrụ na e nwee nnukwu ọdachi nke metụtara otu mpaghara Naịjirịa n'ụzọ pụrụ iche. Ọdachi a nwere ike ịbụ nke osinachi nke bekee kpọrọ 'natural disaster'
- Ọ bụrụ na e nwere egwu nke nwereike ikpochapụ Naịjirịa
- Ọ bụrụ na Onyeisiala anata ozi nke na-arịọ ya ka o tinye ọnọdụ gbata gbata na mpaghara ọbụla. Ozi a nwere ike isi n'aka gọvanọ steeti site na nkwado ndị omeiwu steeti ahụ, maọbụ n'aka ndị ụlọ omeiwu nke etiti.










