Ndị gburu Chike Akunyili na-ekwu ka a ghara ime ntuliaka n'Anambara - Ifeanyi Ubah

Aha onyonyo, Ndị gburu Chike Akunyili na-ekwu ka agharị ime election n'Anambara - Ifeanyi Ubah

Dịka ndị mmadụ na-etinye ọnụ n'etu ndi omekome ji egbu mmadụ aghara aghara n'Anambara Steeti, onye na-azọ ọkwa gọvanọ Steeti ahụ n'okpuru pati Young Progressive Party (YPP) akatọọla nkwafu ọbara ahụ.

Maazị Ubah sị na ndị na-akpa ike a n'Anambara na-ekwu na ha achọghị ka eme ntuliaka na Steeti ahụ.

Ọ kwuru na nke abụghị ihe ziri ezi makana ime ntuliaka iji họpụta ndi ga-achi obodo dị oke mkpa.

Ọ sị ka ndị na-eme ihe a kwụsị, ma kwukwaa na otu Indigenous People of Biafra (Ipob) apụtala kwuo na onweghi oge ha Jiri si ka akwụsị ntuliaka n'Anambara.