Anambra Saturday School: Ụlọakwụkwọ mepere taa dịka gọọmentị nyere n'iwu

Ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'Ọka

Ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'Anambra steeti n'ụtụtụ Satọde, 30 nke ọnwa Ọktoba 2021, dịka gọọmentị steeti ahụ nyere iwu.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ka ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'isiobodo Ọka bido n'ebe elekere asaa nke ụtụtụ.

Ụlọakwụkwọ dị n'Ọka
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ Girls' Secondary School Awka

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ yi uwe ankara bụ nke ha na-eyikarị aga akwụkwọ n'ụbọchị Wenezde na steeti ahụ (nke gọọmentị kwuru ka ha na-eyi iji kwalite asụsụ nakwa omenala Igbo), ebe ndị ọzọ yi uwe nkịtị na-abụghị uwe ụlọakwụkwọ ha.

Nwata akwụkwọ yi uwe ankara n'Ọka

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Nwata akwụkwọ yi uwe ankara aga akwụkwọ n'Ọka

Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ na ụfọdụ ụlọakwụkwọ mechiri ọnụụzọ ama ha, ma kwe ka ụmụakwụkwọ na-abata otu otu ghara ikwobata ekwobata.

Ụlọakwụkwọ dị n'Ọka
Nkọwa foto, Ọnụụzọ ama ụlọakwụkwọ National Secondary School mechiri emechi

Nke a bụ mbụ a na-agụ akwụkwọ Satọde na steeti ahụ dịka gọọmentị steeti ahụ tinyere iwu sị ka ụmụakwụkọ jiri Satọde na-agụ akwụkwọ dịka a na-eme 'nọrọ n'ụlọ' ụbọchị Mọnde ọbụla.

Cheta na ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere ụbọchị nọrọ n'ụlọ kwa Mọnde iji mee ka gọọmentị Naịjiria tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyeisi ha e ji kemgbe ọnwa Juun.

N'agbanyeghi na ha kwuru na ha akagbuola ya bụ nọrọ n'ụlọ, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-erube isi ma na-anọ n'ụlọ.

Anambra Saturday School: Ihe mere anyị ji wepụta ụbọchị Satọde maka agụmakwụkwọ - Gọọmentị Anambra

Ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ na Nnewi

Kọmịshọna mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Don Adinuba akọwala ihe mere ha ji hiwe ụbọchị Satọde dịka ụbọchị akwụkwọ na Anambra steeti.

Ọ kọwara nke a nye BBC Igbo n'ụtụtụ ụbọchị Tuuzde 26 Ọktoba n'afọ 2021.

N'ọnụ ya, ọ sị "Anyị chọrọ ka ụmụakwụkwọ niile nọ n'Anambra steeti nweeike mụta akwụkwọ n'ebe nchekwa zuruoke dịịrị ha."

Nke mere anyị ji malite atụmatụ ga-eme ka obi dị ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi, ndị nne na nna nakwa gọọmentị mma.

Na ngwụcha o kwuru na Gọọmenti Anambra steeti achọghị ka Anambra steeti buru ndị ikpeazụ n'ihe gbasara agụmakwụkwọ.

"Agụmakwụkwọ n'Anambra steeti amụbawala kemgbe Gọvanọ Willie Obiano banyere n'ọkwa" dịka Adinuba kwuru.

O kwuru na o doro anya na ndị hibere atụmatụ 'Sit at home' achọghị ọganihu ndị Igbo site n'ịkwụsị ndị mmadụ ị ga ahịa, ị ga akwụkwọ nakwa ị ga ọrụ.

Mgbe BBC Igbo jụrụ Adinuba ma ịbụgharị agụmakwụkwọ rue Satọde apụtara na ndị otu Ipob emeriela lee ihe ọ sara:

Don Adinuba
Nkọwa foto, "O nwere onye chọrọ ka egbuo ụmụ ya maọbụ ndị nkuzi ya n'ihi ịgụ akwụkwọ?"

"O nwere onye chọrọ ka egbuo ụmụ ya maọbụ ndị nkuzi ya n'ihi ịgụ akwụkwọ?"

Ọ gara ihu maa atu etu ndị omekome si wakpoo ọgbatumtum ndị nkuzi n'otu ụlọ akwụkwọ n'ihi edebeghi atụmatụ 'Sit at home' mgbe ahụ.

Ọ tụrụ arịrị n'ihe mere ndị mmadụ ka ji akwado ndị na-akpa mkpamkpa a na-akpọ ha "ndị na-alụrụ Igbo ọgụ" karịa ndị na-emebi ihe ha bụ.

Ndị ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'ụbọchị 'Sit at home'

Na ngwacha o kwuru na ntụliaka Anambra steeti ga-aga n'ihu maka na gọọmentị etiti ezigaala ndị uweojii, ndị agha nakwa ndị agha mmiri iji nye aka weta nchekwa mgbe ahụ.

Otu onye nna gwara BBC Igbo okwu sị na atụmatụ a adịghị mma maka na Gọọmenti na-egosi na ha anyị achịtanwụ steeti.

Ọ sị na ọ na-egosi ịdamba nakwa ike adịghị gọọmenti ime ihe ha nwereike ime ichekwa obodo.