Ifeanyi Ubah Exclusive: 'A na m achọ ọdịmma ndị Igbo, o nweghi mgbe m ga-ere Nnamdi Kanu'
Ifeanyi Ubah bụ onye jiri ọkọlọtọ Young Progressives Party azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti etinyela ọnụ n'okwu Nnamdi Kanu
Dịka onye omeiwu na-anọchị anya Anambra South, o kwuru na gọọmenti etiti kwesiri ịbịa kọwara ndị ụlọomeiwu ukwu etu ha si nwụchị onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
O kwukwara maka etu o ga-esi mee ka ndị Anambra bụrụ steeti ndị ọzọ ga na-eṅomi eṅomi .
Ihe ndị ọzọ o kwuru dị n'ihe nkiri a dị n'elu ebe a.