Ability in disabililty: 'Ọrụsị m nwere adịghị akwụsị m inwe anụrị' - Nwa nlecha nwere otu aka
Nwanne ọ kwa i nwere aka abụọ ma na-ekwu na ume adịghị gị?
Ngwa bute oche ka i kirie ka Agaezichukwu Ogbata (Ziechi) bụ ọmalicha nwagbọghọ nwere otu aka si eme karịa gị.
Anyị hụrụ ya ebe o ji otu aka ebi ụgụ ma na-emekwa ọtụtụ ihe echeghị na ndị nọ n'ọnọdụ ahụ ga-emeli.
Kirie ya n'uju ebe a.
Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo, Ebere Ekeokpara na Chimamaka Ihenacho