Dot Nation: Joe Igbokwe nwere ikike ikwu uche ya - Onye enyemaka Abaribe

Aha onyonyo, Dot Nation: Abaribe na-anọchcite ndị Igbo ọfụma- Ohaneze

Uche Awom bụ onye enyemaka Sịnetọ Enyinnaya Abaribe asaala Joe Igbokwe okwu o kwuru gbasara uwe 'Dot Nation' Abaribe yi.

Maazị Awom gwara BBC n'ekwentị na Maazị Igbokwe ekwuola ihe ọ chọrọ ikwu dịka o nwere ikike ikwu uche ya.

Cheta na otu Ohaneze Ndigbo toro Enyinnaya Abaribe maka iyi uwe e dere 'Dot Nation' iji gosi onye Igbo ọ bụ mana Joe Igbokwe bụ Onye enyemaka pụrụ iche n'ihe gbasara ọwammiri na Legọs steeti sị na o meteghị ya.

Igbokwe sị na Abaribe bụ "onye nkewa agbụrụ", na-alafu ndị ntorobia.

O kwuru na ọ na-akwado ndị na-akwafu ọbara.

Gee ebe o kwuru ya n'uju ebe a

Nke a na-abịa dịka Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchite Abia South n’Ụlọomeiwu Ukwu yi uwe e deere “Dot Nation” were gaa ụlọomeiwu.

Foto ebe o ti uwe ahụ gbara n’ịntanet were wuru ọkụ ụbọchị Tuzde, abalị 22 nke ọnwa Juun afọ 2021.

Cheta na okwu “Dot Nation” maọbụ “Dọt People” maọbụ okwu yiri ya malitere iwu ewu n'etiti ndị Igbo na soshal midia dịka onyeisiala Muhammadu Buhari kkwuchara ndị Ipob na ndị Ọwụwa Anyanwụ dịka “kpọm n’ime okirikiri”.

N'okwu uwe Abaribe yiri, otu Ọhaneze kwuru na o gosiri na Abaribe na-anọchie ndị Igbo ọfụma.

Ohaneze ndị kwuru na ndị Igbo bụ ndị na-ewulie ebe ọbụla ha gara kwuru na ihe dị mkpa abụghị ihe a kpọrọ ka ndị Igbo kama ọ bụ ihe ndị Igbo bụ n'ezie.

Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya nwere n'ekwentị, ọ sị “Abaribe a yi akwa bụ oke mmadu."

"Anyị bụ ndị Ohaneze ji ya eme ọnụ. Ihe dị mkpa bụ mmadụ ịghọta onwe ya, nwe ntụkwasịobi n’onwe anyị bụ ezigbo onye Igbo anyị. Ọ na-anọchite ndị Igbo ọfụma.”

Ogbonnaya,gara n'ihu sị, "Oge a kpọrọ anyị dọt, o wuteghị m.”

“ Ihe ndị mkpa bụ anyị aghọtakwara onwe anyị mara ihe dị anyị n’ime .”

“Ndị Igbo bụ ‘dot’, ndị Tiv bụ dot. Ọ bughị so ha bụ dot.”

“Mana‘dot’ nke anyị bụ ‘dot’ ndị ma ihe, ndị na-eweta ọganihu.”