'Egwu ji anyi n'Adani kamgbe egbuchara ndị agha abụọ na be anyị' -HRH Igwe P .Okafor
Obodo Adani n'Enugwu steeti dịzị ka ebe agbara ọsọ agha n'ihi na egwu ji ndị mmadụ banyere ogbugbu egburu ndị agha abụọ n'Ụbọchị tuzde 13th June 2021.
Mkpa mkpa ahụ mere na mgbde tuzde mgbe ndị ji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo ndị agha nọ n'okporo ụzọ eche nche na agbata Adani na Igah gbagbuo ndị agha abụọ ma buru egbe ha.
Igwe na-achị Adani bụ HRH Ezeudo Patrick Okafor gwara BBC na egwu jizi onye ọbụla nke na ọtụtụ ụmụ ikorobia agbaala ọsọ n'ihi egwu ihe ndị agha ga-eme maka ndị otu ha lara mmuo.
Igwe Okafor kwara arịrị na ha amaghị ndị bịara be ha gbuo ndị agha ahụ ma kwuo na ndị oji egbe ahụ eteela ha kpawara ike na Adani nakwa obodo gbara ha gburu gburu dịka, Opanda, Nimbo, Abi, Ugbene Ajima nakwa Ezeani.
Nchọpụta gosiri na ọ bụ eziokwu na ndị oji egbe ahụ amaghị ndị ha bụ agbaala ụlọ ndị uweojii n'Adani ọkụ ebe ha chụpụkwara ndị uweojii nọ n'Opanda.
Otu onye agha ekweghị ka akpọọ aha ya kwuru na ndị omekome ahụ chọrọ ka ha chụpụsịa ndị agha na ụzọ Uwani ka ha nwee ike ịdị na-egbu mmadụ dịka ha na emebu na ya bụ gburu gburu Uzo-Uwani.
Otu nwa agbọghọ bụ Chidimma Egah kwuru na egwu na atụ ya n'ihi na ha amaghi ebe ndị na-awakpokari Adani na agbata obi ha si abịa.
Ndị agha keziri nkwụcha nọrọ na Opanda nakwa ezi e si abanye Adani ma nosikwaa ike ebe ahụ agbagburu ndị otu ha.

