'Unknown gunmen' egbuola ndiagha abụọ n'Enugwu

Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha

Ebe foto si, AFP

Ndị agha Naijiria ekwuola na ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu ESN egbuola ndị otu ha mmadụ abụọ ụbọchị Tuzde.

Ndị a bu egbe gburu ndị agha n'ụzọ ụtụtụ Tuzde na mgbochi ụzọ ndị agha dị n'okporoụzọ Nsukka-Adani n'Enugwu steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ya bụ akụkọ bụ eziokwu, ma kwuo na ha ezigala ndị otu ha ebe ahụ iji hụ na ụdị ihe ahụ emeghị ọzọ.

N'ozi mgbasaozi o dere, ọ sịrị, "Ezipụla ndị agha Naijiria ka ha gaa kwụsị ike ndị bu egbe na-akpa n'obodo Adani nke Okpuru ọchịchị Ụzọ-Uwani nke Enuugwu steeti."

"Ụnyahụ bụ Julai 13, 2021, ndị agha chuchighara ndị otu Eastern Security Network ji egbe wakpoo ọnọdụ ndị agha dị n' Iggah/Asaba."

"Ọ bụ ihe mwute na ọgụ dara n'etiti ha, ndị agha abụọ nwụrụ ebe ha na-achụ ndị omekome mere ihe a."

Cheta na nke a na-abịa ọnwa abụọ ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị agha na ndị e chere na ha bụ ndị otu Ipob bụ ebe e gburu mmadụ isii.