Enugu Police: Anyị na-enyocha onye otu anyị e chere gburu okoroọbịa n'Oji River
Akụkọ ndị dị mkpa:

Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na ha amalitela inyocha onye otu ha eche na o gburu otu nwaokoroọbịa a kpọrọ Chinonso na Nkwo Inyi dị n'Oji River.
Ọ nụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Ebere Amaraizu sị na aka ha akpara onye ọrụ ha ahụ dịka Kọmshịọna enyela iwu ka a malite inyocha etu ihe si mee.
Akụkọ kwuru na Nwaokoroọbịa anwụrụ anwụ nwere nghọtaghe dị n'etiti otu nwaọgbọghọ ebe ha na-achọ ịdọrọ ego n'igwe ego ụlọakụ 'First Bank'.
Akụkọ kwukwara ịka nke na-eme, onye uweojii bịara were osisi kụọ nwokoroọbịa ahụ n'azụ isi ya, bụ nke butere ọnwụ ya.
EFCC egosila akaebe niile ha nwere n'ikpe nrụrụaka Okupe

Ebe foto si, Doyin Okupe/Facebook
Ụlọọrụ EFCC nọọrọ n'ụbọchị Wenezde abalị iri abụọ na isii gosi ụlọike ihe akaebe niile ha nwere megide Okupe bụbu onye ndụmọdụ onye bụbụ onyeisiala bụ Goodluck Jonathan.
EFCC kpọpụrụ Okupe n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja maka nrụrụaka ego dị nde narị naịra asaa na ọma abụọ n'ihu ọkaikpe Ijeoma Ojukwu.
Ọkaiwu Ibrahim kpọpụtara onye akaebe nke ikpeazụ ya bụ Shuaibu Salisu bụ onye akaebe nke isii n'ikpe Okupe.
Enugwu Police: A na-enyocha onye otu anyị e chere gburu nwaokoroọbịa
N'ofesi

Ebe foto si, Citizen TV
Ndị uweoji anwụchiela otu onye ụlọomeiwu na mba Kenya a kpọrọ Charles Kanyi maka ịkpọ oku ka ndị ojiegoachguego mba ọzọ nọ n'ala ha dịka ndị mba Tanzania, Uganda nakwa ndị China laa.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Super Eagles nke Naịjirịa awụọla ka awọ wufe n'agba nke iri na isii nke asọmpi Iko mba Afrịca.
Ha ji otu ọkpu goolu si n'aka Kenneth Omeruo merie ndị Guinea.
Nkeji
AFCON: Egypt agbarala Warda ụgbọnwamkpi

Ebe foto si, Getty Images
Otu n'ime ndị mba Ijipt jiri mere isi a hụrụ kwaba okpu n'egwu bọọlụ n'asọmpị AFCON na-aga n'ihu ugbua bụ Amr Warda abụrụla onye a chụrụ ọsọ nwamba na-achụ oke.
Otu na-achịkọta bọọlụ mba ahụ gụpụrụ Warda na ndị ga-eso gbaa bọọlụ maka "ịkpa agwa ekwesịghị."
Onyeisi otu na chịkọta bọọlụ 'Egyptian football federation' sịrị na achụpụrụ Amr Warda iji hụ na ekwere nrubeisi, uchu na itinye uche n'ihe a na-eme."
Onye ntakụkọ BBC Arabic bụ Mohamed Qoutb kwuru na a gbara n'anwụ nkata gara n'etitu Warda na ọtụtụ ụmụnwaanyị na soshal midia ka ijipt na Zimbabwe sọkọtachara mpi.
N' Ijipt ka e hiwere asompi iko Afrika (AFCON) a na-ele anya na ha nwere ike ibuli iko ahụ. Ha na mba DR Kongo ga-ezute n'abalị bụ Wenezde na Kairo.
Ọ bụ n'ọchịchị GEJ ka m nwetere ikike izu ngwa agha ndịa

Ebe foto si, AFP
Gọọmenti etiti ekwuola na aka chiburu Ogun steeti bụ Senator Ibikunle Amosun natara ikike n'aka gọọmenti etiti tupu ọ bubata egbe 'AK 47' ruru otu puku ma tinye kwa mgbọ egbe nke ruru Ijeria anọ .
Senator Amasun purata kwuo na ọ bụ n'ọchịchi Goodluck Jonathan ka ha nwetere ikike izuta ngwaagha ndia maka ichekwa Ogun Steeti.
Umahi: Aka na ụkwụ m adịghị na nkata ịbụ onyeisiala

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook
Gọvanọ Dave Umahi ekwuola na obi adighị ya mma dịka otu di icheiche na akawado ka emee yas Onyeisiala nke Naịjirịa.
Umahi kwuru na ucheobi ya bu ime ka Ebonyi steeti were dị mma na agba nke abuọ ya dịka aka na achi Ebonyi steeti.
O kwukwara na dịka ọ kwadoro ka onye igbo chia na 2023 kama na i ijikọta aha ya na ọchịchị 2023 eruhieru ma buru kwa ihe ihere nye ya.
Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ nakwa nke Benue ajụla atụmatụ inye ndị ọchiehi ogige ichi ehi

Ebe foto si, AFP
Gọọmenti etiti akọwala uru iwepụtara ndị ọchịehi nọ na steeti Naịjirịa dị icheiche ogige ebe ha ga na-achị ehi ga-aba n'ikwụsị nsogbu dị n'etiti ndị na-achị ehi nakwa ndị na-akụ ugbo.
Mana gọvanọ ise nke ọwụwa anyanwụ nakwa gọvanọ Benue, Taraba na ondo steeti jụrụ ya bụ atụmaatụ, na-ekwusi ike na ha agaghị ekewapụta ala ọbụla maka ndị ọchị ehi.
N'egwuregwu,
AFCON: Cameroun Vs Guniea Bissau

Ebe foto si, CAF
Otu 'Indomitable Lions' nke Cameroun ewerela ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Guniea Bissau na mmalite njem ha na asọmpi AFCON 2019.
Chetakwa na ndị otu Super Eagles ga ezute ndị otu nke Guinea taata na elekere 3:00pm.
N'ofesi,
'Yahya Jammeh nke Gambia wakporo m n'ike'

Ebe foto si, Fatou Jallow
Nwata nwanyị meriri na nchọputa nwanyị kachaa maa nma na Gambia apụtala kwuo na Yahya Jammeh achụpụrụ n'okwa dịka onyeisiala Gambia wakporo ya n'ike.
Nwaada a kwuru nkea dịka onye akaebe na ngalaba nchọputa na nyọcha ehibere iji lenye anya n'ebubo gbasatara Jammeh na iwakpo umunwanyị n'ike.
BBC gbaliri ga ha nụ ihe Mr Jammeh nwere ikwu maka ebubo a mana ọnu na-ekwuchitere otu ndọrọndorọ ọchichị Jammeh kwuru na ebubo ndi a nile bu ezigbote asi.
Nkeji










