Adani Community Clash: Etu e si gbuo mmadụ isii na mwakpo mere n'obodo a dị n'Enugwu Steetị

Ọgbatumtum a gbara ọkụ

Ebe foto si, Police

Kọmishọna uweojii n'Enugwu Steetị bụ Mohammed Aliyu na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ wuchiri n'obodo Adani ịchọpụta ihe butere ọgbaghara nke tara isi mmadụ isii n'ebe ahụ n'ụbọchị ụka.

Ọ sị na ọ bụ ndị ekperima a na-amaghị ndị ha bụ kpara arụ ọjọọ a nke tara isi mmadụ isii, merụọ mmadụ abụọ ahụ ma kpọọ ọtụtụ ngwongwo ọkụ.

Ụlọahịa a gbara ọkụ

Ebe foto si, Enugu Police

Aliyu rịọrọ ka udo chịa ma nye iwu ka e mee nyocha tara ọchịchị iji nwuchie ndị aka ha dị n'arụ a.

O kwere ndị obodo a nkwa na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-ejikọ aka ọnụ ịhụ na ụdị nsogbu a emeghi ọzọ.

Ụlọahịa a gbara ọkụ

Ebe foto si, Enugu Police

Ọ rịọrọ ka ha gbanarị nsogbu ọbụla ma hụụ onwe ha n'anya dịka ụmụnne.

Ọgbatumtum a gbara ọkụ

Ebe foto si, Enugu Police

Onyeisioche okpuruọchịchị Uzo-Uwani bụ Chukwudi Celestine Nnadozie kerele ndị uweojii maka mbọ ha gbaran'iweta udo n'ogbe ahụ.

Ndị ọrụ

Ebe foto si, Enugu Police

Onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS bụ Brown, Ekwoaba, nke Civil Defence bụ Valentine Afrika na nke ndị ọgwụike bụ Abdul Abdullahi so mee njem ahụ.

BBC Igbo ka na-agba mbọ inwete eze ọdịnala ndị Adani nakwa ndị hụrụ ka ihe ji mee.

Akụkọ ka na-abịa...