World Youth Skill Day: Etu m si malite imepụta ihe ọṅụṅụ zobo dị n'ime akpa 'tea' - Michael Onyezebe

Aha onyonyo, World youth skill day: Etu Michael jiri malite iji zobo mee tee

Iji mee emume icheta ụbọchị a kpọrọ "World Youth Skill Day", nke bụ ụbọchị Julaị 15 nke afọ ọbụla, BBC Igbo ga-ele Michael Ugochukwu Onyezebe anya.

Michael Ugochukwu Onyezebe bụ nwa ikoroọbịa na-eji zobo eme mmanya a na-aṅụ anụ.

Ihe pụrụ iche na nke ya bụ na ọ na-etinye ya n'akpa dịka 'tea' nke bekee na-akpọ 'tea bag'.

Michael Onyezebe
Nkọwa foto, Michael wekara ndị ntorobịa dịka ya n'ọrụ

Michael nwere ọzụzụ imepụta ọgwụ na mahadum, nke bekee na-akpọ 'pharmacist'.

Mana ọ gbanweela amamihe ahụ werezie ya na-emepụta ihe ọṅụṅụ bụ ọkaibe.

Gere akụkọ ya ebe a.

Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi.