South East Governors Meeting: Lee etu ọgbakọ ndị ọchịchị mpaghara ala Igbo si aga n'Enugwu taa

Dave Umahi, Ifeanyi Ugwuanyi, Hope Uzodinma

Ebe foto si, Enugu Government

N'agbanyeghị na ọ bụghị mbụ ha na-ekwu ya, otu jkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekpebiela imalite otu nche 'Ebube Agu' na steeti ha dị iche iche na mpaghara ahụ.

Ha kpebikwara na ụlọomeiwu nke steeti na mpaghara ahụ ga-etinye ya n'iwu tupu afọ 2021 agwụ.

Dave Umahi bụ onyeisi otu jikọrọ gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ bụ onye kwuputara nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ha mechara ọgbakọ nchekwa n'Enugwu ụbọchị taa bụ Tuzde.

Ndị gọvanọ bịara ọgbakọ ahụ gụnyere Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu steeti, Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti, ebe Gọvanọ Willie Obianọ abịaghị (nke ọ na-ezite osote ya) ma Gọvanọ Okezie Ikpeazu zitere osote ya, Ude Oko-Chukwu.

Lee ihe ndị ọzọ ha kpebiri:

2. "Ndị gọvanọ na ndị ndu Ọwụwa Anyanwụ katọrọ oke gbuogbuogbuo na-eme na mpaghara ahụ ma kwekọrịtana ha na ndị ọrụ nchekwa ga-ejikọ aka kwụsị ya."

3. "Ọgbakọ ahụ katọrọ nọrọ- n-ụlọ nke ndị na-akpọkarị ya bụ ndị be anyị nọ ofesi bụ ndị amaghị ka o si emetụta n'ahụ. Ọgbakọ ahụ kpebiri ime ihe ọbụla dị n'iwu iji hụ na e nweghịkwa nọrọ-n-ụlọ ọzọ."

4."Ọgbakọ ahụ natara ozi mkpesa nke otu Ohaneze Ndigbo detara ha maka ọnọdụ nchekwa nakwa mmegbu ndị Igbo ma kwee nkwa ilebanye ya anya iji mara okwu ha ga-eji jekwuo Gọọmenti Etiti maka imeda obi ndị ntororịa."

5. Ọgbakọ kpebiri inye ndị ọrụ chekwa nkwado iji nye aka weghachi udo n'Ọwụwa Anyanwụ."

6. "Ọgbakọ ahụ kpebiri ịkwado ntuliaka nAnambra steeti ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ịhụ na ọ gara n'udo n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba."

7. "Ọgbakọ ahụ kpokuru ndị ụkọchukwu na ndị ndu ụka , ndị eze ọdịnala ka ha ga n'ihu n'agwa ndị ntorobia okwu."

Lee etu ọgbakọ ndị ọchịchị mpaghara ala Igbo si gaa n'Enugwu

Nzụkọ imeụlọ ndị Gọvanọ na ndị ọchịchị ala Igbo

Ebe foto si, Enugu state Government

Ọgbakọ pụrụ iche nke ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ hibere n'obi gọọmentị dị n'Enugwu taa bụ Tuzde amalitela.

Ọ bụghị naanị ndị Gọvanọ ga-esonye n'ọgbakọ a, kama ndị ndu ndị ọzọ ga-esonyekwa na ya.

Ndị a gụnyere: ndị isi ụka, ndị eze ọdịnala, ndị omeiwu nọ n'ụlọ omeiwu etiti, na ndị ọzọ.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị ndu n'ala Igbo, nke gụnyere Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi, omeiwu Enyinnaya Abaribe, na omeiwu Ike Ekweremadu awuchiela na ya bụ ọgbakọ

Ndị ọzọ gụnyere, Victor Umeh, Nnia Nwodo, omeiwu Tobi Okechukwu, Bishọp Godfrey Onah na ndị ọzọ.

Gịnị ka a kpara n'ọgbakọ a?

Dave Umahi
Nkọwa foto, Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi

Ihe bụ isi a hụrụ kwaba okpu maka ọgbakọ a bụ ọnọdụ enweghị nchekwa na mpaghara dị icheiche n'ala Igbo.

Lee foto etu ya bụ ọgbakọ si gaa:

Hope Uzodinma
Nkọwa foto, Hope Uzodinma, aka na-achị Imo steeti
Ike Ekweremadu
Nkọwa foto, Ike Ekweremadu, sinetọ na-anọchite anya ndị Enugwu-Westị n'ụlọomeiwu ukwu Naịjiria
Victor Umeh
Nkọwa foto, Victor Umeh bụbu onyeisi otu pati All Progressives Grand Alliance (APGA)
Enyinnaya Abaribe
Nkọwa foto, Enyinnaya Abaribe, Sinetọ na-anọchite anya ndị Abịa Saụt n'ụlọomeiwu ukwu Naịjiria
Toby Okechukwu
Nkọwa foto, Omeiwu Toby Okechukwu, onye nnọchiteanya ndị Anịnri, Awgu na Oji Riva n'ụlọomeiwu nta Naịjiria
Godfrey Onah
Nkọwa foto, Godfrey Onah bụ Bishọp nke Katọlik Dayọsis Nsukka, Enugwu steeti
Nnia Nwodo
Nkọwa foto, Nnia Nwodo, onye bụbu onyeisi Ohaneze Ndigbo