Southern governors meeting: Ekwenyeghị m na mkpebi ndị Gọvanọ Ndịda Naịjirịa gbasara ụtụisi VAT - Dave Umahi

Dave Umahi

Ebe foto si, Dave Umahi

Nkọwa foto, Dave Umahi

Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steeti efeela n'isi sị mba, na ọ gaghị ekwenye na mkpebi ndị Gọvanọ Ndịda Naịjirịa kwekọrịtara n'ọgbakọ ha n'Enugwu n'ụbọchị Tọzde.

Otu n'ime mkpebi ahụ bụ na ha kwadoro mkpebi ụlọikpe na ọ bụ steeti kwesịrị ịnakọ VAT mana Umahi kwuru na o kweghị.

Cheta na Umahi n'onwe ya agaghị ọgbakọ ahụ, kama o zigara osote ya bụ Eric Igwe.

Aha onyonyo, IPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ Channels, Umahi kwuru na ọ ghọtara ihe gbasara VAT karịa ndị gọvanọ ndị ọzọ.

O kwuru sị: "Anyị nwere mkpebi na steeti anyị gbasara okwu ụtụisi VAT."

"N'ọgbakọ ahụ, Osote m kọwakwaara ha ihe bụ mkpebi anyị."

"Mana ị ma na n'ọgbakọ ọbụla ndị ọnụọgụgụ ha karịrị ga-emeri ndị ọnụọgụgụ ha dị nta."

"Kama o ruzie oge itinye ya n'ọrụ, a ga m egosi ha ebe m kwụ."

"Ebe m kwụ bụ ebe ga-akara steeti mụ mma."

Aha onyonyo, Onweghị onye na-achọ ọrụ Peter Obi - Dave Umahi

Oge a jụrụ Umahi ebe ọ kwụ n'okwu ahụ o kwuru sị: "Ebe m kwụ bụ ka ihe dịbu mbụ dịrị na-aga."

Ihe dịbu mbụ bụ na ọ bụ gọọmentị etiti na-anakọ ụtụisi VAT site n'aka ụlọọrụ 'Federal Inland Revenue Service' FIRS.

Ọ bụkwanụ nke a ka ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa na-agbagha.

Umahi kọwara na ọ bụrụ na a hapụ ka steeti na-anakọ ụtụisi VAT, steeti dịka Ebonyi ga-ata nnukwu ahụhụ n'ihi na ha abaghị ọgaranya ka steeti ndị ọzọ.

Gọvanọ Obiano akọwaala ihe mere ọ gaghị ọgbakọ ndị Gọvanọ Ndịda Naịjirịa

Willie Obiano

Ebe foto si, Willie Obiano/Facebook

Gọvanọ Willie Obiano akọwaala na ọ kpachaghị anya hapụ ịga ọgbakọ ndị Gọvanọ Ndịda Naịjirịa nwere n'Enugwu n'ụbọchị Tọzde.

Onyeisi mgbasaozi ya bụ James Eze gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbagharị gbasara ntuliaka na-abịanụ kpatara o jiri ghaa ya bụ ọgbakọ

Nkọwa a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ihe mere Gọvanọ Obiano agaghị ọgbakọ ahụ, n'agbanyeghị na ọ bụ n'ala Igbo ka e nwere ya.

James Eze kwuru sị: "Anambra na-akwado ime ntuliaka ugbua, anyị ncha niile nọ n'ịchụ nta vootu."

"N'ime ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa niile, naanị Gọvanọ Anambra steeti bụ onye na-abanye n'oge ntuliaka."

"Ị ma na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra na-ebu nke steeti ndị ọzọ ụzọ abịa."

"Ntuliaka a ga-abụ na Nọvemba 6. Naanị otu ọnwa ka ọ fọrọ ka o ruo."

"Ọ bụ maka nke a ka m chere mere o jighi gaa ya bụ ọgbakọ."

Aha onyonyo, Ban on open grazing: 'Anyị ka na-ahụ ndị ọchị ehi na-agbanyeghi mmachi e tinyere'

Mana Eze kwukwara na Obiano agaghị ọgbakọ ahụ apụtaghị na ọ kwadoghị ihe niile e kwekọrịtara na ya bụ ọgbakọ.

Gịnị kpatakwaranụ na osote gọvanọ agaghị ọgbakọ ahụ? James Eze sị na ọ gaghị akọwanwu maka nke ahụ.

Ụfọdụ ndị Gọvanọ Ndịda Naịjirịa

Ihe ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru maka ya

Onwuasoanya F.C.C Jones, bụ osote onyeisi Ohaneze Ndigbo Youth Council kwuru na ya bụ ihe jọgburu onwe ya., mana ọ dị mkpa ka a nụ n'ọnụ Gọvanọ ihe mere ọ bịaghị.

FCC Jones gara n'ihu kwuo na onye gbara nkịtị kwere ekwe, nke pụtara na Obiano kwenyere na mkpebi niile e kpebiri n'ọgbakọ ahụ.

O kwukwara na ndị Ohaneze kwenyere na mkpebi ndị gọvanọ n'okwu gbasara ụtụisi VAT.

N'aka nke ya, onyeisi ndị Ala Igbo Development Foundation bụ Uzodimma Nwali, ji olu iwe kwuo na ihe ndị gọvanọ ala Igbo mere bụ ịgbahapụ ndị Igbo.

Nwali sị na ọ bụrụ na ndị e nyere ọchịchị n'aka enweghi ike ichekwa ndị e nyere ha n'aka, ihe ọ pụtara bụ onye ọbụla chewezie onwe ya.

Ọ sị na okwu gbasara nchekwa n'ala Igbo bụ okwu kacha mkpa ugbua.

Uzodimma Nwali

Ebe foto si, Uzodimma Nwali

Nkọwa foto, Okammuta Uzodimma Nwali sị na ọbụrụ na ndị Gọvanọ arụghị ọrụ ha kwesiri ịrụ, mara na ha abaghịrị ndị Igbo uru

"Onye gọvanọ ọbụla na-achọghị ikwu maka ya bụ onye iro ndị ọ na-achị. Ọ bụzị ndị Igbo ka ọ dịịrị ịma ihe ha ga-eme. Onye a jụrụ anaghị ajụ onwe ya," ka Nwali kwuru.

"Ọ bụrụ na Gọvanọ Ndịda niile bịara ọ bụrụ nke ndị ala Igbo bụ ihe abịaghị, ya bụ okwu atọghị ọchị cha cha".

Ọ sị na ọ bụzị ndị Igbo na ndị gọvanọ ha ka ọ dịịrị.

Nnedi Ogaziechi

Ebe foto si, Nnedi Ogaziechi

Nkọwa foto, Nnedi Ogaziechi sị na ihe a malitere ịmetu ya n'ahụ mgbe ya gụtara ụbọchị Wenezde na Gọvanọ Umahi sị na ọnọdụ onye apụla ezi Ipob hiwere anaghị emetu ndị Igbo n'ahụ.

Nnedi Ogaziechi bụ ada Igbo ọnụ na-eru n'okwu kwuru na "obodo ọbụla na-enweta ndị ọchịchị ha kwesịrị inweta. Ọ bụzị ndị Igbo ka ọ dịịrị ịhapụ maọbụ wepụ ndị ọchịchi anaghị eme uche ha."

Ọkammụta Obasi Igwe gbarụrụ ihu ma tie mkpu n'olu ike sị "Onweghịzị ebe anyị ga-agbaga. Anyị na-arịọ ndị niile ọnụ na-eru n'okwu ka ha tinye ọnụ n'okwu a."

O tiri si, "kedụ ihe nwoke na-atụrụ nwoke ibe ya ụjọ? A na-ekwu nke mere, a na-eme ọzọ. Kedụ ka mmadụ ga-esi chọta gị na be gị, ị gbaa ọsọ? Ihe niile a na-akọ n'ebe ahụ metụtara gị karịa ka ọ metụtara ndị ọzọ".

Igwe sị na nke a na-egosi na ihe ha kwuru mgbe Onyeisiala Muhammadu Buhari gara Owere bụ ihe ga-emegide mmadụ niile.

"Nke a bụ ihe na-agba anyammiri. Kedụ be anyị ga-agbagazị?"

Ọ sị na nke a na-egosi na nke ga-eme n'ihu ga-aka njọ karịa nke mere.

Ọ sị na nke a bụ mbido ndị Igbo ịnọ n'ohu.

Obasi Igwe

Ebe foto si, Obasi Igwe

Nkọwa foto, Ọkammụnta Obasi Igwe sị na ihe a mere bụ ihe ntị ekwesighị ịnụ

Ndị gọvanọ Ndịda Naịjiria gbakọtara n'Enugwu steeti ma mee mkpebi gbasara etu ha ga-esi gaa n'ihu gbasara ọtụtụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua.

Ha rụtụrụ aka n'ihe dị iche iche gụnyere ịchị ehi agagharị, nchekwa, ụtụ isi, ọchịchị wdgz.

Mkpebi ndị Gọvanọ mere n'uju:

  • Ọchịchị: Ha kpebiri na ha ka kwụ n'okwu ha na onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023 ga-esiriri na mpaghara Ndịda Naịjiria; dịka o kwesịrị ịdị n'iwu
  • Ụtụ isi: Ha kpebiri na ha na-akwado na ikike ịnata ụgwọ Value-Added Tax (Vat) dị n'aka gọọmentị steeti
  • Ịchịgharị ehi: Ha kwuputere mmasị ha maka etu steeti ndị dị na Ndịda si ahụ na iwu mmachi nchịgharị ehi dabara na nkwekọrịta ndị gọvanọ Ndịda tinyere, ma sị ka steeti ndị na-emezubeghi iwu a gbaa mbọ hụ na ha mere ya
  • Nchekwa: Ha kwadoro na ndị nchekwa e kewapụtara maka nlekọta mpaghara Ndịda ga na-ezute ma na-etikọta isi ọnụ ịhụ na e chekwara mpaghara a ọfụma
  • Mmanụ Agbịdị: Ha kwuputere mmasị ha gbasara etu ihe gbasara Petroleum Industry Act (PIA) nakwa onwunwe Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) si aga
  • 'Fiscal Federalism': Ha kwuru na ha ka kwesịkwara ike na steeti ọbụla ga na-ejide ego ha na-akpata na be ha, ma na-enyetụ gọọmentị etiti. Na ha ga-eji ọnọdụ ha hụ na ndị nnọchiteanya ha na steeti nakwa etiti ji ohere mmegharị iwu Naịjiria mee ka ọ banye n'iwu.

Ha yinyere nzukọ ha ọzọ n'ọnwa Nọvemba 2021, na Rivas steeti.

Umahi, Ikpeazu, Uzodinma zigara ndị osote ha, ebe Obiano agaghị

Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu; nke Ebonyi bụ Dave Umahi; na nke Imo bụ Hope Uzodinma zigara ndị osote ha, mana Gọvanọ Anambra abịaghị, o zigaghịkwa osote ya.

Nke a bụ dịka Gọvanọ steeti iri na asaa dị na mpaghara Ndịda Naịjirịa nwere ọgbakọ pụrụ iche n'obi gọọmentị Enugwu steeti taa bụ ụbọchị 16 nke ọnwa Sepụtemba.

Ọgbakọ a na-abịa iji tulee ọtụtụ ihe na-eme na mpaghara Ndịda Naịjirịa n'ọdị nso a.

BBC Igbo kwụ chịm n'obi gọọmentị Enugwu iji wetara gị etu ọgbakọ a si aga.

Ụfọdụ ndị Gọvanọ Ndịda Naịjirịa

Lee ihe ndị a na-atụ anya na ndị Gọvanọ ahụ ga-atule n'ọgbakọ nke taa:

  • Ihe gbasara ụtụisi VAT na ndị nwere ikike ịnakọ ha; ọ bụ gọọmentị steeti ka ọ bụ gọọmentị etiti
  • Ihe gbasara mmachi ịchịgharị ehi nke ha kwekọrịtara na ha ga-amachi malite n'abalị mbụ nke Sepụtemba.
  • Okwu gbasara enweghị nchekwa
  • Okwu gbasara ndị na-achọ nnwere onwe - ndị IPOB na ndị "Yoruba Nation"
Rotimi Akeredolu

Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti, nakwa Rotimi Akeredolu nke Ondo, awụchielarị na ya bụ ọgbakọ.

Chetakwa na ọ bụ Akeredolu bụ onyeisi otu jikọrọ ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa.

Gọvanọ ndị ọzọ nọkwa n'ọgbakọ ahụ bụ Nyesom Wike nke Rivers Steeti, Ifeanyi Okowa nke Delta, gboyega Oyetola nke Osun, na Douye Diri nke Bayelsa Steeti.

Ọtụtụ ndị gọvanọ zitere ndị osote ha

Osote Gọvanọ Ebonyi Steeti
Nkọwa foto, Eric Kelechi Igwe Osote Gọvanọ Ebonyi Steeti

Ọtụtụ gọvanọ zitere ndị osote ha ka ha nọchie anya ha na ya bụ ọgbakọ.

Ha gụnyere: Bisi Egbeyemi, bụ osote gọvanọ Ekiti State, na Rauf Olaniyan bụ osote gọvanọ Oyo steeti.

Osote gọvanọ Ebonyi steeti bụ Eric Igwe, nakwa nke Akwa Ibom bụ Moses Ekpo.

Ndị ọzọkwa bụ Osote Gọvanọ Edo steeti bụ Phillip Shuaibu, na nke Abia steeti bụ Ude Oko Chukwu.

Imo Steeti zitekwara osote ya bụ Placid Njoku.

Lee ụfọdụ photo si n'ogige ọgbakọ ahụ

Ndí egwu
Nkọwa foto, Ndị egwu atịlọgwụ bịara ịnabata ndị gọvanọ si steeti dị icheiche abịa Enugwu steeti.
Ndị egwu atịlọgwụ
Nkọwa foto, Ndị egwu atịlọgwụ bịara ịnabata ndị gọvanọ si steeti dị icheiche abịa Enugwu steeti.
Oyetola
Nkọwa foto, Gọvanọ Osun Steeti, Gboyega Oyetola

Akụkọ na-abịa.