Obiano's six years in office: Nke ọma na nke ọjọo Obianọ n'afo isii ọ chịri Anambra steeti

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Ndị Anambara tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọchịchị Gọvanọ Willie Obiano dịka ọ chialaraafọ isii na steeti ahụ.
Ụfọdụ kwuru na ọ gbara mbọ ma rụpụta ihe a hụrụ anya dịka n'ọrụ nchekwa obodo, ịkwụ ụgwọọnwa, iwulite okporoụzọ, itinye ọkụ n'ọkporoụzọ na ihe ọwụwụ ndị ọzọ.
Mana ụfọdụ na-atụ aka ebe ndị ọ gbara ọnyụpa ọkachasị na iwulite ndị mmadụ nke Bekee kpọrọ human capịtal development' .
Damian Okeke-Ogene bụ onyeisioche Ohaneze ndị Igbo nke Anambra kwuru na Obiano gbalịrị.
O kwuru na "Obiano ji azịza zaa Upper Iweka dị n'Onicha, ma mee ka ndị ekperima niile nọ ebe ahụ gbafuchaa."
Ọ gakwara n'ihu kwuo sị "na Obiano na-agbalị n'ihu na udo chiri n'Anambra steeti", na-agbanyeghị na ọnọdụ nchekwa jọrọ njọ na Naịjirịa niile.

Ebe foto si, Damian Okeke Ogene
Onye ọzọkwa kwuru okwu bụ Don Onyenji, onye ọrụ mgbasa ozi.
Onyenji jakwara Obianọ ike ma kwuo na ọ rụrụ ọrụ ka dimkpa.
Ma Onyenji ma Okeke-Ogene nkwado Obiano nyere Coscharis wee maa atụ.
Coscharis rụrụ ụlọọrụ na-emepụta osikapa n'Anambra steeti nke bụ ọkaibe na Naịjirịa niile

Onyenji nyere Obiano pasent asatọ n'ime iri maka ịrụsị ọrụ ike.
O kwuru na Obiano tinyechara ọkụ n'okoroụzọ niile nke mere na egwu adịghịzị maka ịgagharị n'abalị.
Banyere ajọ ụzọ dị n'Ọgbarụ, Onyenji sị na gọọmenti etinyebeghị aka n'ebe ahụ maka oke ego ya bụ ụzọ ga-eri.

Ebe foto si, Don Onyenji
Ọ sịkwa na ọ bụghị naanị ya, na ihe mbuze na-eme n'Anambra steeti ka nkụ nke bụ na gọomenti steeti ahụ agaghị emenwu ihe dị na ya.
Onyenji kọwara na gọọmenti Anambara ahụ akwụnyela ụgwọ nke ha maka ikpochi mbuze ndị ahụ, ma na-echezị ka 'World Bank' mezuo ya.
Ndị ọrụ oyibo na ndị nkuzi na-enwe obi ụtọ maka ọchịchị Obiano n'ihi na anaghị ejizi ha ụgwọ ọnwa, dịka Onyenji si kwuo.

Mana onye pati APC bụ Emeka Ibe sị na afọ isii Obianọ bụ afọ lara ndị Anambra n'iyi.
Emeka sị na "ọnweghị otu ihe ejidere aka Obiano rụpụtara n'Anambra steeti na-agbanyeghị ego niile gọọmenti etiti ma nke Peter Obi hapụụrụ ya".
O kwuru na "a sị na ọ bụ naanị ụzọ Aguleri ka ọ na-arụ, mana gọọmentị bụ nke ndị Anambra, ọbụghị nke ndị Aguleri".
Emeka kwere nkwa na ya ga-ezitere anyị ọmụmaatụ ego ọ sị na a hapụụrụ Obiano nke o jighi rụ ọrụ.

Ebe foto si, AFP
Onye ọzo anyị gbara ajụjụ ọnụ na-achọghị ịkpọ ha ya kwukwara na n'ezie na Gọvanọ Obianọ rụkwara ọrụ karịa ibe ya mana ụtụisi a na-ana ndị mmadụ ugbua karịri akarị.
Ọ sị na ha na-anacha ndị ahịa mkpọsa ihe ruru narị naịra asatọ n'ụbọchị.
O kwuru na-agwa ndị na-anata ya bụ ụtụisi na-akpasa ndị ahịa bụ nke ka njọ.
Lee ihe ndị ọzọ adịghị atọ ndị Anambara ọchị n'ọchịchị Obiano:
- Nnubata ndị agboro na ndị ọchọnganoko n'Anambara
- N'agụmakwọkwọ, ọchịchị na-akpụ afọ n'ala n'otu akụkụ.
- Nkwalite ndị ntorobia na-akpụ afọ n'ala. Anambara steeti enweghị nkwado pụrụ iche a na- eyere ndị na-eto eto.
- Oke ịna ụtụ isi. Ndị na-azụ ahịa na ndị ojiegoachụego na-ekwu na ụtụisi akarịala.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4
Obiano malitere ọchịchị oge Peter Obi rituru n'ọkwa dịka gọvanọ.
Tupu oge ahụ, ọ bụ onye ọrụ ụlọakụ welitere isi.
Ọ rụkwara ọrụ n'ụlọọrụ mmanụ agbidi dị icheiche dịka Chevron.
N'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2014 ka e duru Obiano n'iyi ọrụ dịka gọvanọ Anambra.