Coronavirus Outbreak: A ga-agbachi okeala na ụgbọelu ifebata na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọ nnọchịteanya akpọkuola gọọmenti etiti ka machie mfebata ụgbọelu ndị si mba UK, Spen, Ịtalị na mba ndị ọzọ ebe ọrịa coronavirus na-akpa ike ọjọọ.
N'otu aka ahụ ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ji akara a kpọrọ #NigeriaNeedsATravelBan na twitter na-ekwu ka gọọmentị mee nke a.
@DrOlufunmilayo sị ka Naịjirịa mee ka ndị ogbo ha Gana;
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@BhadmusAkeem sị na ọ bụ arịrịọ ka ọ na-arịọ onyeisiala Buhari ka o machie nke a;
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na mba Afrịka ndị dịka Ghana, Kameruun, Saụt Afrịka adịla mbụ mmechie ụgbọelu si mba ofesi ụfọdụ ifebata na mba ha.
Ebe ọtụtụ n'ime ha emechiela ụlọakwụkwọ ha dị iche iche mana onwebeghi nke Naịjirịa mere n'agbanyeghi na mmadụ atọ ebutela coronavirus na Naịjirịa.
Ndị dọkịta n'Abuja amalitela abụbụọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị dọkịta n'Abuja amalitela abụbụọrụ maka akwụghị ha ụgwọ ruru ha n'agbanyeghi ọrịa coronavirus chere Naịjirịa n'ihu ugbua.
Onyeisi ha bụ Roland Osaigbovo sị na akwụbeghi ndị otu ha ụgwọ nakwa na ha enweghi nchekwa n'ụlọọrụ ha.
Ebe otu onye dọkịta n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ bụrụ na gọọmentị emeghi ihe ha chọrọ na ha ga-eso ibe ha malite abụbụọrụ nke ha.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
Otu Uefa agbatịala oge asọmpi Euro 2020 site n'ọnwa Juun afọ a gawa n'ọnwa Juun nke afọ 2021 n'ihi ọrịa coronavirus.
N'aka nke ọzọ onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Malaga ndị obere bụ Francisco Garcia nwụrụdịka a chọpụtachara na o bu coronavirus.
Nkeji
Ihe nkiri
Onye nke atọ ebutela coronavirus na Naịjirịa

Ebe foto si, NCDC TWITTER
Naịjirịa ewetela onye ọzọ bu nje coronavirus dika ngalaba na-ahụ maka ahụike na Legọs siri dee na akara Twitter ha.
Na nkọwa ha, onye bu nje a bụ nwaada dị afọ 30 sị mba Briten bata Naịjirịa n'ụbọchị 13 nke ọnwa Maachi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Dịka ha siri dee, nwata nwaanyị nọ na be ya kemgbe ọ lọtara. ọ bụ ka ọ chọpụtara na ahụ adịghị ya ka e mere ya nyocha chọpụta na o nwere ya bụ nje.
Kọmịsọna na-ahụ maka ahụike na Legọs bụ Akin Abayomi sịkwa ka onye ọbụla ji ụgbọelu British Airways febata tinye onwe ha na ihe Bekee kpọrọ "quarantine" ruo abalị iri na anọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4

A malitela ịnwa ọgwụ mgbochi Coronavirus na mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
A malitela ịnwa ọgwụ emepụtara maka coronavirus n'ahụ ndị mmadụ wepụtara maka nke a na mba Amerịka.
Otu nwaanyị aha ya bụ Jennifer so n'ime ndị a kwuru na ọ bụ ohere iji nye aka nke ya.
Ọnụọgụgụ ndị wepụtara onwe ha maka ọnwụnwa eruola mmadụ anọ.
Mana ọ ga-eru ọnwa ole na ole tupu a mara ma ọgwụ a na-arụ ọrụ.

Udo ga-achị na APC - Oshiomhole

Ebe foto si, Google
Adams Oshiomhole ekwuola na ọ ga-agba mbọ ịhụ na udo chịrị n'otu APC.
O kwuru nke a dịka ụlọikpe mpesa kagburu nchuda nwamgbenata ụlọikpe ukwu n'Abuja nyere ya.
Oshiomhole si na mkpebi ahụ enyela ya ohere ịmalitekwa ọrụ ebe ọ kwụsịrị.

N'Afrịka,
Ndị agha mba Niger egbuola ihe ruru ndị Boko Haram iri ise n'abalị ụbọchị ụka.
Otu onye agha Niger nwụrụ n'ọgụ ahu ebe a nwụchiri ọtụtụ ndị Boko Haram ndị ọzọ dịka Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nke mba ahụ si kwuo

N'Egwuregwu,

Ebe foto si, @BorisJohnsonTwitter
Egwuregwu di iche iche akwụsịla na mba Briten dịka Praịm Minista Boris Johnson sị ka akwụsị ịpụta n'ọgbakọ ọha n'ịhị ọrịa Coronavirus.
Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị na agaghịzị enye ọgbakọ ọbụla nwere ọtụtụ mmadụ ndị ọrụ gbatagbata ga-enye ha aka.

Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a













