Covid-19: Nwaafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ ebutela Coronavirus

Ebe foto si, Twitter
Otu nwaafọ Naijirịa aha ya bụ King Paul Akpan Udoh ebutela ọrịa CoronaVirus.
Udoh na-agbara ndị otu Pianese na 'Serie C' ndị mba Itali.
Dịka ọ dị ụgbụa, ewepụla ya si n'ebe ọha nọ pụọ nke bekee na-akpọ "Quarantine".
Akụkọ na-ekwu na enwere mgbe ndị otu Juventus Chọburu ịgote ya mana ọnweghị isi.
Ndị egwuregwu bọọlụ na-atụ ụjọ na enwere ike ị sị ha sọo asọmpị n'ebe ha nwereike ibute oria a.
Mana ka ọ dị ụgbụa, eyiharịala ụfọdụ asọmpị nke dịka AFC Champions league maka ọrịa Coronavirus.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị ụka Katọlik na Legọs bụ Adewale Martins amachiela inyerịta ekele nke udo n'oge mass.
Nke a bụ otu ụzọ iji kee nkwụcha ma belata mgbasa ọrịa coronavirus.
Bishọp Adewale Martins kwupụtara nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ na mgbede Fraịde.
Chetakwa na a kwụsịkwara inye ekele nke udo oge ọrịa Ebola malitere n'afọ 2014.
Oge ekele nke udo bụ oge ndị mmadụ ji ekelekọrịta ibe ha n'oge a na-aka ụka.
A na-eme ya iji gosi ihụnanya na ịdịkọn'otu n'etiti ndị otu Kristi.

Bishọp Martins kwukwara na ọgbakọ ngagharị nke obe (stations of the cross) bụ nke ndị Katọlik na-eme ụbọchị abụọ n'izuụka ọbụla, ga-abụzị sọ otu ụbọchị.
A na-emekarị ngagharị nke obe kwa Wenezde na Fraide ọbụla n'oge lent, ugbua, ọ ga-abụzị sọ n'ụbọchị Fraide.
Arsenal alaala

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Arsenal ebejuola efere n'akwa dịka ndị Olympiakos ji nke a kpọrọ 'away goal rule' gbapụ ha n'asọmpi Europa League n'abalị.
N'agbanyeghi otu goolu o nyere na nkeji 113, Pierre-Emerick Aubameyang bụ onyendu ha riwara agba dịka nkeji e ji egbuchi bọọlụ ruru, nke kpọnyere ntu n'akpati e ji bupu ha na ya bụ asọmpi.
Ndị Olympiakos na onwe ha si n'aka Pape Abou Cisse na Youssef El Arabi nye goolu abụọ so mee ka mmeri ha zuo oke.
Cheta na Arsenal jibu naanị otu goolu merie ha n'ụlọ ha mgbe ha zuteburu.
Ka ọ dị ugbua, olileanya Arsenal nweburu isi ụzọ a mara ma ha a ga-enweta ohere ịbanye na Champions League nke afọ 2020/21, enweghizi isi.
Chetakwa na ha ruru n'agba ngwụcha n'asọmpi a n'afọ gara aga, mana Chelsea sepụrụ ha ara n'ọnụ iji bulie iko a.
N'otu aka ahụ, Odion Ighalo bụ nwaafọ Naịjirịa nyere goolu mbụ ya dịka onye Man United, ka ha ji ọkpụ goolu ise asaghị asa sụjuo Club Brugges afọ.
Coronavirus nọ na Naịjiria
Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjiria agwala ọha okwu, ebe ọ na-asị ndị mmadụ dere jụụ n'ihe gbasara mbata ọrịa coronavirus na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọ gara n'ihu sị na ha ekeela nkwụcha n'ihe gbasara ibuso ọrịa a agha, mana gwa ndị mmadụ ka ha na-edebe onwe ha na gburugburu ha ọcha.
Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: Gọọmenti Nigeria ekwuola okwu maka Coronavirus
Ihe onyeisiala Saụt Afrịka na-eme maka Coronavirus

Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka enyela iwu ka a kpọlata ihe ruru mmadụ otu narị na iri atọ bụ ndị mba ha bi n'obodo Wuhan dị na Chaịna bụ ebe ọrịa coronavirus a na-enye ụwa nsogbu malitere.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ bụ ndị mba Saụt Afrịka na-arụ n'elu ụgbọmmiri e jidere mmaka nnyocha ọrịa a na mba Japan, eburula ya bụ ọrịa.
Etu coronavirus si metụta ahịa mbaụwa

Ụlọahịa ndị achụmntaego nke a kpọrọ stock market na Bekee na ha akpụ afọ n'ala na mpaghara mbaụwa gụnyere Ọstrelia, Briten, Jamini, Frans nakwa mba Amerịka.
Ọ kacha mpaghara Eshia dịka Japan, India, Hong Kong, Shanghai dị na Chaịna nakwa Seoul dị na mba Saụt Koriya.

N'egwuregwu,
A ga-ama ma nwaafọ Naịjirịa bụ Wilfred Ndidi ọ ga-eso ndị Leicester City gbaa bọọlụ taa dịka ha ga-ezute ndị Norwich taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na a wara ya ikpere ka ọ merụchara ahụ.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji










