Southern Governors Meeting: Ọchịchị 2023 na ihe ndị ọzọ ha kpara na nzụkọ ha

Ebe foto si, Ohaneze,LstGov/Facebook
Ohaneze ndigbo ekwụsịela ike na ọchịchị onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023 ruru ndị ọwụwa anyanwụ
Okwu a soro mkpebi emere na nzukọ ndị Gọvanọ ndịda Naijiria mere na Mọnde, kwụọ na ha chọrọ ka ọkwa onyeisiala Naijiria n'afo 2023 ruo ndị ndida.
Isonyere okwu a Ohaneze Ndigbo kwuru, otu na-akwadọ ndị mba odida anyanwu Naijiria bụ Afenifere na otu na-akwado ihe gbasara ndị ndida bụ Pan Niger Delta Forum (PANDEF) etinyekwala ọnụ ikwado mkpebi a ndị gọvanọ ndida niile mere ụnyaahụ bụ Mọnde n'okwu ebe aka ga-achi Naijiria n'afo 2023 ga-esi.
Onụ na-ekwuru Ohanaeze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia kwuru taa bụ Tụzde na ya bụ ọkwa onyeisiala kacha ruo ndị ọwụwa anyanwụ. N'okwu ya, o sị na ime nke a ga-egosi aka ịkwụ ọtọ na ịkpe ikpe ziri ezi n'ebe ndị Igbo nọ na Naijaria.
Chetekwa na ndị Gọvanọ niile nọ na Steetị ndida Naijiria nwere nzukọ na Legọs n'ụbọchị Mọnde. Nke a bụ nzukọ nke abụọ, nke sotere nke mbụ ha mere n'ọnwa Mee.

Ebe foto si, BBC
Site n'aka Rotimi Akeredolu nke bụ Gọvanọ Ondo Steetị, bụrụ kwa onye ha nyere isi ọche ya bụ nzukọ, ha zịpụtere ọzị mputara ya bụ nzukọ.
Ihe ọzọ ha depụtara gbasara mmachi nchịgharị ehi na mpagahara Ndịda Naịjirịa bụ nke ha kpabụrụ na nzụkọ mbụ dị etu a ha nwere na Delta steeti n'ọnwa ole na ole gara aga.
Ngwa gụọ ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ha kwukwara ebe a:
•Mmachị ịchịgharị ehi na ndịda Naijirịa ga-ebido n'ụbọchị mbụ ọnwa Sepụtemba
•Onyeisiala Naijirịa n' afọ 2023 kwesịrị isite na ndịda anyanwụ
•Ihiwe ndị uweojii nke Steetị dị oke mkpa
•Tupu ndị ọrụ nchekwa arụọ ọrụ na steet dị na ndịda anyanwụ, ha ga-ezigara onyeisi nchekwa ha na steeti ahụ ozi
•Ha akwadoghị mwepụ ewepụrụ iji teknụzụ chịkọtaa mpụtara ntụliaka nke afọ 2023
•Legọs ga-abụzị ọgbọ nzụkọ ha gawa n'ihu.








