Fayemi esorola Umahi, Okowa na Ikpeazu bụ gọvanọ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa

Ebe foto si, Kayode Fayemi/Facebook
Ugbua ka Gọvanọ Kayode Fayemi nke Ekiti steeti kwupụtara na ọ buterela coronavirus.
O kwuputara nke a n'akara Twitter ya ma kwuo na ọ bụ nnyocha ya nke atọ gosipụtara nke a.
O nyefere ọchịchi n'aka osote ya ma kwuo na ọ ga-esi n'ụlọ na-arụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa.
Lee ihe o dere ebe a:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Gọvanọ ndị ọzọ buterela coronavirus na Naịjirịa

Kamgbe ọrịa batara na Naịjirịa, ọ taala isi ọtụtụ ndị ọnụ ha na-eru n'okwu na gọọmentị.
Ha gụnyere Abba Kyari, onye bụbu onyeisi ndịọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari, nakwa Abiola Ajimobi, bụbu gọvanọ Oyo steeti.
Ugbua, ọtụtụ ndị gvanọ steeti dị icheiche ebutela ya bụ ọrịa, ụfọdụ n'ime ha agbakeela ebe ndị ọzọ ka nwere nje ahụ.
Otu n'ime ha bụ Dave Umahi, Gọvanọ Ebonyi steeti, onye kwupụtara na ya butere ya bụ ọrịa n'ụbọchị anọ nke ọnwa Julaị.

Ebe foto si, Ebonyi State Govt.
Mana Umahi kwuru na onweghị ihe ọbụla na-egosi n'ahụ ya na ya nwere ya bụ nje, "kama m ga-anọpụ iche ganye na m agbakechaa nke ọma."
Lee gọvanọ ndị ọzọ buterela ya bụ ọrịa:

Ebe foto si, @GovIfeanyiOkowa
Nụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị ka Gọvanọ Okowa jiri akara Twitter kwupụta na nwa ya nwaanyị, ya na nwunye ya ebuterela ọrịa coronavirus.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
O sorola Gọvanọ Akeredolu bụ onye kwupụtara nke ya n'ụbọchị Juun 30, 2020.
Gọvanọ Ondo steeti, Rotimi Akeredolu
Na Juun 30 ka Gọvanọ Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti kwupụtara ndị buterela ọrịa coronavirus.

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/FACEBOOK
Mana ọ bụghị sọọsọ Gọvanọ ndị Ondo na Delta steeti buterela coronavirus, Gọvanọ ndị ọzọ buterela coronavirus na Naịjirịa bụ:
Gọvanọ Abia steeti, Okezie Ikpeazu
Gọvanọ Ikpeazu sị na o buru ụzọ mee nnyocha gosiri na o bughị ya bụ ọrịa n'ụbọchị Satọde, May 30, ma meekwa na Tọọsde June 4, nke gosiri na o butela ya bụ ọrịa.
N'oge ahụ, ọnụ na-ekwupụtara ya Ikpeazu bụ Onyenyebuchi Ememanka kwuru na ọ na-anata ọgwụgwọ ma na-emekwa ọfụma.
Mana n'ụbọchị atọ nke ọnwa Julaị ka Ememanka na Ikpeazu agbakeela nke ọma.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Gọvanọ Bauchi steeti, Bala Mohammed

Ebe foto si, Twitter/Bala A. Mohammed
Gọvanọ Bala Mohammed nke Bauchi steeti nke nnyocha ya gosiri na o butela ọrịa coronavirus na Maachị 2020.
Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Muktar Gidado kwuru n'akwụkwọ o zipuru ndị ntaakụkọ na o mechara nnyocha isii ndị NCDC nke gosiri na Gọvanọ Mohammed ebutela ya bụ ọrịa.

Ebe foto si, Bauchi
N'Epreelu 9, Gọvanọ Bala Mohammed depụtara n'akara twitter ya na o sitela ọrịa coronavirus gbakee ka ọ nọpụrụ iche ma nata ọgwụ ya bụ ọrịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Gọvanọ Kaduna steeti, Nasir El-Rufai

Ebe foto si, FACEBOOK/NASIR EL-RUFA'I
Na March 29 ka Gọvanọ Nasir Ahmad El-Rufai nke Kaduna steeti kwupụtara na o buterela coronavirus.
Ọ sị na o nọpụrụ iche ka ọ hapụ ifesa ọrịa, nisonye iwu ndị ọrụ na-ahụ maka mfesa ọrịa coronavirus bụ NCDC - Nigeria Centre for Disease Control.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
N'Epreelu 23 ka Gọvanọ El-Rufai bịara kwupụta na a hụrụ na o sitela ọrịa coronavirus gbakee ka o mechara izu anọ esochiri ọgwụgwọ ziri ezi leta ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Ọ bụ mgbe a mechiri obodo ka Gọvanọ El-Rufai nke tweet update about im condition and even do online meeting with some oga dem for im goment.
Gọvanọ Oyo steeti, Seyi Makinde

Ebe foto si, @seyiamakinde/Twitter
Gọvanọ Oyo steeti, Seyi Makinde kwupụtara site n'akara Twitter ya na o buterela ọrịa coronavirus n'ụbọchị 30 n'ọnwa Maachị.
Ọ sị na ya egosịghị njirirmara ọrịa a mana o nwerela onwe ya n'oge ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7
O teghị aka, ebe ihe dịka ụbọchị ise n'ọnwa Epreelu, ka gọvanọ kwupụtara na ọ natala akwụkwọ nnyocha gosiri na o bughịkwa nje coronavirus ọzọ.
O kelekwa ndị ọrụ nchekwa na ndị na-ahụ maka agha Covid-19 na steeti ya.
O jikwara ohere a, kpee ekpere mgbake nye ndị ka na-arịa ọrịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 8
Ọrịa coronavirus dịka ọrịa 'ozuruụwaọnụ' ka na-enye nsogbu na Naịjirịa ugbua, ndị buterela coronavirus akarịala 25,600, ebe mmadụ 590 anwụọla.

















