Ifeanyị Okowa: Kwụghachi ụgwọ ị nara ụmụakwụkwọ n'ụzọ ezighi ezi

Ebe foto si, @GovIfeanyiOkowa
Gọọmentị Delta steeti agwaala otu onyeisi ụlọakwụkwọ Teknikal na steeti ahụ ya kwụghachị ego ruru nde iri na otu bụ nke ọ natara ụmụ akwụkwọ n'ụzọ ezighi ezi.
Ha jikwa ohere ahụ dọọ ndị isi ụlọakwụkwọ ndị ọzọ aka na ntị maka ịnata ụmụakwụkwkọ ụgwọ akwụkwọ ekwesighi ekwesi.
Ide mmiri kpara ike n'Abuja
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ebe ide mmiri batara n'ime ọdọụgbọelu Abuja.
Ụfọdụ ndị mmadụ kwuru na nke a mere ka ụfọdụ ụgbọelụ gaa Kano iche ka ya bụ mmiri zochaa tupu ha efebata.
Super Eagles ana-achịkwanụ?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọkwa otu Naịjirịa arịala dịka ha ritere ọla nchara na nwgụcha asọmpị iko mba Afịrka afọ 2019
Otu Super Eagles n'ọzị n'ọnọdụ iri atọ na atọ dịka ha gbagoro ọnọdụ iri n'abụọ.
Gee Nkeji ebe a:
Onyeisiala Tụnịshịa anwụọla

Ebe foto si, AFP
Onye bu onye mbụ banyere ọchịchị na Tụnịshịa bụ Beji Caid Essebsi anwụọla n'afọ 92, dịka gọọmentị mba ahụ siri kwuo.
Maazị Essebsi bụbụ onyeisiala tọchasịrị n'ụwa.
Ọ gara ulọogwụ ụbọchị Wenesde mana ndị ọrụ ya ekwughi ihe ọ na-arịa.
O meriri ntulikaka mbọ emere n'usoro onye kwuo uche ya na'afo 2014.
Na mbido afọ a, o kwuru ya agaghị apụta ịzọ ọchịchị na ntuliaka a ga-eme n'afọ.
N-Power achụọla ndị mmadụ n'ọrụ

Ebe foto si, www.npower.gov.ng
Akuko na-eru anyị ntị sị na Gọọmenti Naịjirịa achụọla ihe ruru mmadụ pụkụ abụọ ndị ewere na N-Power bụ ihe ehibere maka ịnyere ndị enweghị ọrụ aka.
Justice Bibiye bụ ọnụ na-ekwuru N-power sị na ha chọpụtara na ndị ahụ ejighị ya bụ ọrụ kpọro ihe.
Magu na ikpe Diezani

Ebe foto si, Magu's facebook page
Onye nọgodi n'isi ụlọọrụ EFCC bụ Ibrahim Magu etiela mkpu maka oge ọ na-ewe ịkpebi ikpe Diezani Allison Madueke na mba Briten.
Magu tiri mkpu a mgbe ndị isi Interpol na mba Briten biakwutere ya n'ụlọọrụ ya n'Abuja bụ ebe ọ nọ kwuo na ya bụ ikpe nwaanyị eboro ebubo mpụ eruola afọ anọ ugbua.
Mueller agọnahụla Trump

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, Robert Mueller agọọla na onweghị mgbe ya ji kwuo na aka Donald Trump bụ ọnyesisala mba Amerịka kwụ ọtọ na nchọpụta ya mere.
Mueller bụ onye nọ n'isi nyocha maka ebubo na Russia na Trump kpara mkpa mkpa na ntuliaka ha mere na 2016.
Fifa agbaala Musa Bility butu

Ebe foto si, European Photopress Agency
N'egwuregwu, Fifa amachiela onyenchikọta egwuregwu mba Liberia bụ Musa Bility afọ iri maka ego ha sị na o riri.
Bility sị na aka ya dị ọcha na ọ bụ amoosu ka ha na-ata ya.










