Makinde and Adelabu: Ikpe ụlọikpe mkpegharị agbara ndị ntaakụkọ Nigeria gharị

Ọ bụ otu ikpe, mana ndị ntaakụkọ ụfọdụ na-ede dịka ha si ghọta, ndị na-ede n'elu ebe ndị ọzọ a na-ede n'ala.
Ụfọdụ hụtara mkpebi ọkaikpe Abukakar Yahaya dịka ihe masịrị aka na-achị steeti Oyo bụ Seyi Makinde ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ onye ya na ya zọrọ ọchịchị bụ Adebayo Adelabu ka ọ masịrị.
Ile anya n'akara google, ịhụ etu mgbagwoju anya a siri kwụru n'ahịrị.

kedu nke bụ eziokwu?
Ị mata nke bụ ezi ya bụ ihe rara ahụ makana ọkaikpe Yahaya na ndị otu ya ewepụtabeghi ikpe ha n'uju.
Dịka ọkaiwu ya bụ Eyitayo Jegede siri kwuo, mkpebi a emetụtaghị ọnọdụ Gọvanọ Makinde.
"Ụlọikpe a ekwughi na ha ekweghi n'ihe Inec mere n'ịkpọpụta aha Makinde dịka onye meriri. Ihe ha kwuru bụ na ha ekwenyeghi n'ihe ụlọikpe ntuliaka kwuru."
Ọkaiwu nke APC bụ Adeboye Sobanjo kwuru na ulọikpe a mere ka a mata na ha kwenyere na mkpesa Maazị Adelabu wetere, mana gbajọọ ị sị ka e megharịa ntuliaka.
O kwukwara sị; "Ọ bụ n'aka onye anyị bịara ozi ka ọ dịzị ugbua. Ọ bụ ya ga-agwa anyị ihe ọ chọrọ."
Ihe nwereike ime
Ohere ka dịrị pati abụọ ndị a zọrọ ọchịchị ịga ụlọikpe kachasị nke a kpọrọ "Supreme Court" na Bekee.
Site n'ọnụ okwu ọkaiwu Sobanjo, Adelabu nwereike isoro ikpe a ruo na ngwụcha.
Mana olilanya bụ na Makinde ka ga na-achi ruo mgbe esuru ya bu okwu kpọm.








