Coronavirus: Ọrịa a agaghị egbochi asọmpi Olimpiks - Onyeisiala Japan

Tokyo Olympics 2020

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Praịm Mịnịsta mba Japan bụ Shinzo Abe ekwuola na ọrịa coronavirus agaghị egbochi asọmpi Olimpik nke afọ a ịga n'ihu.

Abe kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'ehihie Satọde.

Nke a na-abịa na-agbanyeghị na coronavirus egbuola ihe ruru mmadụ 28 na mba Japan.

Mmadụ karịrị 1,400 ebutekwala ya bụ ọrịa na mba ahụ.

Shinzo Abe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Shinzo Abe Praịm Mịnịsta mba Japan

Abe kwuru sị: "Anyị ga-akwụsị mgbasa ọrịa. Egwuregwu Olimpik ga-aga n'ihu dịka e si yibuo ya."

Egwuregwu Olimpik kwesịrị ibido n'ụbọchị 24 nke ọnwa Julaị ruo abalị itoolu nke Ọgọst afọ 2020.

Ọ bụ n'obodo Tokyo nke mba Japan ka ya bụ asọmpi ga-ebiri ọkụ.

Aha onyonyo, Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị

Ịhazi asọmpi a eriela mba Japan ihe karịrị otu tarị yen na ụma atọ (I.35 trillion yen) nke pụtara ijeri paund iri na ụma abụọ ( (£10.26bn).

A na-atụ anya na ndị egwuregwu ruru mmadụ 11,091 ga-eso sọọ mpi na Olimpik nke afọ 2020.

Mmadụ ndị a ga-esi na mba 206 n'akụkụ ụwa niile abịa.

Mana mba Japan na-ekwu na egwu ọbụla adịghị n'ihi na ha zuru ka e mee.

Rochas Okorocha

Onye chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ndị si mpaghara ọwụwa anyanwu bụ agbụrụ kacha akpa udo na Naịjịrịa.

O kwuru nke a n'ụlọomeiwu ukwu oge ha na-atule okwu gbasara ihibe ngalaba ga na-ahụ maka nwulite mpaghara ọwụwa anyanwu nke a kpọrọ 'South East Development Commission' na Bekee.

Onye wepụtara akwụkwọ iwu ahụ bụ Stella Oduah na-anọchite anya Anambra North na Sineti Naịjirịa.

Lee ihe ndị ọzọ Okorocha kwuru ebe a

  • Ndị Igbo na-akpa udo karịa agbụrụ ọbụla na Naịjirịa mana ọ bụ ha ka aka aghọtaghie.
  • Ebe ọbụla ha nọ , ha na-eme ọyị na nwanne ma na-ewulite akụ na ụba ebe ahụ.
  • E kwesiri ịma ihe a ga-eme iji gbanwe echiche ndị Igbo na ana-emegbu ha.
  • Ọ na-afụ ụfụ na ego mbite ruru ijeri naira abụọ na abụọ n'ụma enweghị nke ruru ọwụwa anyanwu aka.
  • Ndị Igbo na-ahụ onwe ha ka ndị a na-emegbu emegbu na mba ha sokwa nwe.
  • Akwadoro m ka mpaghara niile nọ na Naịjirịa nwe ngalaba nke ha
  • Obi adịghị ndị mpaghara ọwụwa anyanwu mma makana ha anaghị ahụ aka ọrụ gọọmenti etiti na mpaghara ha.
  • Ndị ọwụwa anyanwu bụ ndị na-esi n'ihe n'abụghị ihe mepụta ihe.

Uzodinma na-akwado Oshiomhole

Hope Uzodinma na Adams Oshiomhole

Ebe foto si, Twitter/Getty images

Nkọwa foto, Hope Uzodinma na Adams Oshiomhole

Gọvanọ Imo State bụ Hope Uzodimma ekwuola na ya kwụ onyeisioche Pati All Progressives Congress bụ Adams Oshiomhole n'azụ.

Uzodinma kwuru nke a oge ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ n'ogige ụlọ gọọmentị dị n'Owere.

Ọ kọwara na o doro ya anya na ụfọdụ ndị otu APC na-agba mbọ ka ha chutuo Oshiomhole n'ọkwa, mana nkata niile ha na-akpa iji chutuo ya ga-ekpudorịrị ha.

Uzọdịmma kwuru na ihe kwesịrị ime ugbua bụ ka ndị isi pati ha jikọọ aka ọnụ ma wepụta atụmatụ nke ga-enye ha mmeri na ntuliaka nke afọ 2023.

Gịnị mere Buhari na Kebbi steeti?

Otu nwoke chóró ikwe onyeisiala n'aka

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Nkọwa foto, Otu nwoke chóró ikwe onyeisiala n'aka

Ndị uweojii nzuzo nke Naịjirịa bụ DSS akọwaala na ha na-eleba anya n'ihe mere oge onyeisiala Muhammadu Buhari gara njem nleta na Kebbi steeti.

Mana Peter Nwahunanya bụ ọnụ na-ekwuru ndị DSS kwuru na ha na-eleba ya bụ ihe anya iji mara ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ.

Ihe onyonyo ewepụtara na soshal midia gosiri ebe otu onye gbara ọsọ chọọ imetụ Buhari aka.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọtụtụ malitere ikwu na ọbụ mwakpo ka onye ahụ chọrọ ịwakpo onyeisiala.

E mechara kọwaa na ọ bụ onye hụrụ Buhari n'anya nke ukwu nke na-achọ ụzọ ọ ga-esi kwe ya n'aka.

Nwahunanya kwukwara na ndị ọrụ ha niile nọ ya oge ya bụ ihe mere ga-enweta ntaramahụhụ maka arụghị ọrụ ha nke ọma.

'Ndị si mba 26 na Yurop bịko abatala Amerịka ugbua'- Donald Trump

Donald Trump

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Trump kwuru na ọnọdụ mba ya maka Coronavirus bụ gbata gbata

Onyeisiala mba Amerịka Bụ Donald Trump amachiela ndị mba iri abụọ na isii nọ na yurop ịbata mba ha maka igbochi mfesa Coronavirus ma kwupute na mba ya nọ ọnọdụ gbata gbata.

Mmachi a agụnyeghị mba UK nakwa Republic of Ireland ya na mba ndị na-anọghị n'ogige Schengen.

Ndị bueterela ọrịa na mba US eruola puku abụọ ebe mmadụ iri anọ na atọ anwụọla.

Ebe Turkey akwụsịla ụgbọelu si mba yurop ibata na be ha.

Saudi Arabia kwụsịrị ụgbọelu ọbụla si mba ofesi ịbata na bee ha.

Sanusi Lamido Sanusi awụchiela na Legọs

Sanusi

Ebe foto si, TWITTER/@MASARAUTARKANO

Nkọwa foto, Sanusi Lamido Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti Naijiria

Eze Kano achụtụrụ achụtụ bụ Sanusi Lamido Sanusi awụchiela Legọs dịka ụlọikpe ukwu nke gọọmenti etiti kpebiri ntọghapụ ya ebe amachiri ya na Nasarawa.

Ọtụtụ ndị bee ya gara ọdọụgbọelu dị na Legọs nabata ya ka o si Abuja bata.

Sanusi na gọvanọ Kaduna bụ Nasiru Elrufai yi wee si Awe dị na Nasarawa gawa ọdọụgbọelu Abuja ebe ha banyere ụgbọelu na-aga Legọs.

Sanusi kpesara ụlọikpe ka ha nye ya ohere ga-eme ka atọhapụ ya na ebe amachiri ya n'Awe.

Cheta na gọọmenti Kano chuturu Sanusi n'oche eze maka ebubo nnupuisi.

Na mba Afịrịka,

Coronavirus na Sudan

Ebe foto si, SOPA Images

Mba Sudan ekwuola otu nwoke nwụrụ nso nso na bee ha bu ọrịa Coronavirus.

Nke a ga-eme ya onye mbụ buterela ọrịa ahụ na mba ahụ.

Na mba ofesi,

Ndị yi mkpuchi imi

Ebe foto si, Getty Images

World Health organisation ekwuola na mba Europe abụrụla ebe ọrịa Coronavirus kacha akpa mkpa mkpa n'ụwa.

Onyeisi ngalaba ahụ bụ Dr Tedros Adhanom Ghebreyesus rịọrọ ka mba niile wepụta ụzọ zuruoke , nzisa ozi nakwa nkwụsị mmekọrịta n'ọha iji wee zọọ ndụ ndị mmadụ.

Gịnị na-eme n'egwuregwu?

Mikel Arteta

Ebe foto si, Getty Images

E jirila maka mkpa mkpa ọrịa Coronavirus na-akpa kachapụ emume egwuregwu dị iche iche na mba ụwa n'otu ụbọchị.

Ebe onye nchịkọta otu egwuregwu Arsenal bụ Mikel Arteta ekwuola na ahụ na-adị ya mma ka achọpụtchara na o bu ọrịa Coronavirus.

Soro BBC Igbo dọt kọm mgbe niile ka ịmata nke na-eme gbasara ọrịa Coronavirus.

Nkeji taa

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Aha onyonyo, 'Onweghị ụzọ ọzọ e si enweta ego na-abụghị ịrụsị ọrụ ike'