Lamido Sanusi: Okwu isii na-akpọ ogwu n’ahụ sirila n’ọnụ ya pụta

Ebe foto si, Getty Images
Dịka a chụturu Sanusi Lamido Sanusi n'oche Eze ka Emir nke Kano abalị ole na ole gara aga, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ okwu o kwuru bụ ihe butere ya nsogbu.
Maka ọ bụghị taa ka e jiri mara Awusa na ụta, Sanusi bụ onye e jiri okwu na-apụ ụka mara.
Bido mgbe ọ bụ onyeisi ụlọakụ etiti (Central Bank) rue oge ọ banyere oche Eze, Sanusi Lamido Sanusi amaghị onye nwụrụ ụzụ akwa ya na-atu n'ikwu uche ya.
Ọ bụ onye na-ekpu nkata n'ihu agwa eze okwu.
Lee okwu azụ anụ ụka ndị o kwurula :
1. "NNPC enweghị ike ịkọwa ebe ego $22Bn nọ"
Oge ọ bụ onyeisi ụlọakụ etiti (Central Bank), Sanusi kwuru ọtụtụ okwu na-ese okwu gụnyere ebubo na NNPC enweghị ike ịkọwali ebe ego dị ijeri dọla iri abụọ($20billion) ha retara na mmanụ agbịdị nọ.
Gọọmenti etiti n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan kwere nkwa inyocha ebubo ahụ mana n'oge na-adịghị anya, ha napụrụ ya ọkwa onyeisi ụlọakụ etiti.
2. "Ndị nwe ụlọakụ na ndị ọgaranya na-ebi ego jịkọrọ aka na-akpagbu ndị ogbenye'

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2010 oge ọ na-ebu agha megide nrụrụaka n' ụlọakụ dịga na Naijiria, Sanusi nọ n'emume Mahadum Bayero University Kano sị na o zuorola ndị nwe ụlọakụ nakwa ndị ọgaranya ha na-agbazinye ego.
N'akụkọ nke 'Daily Trust' wepụtara, Sanụsị kwuru sị,"Ndị nwe ụlọakụ nakwa ndị ọgaranya na-ebi ego nakwa ndị nọ n'ọkwa ọchịchị bụ otu ndị n'azọ ndị ogbenye ụkwụ nisi . Ya mere anyị ji sị ugbua, o zuola bụ na o zuola."
3. 'E kee ego ndị ụlọomeiwu ọkara, a ga-eji ya nye ọtụtụ ụmụ Naijiria ọrụ'

Ebe foto si, Getty Images
"Ebe ka 'mgbanwe(change) nwa dị? 'Change' kwesịrị ibido n'ụlọomeiwu".
Onye sinetọ na-eri nde naira iri atọ na isii (N36 million) kwa ọnwa. I kee ya abụọ, ọ bụụ nde naira iri na asatọ. Nde naira iri na asatọ fọrọ nwere ike inyenwu ụmụ Nairia 2000 ọrụ. ha ga-na-eri puku nairi naira itoolu kwa ọnwa."
"I were mmadụ iri nari (200) mụbaa ndị Senetọ 109, nke a ga-enye ụmụ Naijiria 21,800 ezigbo ọrụ."
Onye ụlọomeiwu nta na eri nde 25 n'ụgwọnwa. "Ọkara ego a bụ nde naira iri abụọ na ụma ise (N12.5 million) nke a zuru iwe ụmụ Naijiria 135 n'ọrụ a na-akwụ ha puku naira iri itolu narri naira abụọ, nari naira ise."
"Naijiria nwere ndị omeiwu 360 n'ụlọomeiwu nta. Okara ụgwọonwa ha ga-enye ụmụ Naijiria 48,600 ezigbo ụgwọọnwa."

Ebe foto si, Getty Images
4. 'Ndị Ugwu akwụsịghị ịlụ ọtụtụ nwaanyị, ịmụ oke ụmụ, ha ga-anọgide n'ụbịam'
Sanụsị nọrọ n'ọnwa Janụwarị afọ 2020 oge ọ gara emume maka ụmụakwụkwọ gụchara mahadum nke 'Federal University' Gusau kwuo sị na ọ bụrụ na ndị ugwu agbanweghị na ụbịam na agaghị n'ihu ga abụ nketa ha.
Ọ sị: "Ụbịam n' Ugwu dị pasent 80; ebe ọ bụ pasent 20 na ndịda n'ihi omenala ịlụ ọtụtụ nwaanyị na ịmụ ụmụ a ga-agbahapụ ha na-arịọ arịriọ n'okporoụzọ."
"Nsogbu ndị anyị nwere taa dịka ịṅwụ ọgwụ ike,Boko Haram, oke ohi, na enweghị ọrụ ga-abụ obere ya n'afọ 20 maọbụ 30 na-abịanụ."
5. 'Na nwa m nwaanyị mara nwata nwoke ụra gosiri na nwoke agaghị emegbu ya, ọ gba nkịtị'
Sanusi kọrọ akụkọ etu nwa ya nwaanyị bụ Shaheeda Sanusi siri maa nwata akwụkwọ nwoke ogbo ya ụra maka ịkparị ya were sị nwa ya agaghị edinwu nwoke ịkparị ya.
Ọ gbara ndị sị na ya na-enye nsogbu ha chee aka ghọrọ agbụrụ Sanụsị na-abịa.
6. 'Ọ bụrụ na ndị Ugwu agbanweghị, 'quota system' ga-ememila ha'
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Na mmeme ncheta afọ iri isii nke Nasir El-Rufai na Kaduna n'afọ a, Sanusi kwuru sị sị,"Anyị na-ekwu ya kemgbe afọ 20 maọbụ 30. ọ bụụ na ndị Ugwu agbanweghị, ha ga-ememila onwe ha."
"Ala Naijiria na-aga n'ihu. Okwu 'quota system' onye ọbụla na-ekwu nwere mgbe ọ ga-erue, chi ya ejie."
Ọ dọrọ ndị ntọrọbịa Ugwu aka na ntị ka ha tinye uchu n'akwụkwọ n'ihi na oge na-abịa oge a ga-agbanwe iwu Naijiria nke na ebe i si maọbụ okpukperechi gị agaghị enye gị ọrụ.
7. 'Ihe ụfọdụ ndị gọvanọ na-ejeta na Chaina bụ mbibi ego'
"Anyị nwere ndị na-aga njem Chaịnaotu ọnwa, ihe ha ji alọta bụ akwụkwọ nkwekọrịta mbibi ego."
"Chaina binye gị ijeri dọla iri na asatọ($18) iji rụọ okporo ụgbọoloko, ha ga-enye gị okporo oloko, nye gị ụgbọoloko, nye gị onye ọgbọụgbọ, kedụ zie uru iritere na mbibi ahụ?"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2









