Emir of Kano: Ndị Eze ọdịnala ndị ọzọ achụpụrụ n'oche dịka Sanusi

- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-etị aka n'obi ka achụtụrụ Sanusi Lamido Sanusi dịka eze obodo Kano.
Ufọdụ na-ajụ kwa asị "kedu etu onye jị ntọrọndọrọ ọchịchị banye n'ọchịchị si nwe ike ịchụpụ onye omenala ndị tinyere n'ọchịchị?"
Iji ghọta etu onye dịka Gọvanọ Umar Ganduje siri nwe ike ịchụpụ ọnye ọchịchi ọdịnala, ka anyị kọwara gị etu ọ sịrị bido.
Akụkọ mgbe ochie

Ebe foto si, Getty Images
Dịka akụkọ mgbe ochie ndị obodo Kano sị we kwuo na ọ bụ Bagauda bu Eze mbụ Kano.
Ọ bụ n'afọ 1805 ka ndị Fulani chụtụrụ ha n'ọkwa.
Etu ike ndị Eze sịrị daa
Ọ bụ ndị mba Briten chuturu ndị Fulani ọchịchị dịka ndị ọchịchị ọmenala nwere ike mgbe ha meriri ha n'agha n'afọ 1903.
Ha napụrụ Aliyu Babba onye bụ eze kano oge ahụ ọchịchị ma dupu ya na Lokoja.
Ha chịkọtara mpaghara niile were kpọọ ya "Kano Emirate" nke dị n'okpuru ọchịchị Briten.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ iwu nke afọ 1954 akpọrọ "Littleton Constitution" napụrụ ndị ọchịchị omenala ọtụtụ ike ha nwere itinye aka n'ọchịchị maọbụ ịhọpụta ndị ọchịchị.
Iwu a nyefere ndị ụloọmeiwu ukwu na nke nta ikike ọchịchị niile.
Iwu 'Republican Constitution" nke afọ 1963 nyere gọọmentị ọchịchị onyekwuoucheya ikike ime eze maọbụ iwepụ mmadụ dịka Eze.
Iwu nke 1979 nyere iwu na ndị ọchịchị omenala agaghị azọ maọbụ nwee oche na ọchịchị gọọmentị.
Mana ọ bụ iwu nke afọ 1999 napụrụ ha ike niile ha nwere dịka ndị eze ma nyefee ha niile n'aka gọomentị.
Ihe a pụtara na ndị e ji ndọrọndorọ ọchịchị họpụta nwere ike karịa ndị Eze ọdịnala na Naijirịa.
Kedu ndị Eze gọọmentị Chupụgoro n'ọchịchị?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mba Briten chitụrụ ọtụtụ ndị eze na Naijirịa were napụ ha ike.
Ndị eze dịka Jaja of Opopo, Ovonramwen Nogbaisi nke Bini n'afọ 1897, Oba Adeyemi Adeniran II nke Ọyọ na ndị ọzọ.
Ọ bụ nchụtụ eze ndị a mepere anya ndị mmadụ ha were hụta na-enwere ike ịnapụ ndị Eze ike.
Ngwa lee ndị eze gọọmentị Naijirịa chụpụ goro n'ọchịchị:
Muhammad Sanusi nke mbụ

Ebe foto si, KASSIM TURAKI
Muhammad Sanusi bụ nnanna Sanusi Lamido Sanusi.
Ọ bụ nwoke mara ihe ma bụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị na mpaghara ugwu.
Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ọzịzọ ọchịchị dị na-etiti ya na Ahmadu Bello mere ka achụpụ ya n'ọchịchị.
Ọ bụ goọmentị mpaghara ugwu chụpụru ya n'afọ 1963 site na nyocha akporo "Muffet Probe" maka etu o si ahazị akụnaụba ya.
Sanusi Lamido Sanusi maọbụ Muhammad Sanusi II

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-eso akụkọ ndọrọndorọ ọchịchị ga-ama na ọteela aka Sanusi na Gọvanọ Kano bụ Abdullahi Umar Ganduje nwere nghọtaghe.
Nchutu Sanusi bidoro dịka ndị mmadụ bidoro na-ede akwụkwọ ka goomentị nyọocha etu o sị achị ọchịchị.
Ụfọdụ akwụkwọ ndị a bụkwa ebubo na Sanusi na-ere ala ndị eze ọ na ekwesịghị ire.
Na Disemba afọ 2019 ka Gọọmentị sị na okpuru ọchịchị Sanusi kwapụta oche eze anọ ọzọ nke mere ka ebe Sanusi bụ eze site na okpuru ọchịchị iri anọ na anọ buruzịa nanị iri.
Sanusi bụ Emir pụrụiche dịka ọ na-etinye ọnụ n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị, ofufe, akụnaụba na ezinaụlọ.
Nke a were ọtụtụ mmadụ iwe n'ihi na ndị Emir anaghị ekwu oke okwu.
Ọ bụ ebubo na ọ kwanyeghị iwu obodo ugwu kwesiri mere ka achụpụ ya n'ọkwa.
Ibrahim Dasuki

Ebe foto si, Other
Eze Ibrahim Dasuki bụ eze Sokoto nke iri na asatọ.
Ọ bụ n'afọ 1996 mgbe Sani Abacha nọ n'ọchịchị ka achụpụrụ ya.
Ha chụpụrụ ya maka ebubo na ọ na-ebute ekworo na etiti ndị obodo Sokoto, erubeghị gọọmentị ntị ma ịme njem na anataghị goọmentị ikike.
AlMustafa Haruna Jokolo
Almustafa Haruna Jokolo bụrụ Eze obodo Gwandu n'afọ 2005.
Gọọmentị Kebbi mgbe Adamu Alero nọ n'ọchịchị ewepụrụ ya n'ọkwa.
A chụpụrụ ya maka ebubo na ọnaghị akwanyere iwu obodo ugwu.
N'afọ 2014 ka ụlọikpe elu dị na Kebbi nyeghachiri ya ọchịchị.
Oba AdeyemiAdeniran II
Ọ bụ tupu Naijirịa enwere onwe ha ka achụpụrụ Oba Adeyemi Adeniran II n'oche.
Akụkọ na-akọwa na ọ bụ maka na ọ dọnyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị NCNC nke Nnamdị Azikiwe bụ onyeisi ha butere esem okwu n'etiti ya na Obafemi Awolowo.
Esem okwu a mere ka Awolowo kpọọ nzukọ ndị Eze ala Yoruba niile bụ ndị nwere ikike ị chụpụ Adeniran n'ọkwa.
Ọ bụ n'afọ 1954 ka achụpụrụ ya n'ọkwa.
Umaru Tụkụr
Umar Tukur bụ Eze Muri mgbe enwere Gongola steeti n'afọ 1966.
Ya na Gọvanọ mgbe ahụ bụ Yohana Madaki nwere nghọtaghe.
Madaki nyere iwu ka achụpụ ya n'ọchịchị maka agwa ọjụọ na ihe ndị ọzọ ọ mere n'afọ 1986.









