Coronavirus: Ihe ise mba ụwa kwesịrị ịmụta n'aka Naịjirịa

Ndị ọụ ahụ ike na-enye ndị mmadụ 'hand sanitizer'

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọrịa coronavirus agbasaala na mba 114 n'ụwa kamgbe ọ malitere n'obodo Wuhan nke mba Chaịna.

Naịjirịa sokwa na mba ebe ọrịa batarala.

Oge nwoke onye Itali bubatara ọrịa na Naịjirịa, egwu tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ha che na gọọmentị agaghị enwe ike igbochi mgbasa ya bụ ọrịa

Mana gọmentị Naịjirịa akpaala ike igbochi mgbasa ọrịa ọjọọ nke mere ka otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' weliere ha aka elu.

Lee ihe ise ụwa kwesịrị ịmụta n'otu Naịjirịa si gbochie mgbasa ọrịa COVID-19

'Genome sequencing'

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Naịjirịa bụ mba izizi n'Afrịka mere ihe a kpọrọ 'genome sequencing' nke gosiri na nje ahụ bụkwa ụdị nje nke na-agbasa na mba Itali nakwa obodo Wuhan.

Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwuru na ndị nyere aka ime nke a bụ ndị mịnịstrị ahụike nke Legos steeti.

Ha kesara ihe ha chọpụtara na nchọpụta a nye ndị ọrụ ahụike n'akụkụ ụwa niile. Onyeisi WHO kelekwara ndị ọkammuta sayensị Naịjirịa maka nke a.

Mgbasa ozi

Ka e sị amata Coronavirus

Ụlọọrụ mgbasa ozi a tụkwasịrị obi dịka BBC na-agbasara ndị ọha obodo ihe niile ha kwesịrị ịma nakwa ihe ha kwesịrị ime iji zeere ọrịa ọjọọ a.

Kwa ụbọchị, ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche na-ewepụta akụkọ iji kuziere ndị mmadụ ihe ha ga-eme ma ha hụ onye na-arịa ọrịa yiri coronavirus.

Ịchọta ndị niile ha na onye mbụ bu ọrịa a mekọrọ

Aha onyonyo, Okwu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ Wuhan dị na Chaịna kwuru maka ọnọdụ ha

Gọọmentị Naịjirịa chọtacha ndị niile ha na nwoke Itali ahụ bubatara ọrịa coronavirus bakọrọ ụgbọelu.

Na-agbanyeghị na ọtụtụ n'ime ndị ahụ anọghị na Legọs, gọọmentị kpọtụụrụ ha niile ma dọọ ha aka na ntị ihe ha ga-eme.

Ọgbakọ onyoonyoo kama ọgbakọ ihu na ihu

Aha onyonyo, Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị

Dịka gọọmentị mara ọkwa na ọrịa coronavirus abatala Naịjirịa, ọtụtụ ụlọọrụ machiri inwe ọgbakọ ihu na ihu, kama ha malitere iji ịntaneetị enwe ọgbakọ n'igwe televishọn.

Nke a belatara mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, nke bụ otu ụzọ ọrịa a si agbasa.

Itinye ihe karịrị mmadụ 100 na 'quarantine'

A passenger"s body temperature is being tested at the gate of entry upon arrival at the Murtala International Airport in Lagos

Ebe foto si, AFP

Na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị, Kọmịshọna ahụike na Legọs steeti bụ ọkammụta Akin Abayomi kwuru na ha etinyela ihe karịrị mmadụ 100 na kwarantaịn.

Ndị a bụ ndị ha na nwoke Ịtalị ahụ bubatara ọrịa coronavirus mekọrịtara ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Amputee Model: 'Mmadụ agaghị afụ gị n'anya ma ọ bụrụ na ịhụghị onwe gị n'anya'