Biafra Agitation: 'Ahụrụ m ọgụ sharịa, achọghị m ịhụ ọgụ ọzọ' - Funnybone

Ebe foto si, Instagram/funnyboneofficial
Stanley Chibunna, onye ọkpaọchị e ji 'FunnyBone' mara kwuru na ya akwadoghi iji ụzọ ọgbaghara achọ nnwereonwe Biafra.
Funnybone kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, a kpọrọ gịnị na-afịọ.
Ray Emordi, onye Igbo na-eme ihe ejije Nollywood, sonyekwara na mkparịtaụka ahụ.
N'okwu ya, Funnybone kwuru na ya kwadoro ihe ọbụla a ga-eme ka ala Igbo kawanye mma.
Mana aka ya agaghị adị na nke ọbụla bụ tigbuo zọgbuo.

O kwuru sị: "E toro m n'ugwu awụsa, na Jos nakwa Kaduna."
"A hụrụ m ọgbaaghara sharịa n'afọ 2000 dịka nwata akwụkwọ."
"A hụkwara m ọgụ a lụrụ na Jos n'afọ 2003."
"Ihe ndị m ji anya m hụ n'oge ahụ ka dị m n'isi ruo taa."
"Anyị gbasara akwụkwọ oge ọgụ bidoro, a na m ama ozu ndị mmadụ elu oge m na-agba ọsọ ndụ."
"Ihe ndị a abụghị ihe m ga-ahụcha, mmadụ asị m ka m bịa kwadoo ọgbaaghara ọzọ. Mba!"
"Ọ bụrụ na e nwee ọgbakọ maọbụ ntuliaka iji kwuo ma a ga-ekewa, nke ahụ ka m ga-akwado."
N'otu aka ahụ kwa, Ray Emordi rịọkwara ka onye ọbụla rube isi n'iwu obodo ka ọ dịrị onye ukwu na onye nta mma.
Ọchịchị Naịjirịa

Funnybone na Ray Emordi kwuru na ọ ga-amasị ha ka onye Igbo chịa Naịjirịa otu ụbọchị.
"Ihe ndị Igbo gabigara oge a lụrụ agha Biafra ma mechaa wulikwaa ọzọ gosiri na Igbo siri ike," Funnybone na-ekwu.
"Ya mere m ji chọọ ka onye Igbo chịa Naịjiria oge anyị niile ka nọkọ ọnụ dịka otu mba."
"Ọ bụrụ na e mechaa kewaa, nsogbu adịghị, mana ugbua, ọ ga-adị mma ma onye Igbo chịa."

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











