Ekwesịrị itinye anya n'ihe gbasara ọdọ ụgbọelu Asaba?

Ebe foto si, Ifeanyi Okowa/Facebook
Onye na-achị Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ekwuola na ọdọ ụgbọelu dị n'Asaba ga-ebido ịrụ ọrụ n'ime ọnwa anọ nke na-abịa.
Okowa kwuru nke a n'ọgbakọ ndị otu PDP nwere n'obodo Kwale dị na mpaghara Delta North.
Ọ bụ n'ime ọchịchị gọvanọ James Ibori n'etiti afọ 1999 na 2007 ka e bidoro ikwu okwu gbasara ịrụ ọdọ ụgbọelu nke a.
Echiche gọomenti Delta bụ ịrụ ọdọ ugbọelu nke a, ka o ruo ọkwa akpọrọ 'Category C Airport' n'olu bekee, ga-ebu ụgbọelu nke dị ichiche.
Mana nsogbu dịka ebe a ga-arụ ya bụ ọdọ ugbọelu n'ime Delta steeti kwusirị ya bụ ọrụ n'oge ọchịchị James Ibori.
Gọvanọ Emmanuel Udughan mechara bido ịrụ ọdọ ụgbọelu a n'afọ 2008 n'Asaba.
Uduaghan kwuru oge ahụ na ọdọ ugbọelu nke a ekwesịghị ịbụ ihe echefuru echefu.
Arụọla yabụ ọdọ ụgbọelu, mana ugbua, orubeghị etu ọ kwesịrị ịdị.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
BBC Igbo kpọrọ otu onye bi na Asaba, jụọ ya ihe o chere gbasara mmepegharị ọdọ ụgbọelu a n'ime ọnwa anọ na-abịa.
Okwuru sị "ekweghi m na enwere ike imepenwu ọdọ ụgbọelu a n'ime ọnwa anọ a maka etu ha si arụ ọrụ, ha na egbu oge.
"Ka ha si arụ ọrụ, onwere ike iru ọnwa asaa tupu ha arụchaa ihe ha bidoro,
"Ha na-arụkwa ọrụ o, mana ị ma etu gọọmentị si arụ ọrụ, ha dọbachara ụgbọala trailer ebe ahụ iji gosi na ha na-arụ ọrụ, mana onwebeghi ihe ha mewere.
"Ụfọdụ oge, ụgbọelu na-efeda, ụfọdụ oge ha-ekwuo na ha mechiri emechi."








