Ipob news today: Ihe Amnesty International kwuru gbasara IPOB abụghị eziokwu – Uwazurike
Ọkaiwu a ma ama bụ Goddy Uwazurike akatọọla otu Amnesty International maka okwu ha kwuru gbasara ndị otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ IPOB.
Amnesty International bụ otu a ma ama na mba ụwa niile maka ịkwalite ikike dịịrị mmadụ nke bekee na-akpọ ‘human rights’.

N’ozi ha zipuru n’ụbọchị Mọnde, AI gwara ndị IPOB ka ha kwụsị ịwakpo ndị mmadụ ndị jụrụ isonye n’iwu ‘sit at home’ nke ha tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
AI dere sị: “Ịwakpo ndị mmadụ nakwa ụlọahịa iji manye ndị mmadụ ka ha nọrọ n’ụlọ bụ nnukwu ihe ọjọọ megide ikike dịịrị mmadụ.”
“Anyị na-akpọku gọọmentị Naịjirịa ka ha nyochaa ihe ndị a ma taa ndị aka ha dị na ya ahụhụ.”
Mana ọkaiwu Goddy Uwazurike na-ekwu na AI emeghị nnyocha ha ọfụma tupu ha akpọọ IPOB aha ọjọọ.
Uwazuruike kwuru na IPOB apụtala ugboro ugboro kwuo na ha akwụsịla atụmatụ sit at home.
O kwuru sị: “Ọ bụ ndị omekome na-akpa ike ndị ahụ, ọ bụghị ndị IPOB.”
“Ndị Amnesty International kwesịrị ime nnyocha miri emi tupu ha ekwuwe ihe ha amaghị.”



