Enugu Ezike News: 'Ndị gburu nwa m nwoke napụrụ m onye bụ na m na-eri nri'

Boy Ezeh , onye nche ndị ojiegbe gbagburu

Ebe foto si, Ezeh Family

Nkọwa foto, Boy Ezeh, onye nche ndị ojiegbe gbagburu ka ọ dị afọ 32 arụọla ọrụ nche afọ 12

Ndị ezinaụlọ Hillary Ezeh, onye nche so na mmadụ abụọ ndị ojiegbe gbagburu n'Enugu-Ezikedị n'Enugwu steeti atụọla arịrị maka nnapụ ndị omekome napụrụ ha anya ha ji ahụ ụzọ.

N'ụzọ ụtụtụ Tuzde, ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ gbagburu Boy Eze dị afọ 32 na ogbo ya bụ Chinedu Uramah Abalị ise nke ọnwa Oktoba ebe ha na-eche nche ma gbaa ụlọ nche ha ọkụ.

Oge, onye ntaakụkọ anyị gaara na ngwuru ha dị nAmufie, Enugu-Ezike, nne nwa amadi ahụ nwụrụ anwụ na ndị oriakụ ya atọ nọ n'iru ụjụ na arịrị ọnwụ ya.

Ezinaúló Hillary Ezeh

Odozi aku Ezeh gbara afọ 75 na-ebe akwa ọnwụ ọdụdụ nwa ya sịrị, "Hillary bụ na m na-eri nri ọnụ na-ezinaụlọ a."

Diọkpara ya bụ Maazị Onyeka ezeh kọwaara na Boy Ezeh bụ e jiri Akwaete mara gara ọrụ etu osi agabu kemgbe afọ iri na-abụọ o jiri rụwa ọrụ nche mana ọ lọtaghị.

Maazí Onyeka Ezeh, nwanne Hillary Ezeh nwúru anwú

"Amaghị ihe mere, ọ gara ọrụ, mana tupu chi abọọ, a bịara kpọọ anyị n'ọnwụọla."

Ezinaụlọ ya bekuru Gọọmenti ka ha enye ha ikpenkwụmọtọ ma nyekwara ha aka ịzụ ụmụ ise Akwaete hapụrụ tupu ọnwụ.

Etu ndị 'unknown gunmen' si gbuo ndị nche obodo abụọ n'Enugu Ezike ma gbaa ụgbọala ọkụ

Ndí uweojii ebe ha gara nleta n'Enugu - Ezike

Ebe foto si, Enugu Police

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha anwụchiela mmadụ mmadụ atọ ha na-enye maka mkpamkpa kpara n'Enugu-Ezike n'abali Monde.

Ndị bu egbe wakporo ụlọ ebe ndị nche "Neighboorhood Watch" ji mere ụlọorụ gbuo mmadụ abụọ n'ime ha, gbaa ya ọkụ ma gbakwaa ụfọdụ ụgbọala ha ọkụ.

Ha gburu Chinedu Urama si from Ụmụịda dị n' Enugwu-Ezike na Hillary Ezeh a ma ama dịka 'Boy Akwaete'.

Ndí uweojii ebe ha gara nleta n'Enugu - Ezike

Ebe foto si, Enugu Police

Otu onye nọ be ihe mere gwara BBC Igbo n'ọbụ n'ebe Elekere Mbụ nke ji ofifio ụbọchị Tuzde ka ya bụ mkpamkpa kpara.

O gbara ama na ebugakwara ozu mmadụ abụọ ahụ n'ụlọozu dị na mpaghara ahụ.

Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Abubakar Lawal onye gara ebe ihe ah ụ mere zigakwara ezinaụlọ ndị nwụrụ ozi iti aka n'obi ma na-ekpe ekpere ka ndị nọ n'ụlọọgwụ gbakee nsonso a.

O kwukwara ka ha ga-amalite nnyocha zuru oke ma chọpụta ndị kpara mkpa mkpa a ozugbo.

Kemgbe ọnwa ole na ole gara aga, ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ awakpoola ma gbaa ọtụtụ ogige ndị uweojii, ụlọ nakwa ụgbọala ọkụndị mmadụ n'Ọwụwa anyanwu ma gbuukwa ma ndị uweojii na ndị nkịtị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: