Ndị ojiegbe agbaala ụlọ nna "Eze Awo" ọkụ n'Awo-Omamma, Imo Steeti

Eze Awo na úló ndí agbara ókú

Ebe foto si, Eze Awo

Vincent Dimkpa a ma ama na soshal midia dịka "Eze Awo" akọwarala BBC Igbo etu ndị oji egbe aga si wakpo ma gbaa ụlọ nna ya ọkụ n'obodo Awo-Omamma.

Dịka Eze Awo siri kwuo, ndị oji egbe bịara be ya n'ime abalị dịka ọ na-akụ elekere abụọ nke ụtụtụ.

Ọ sị: "Ndị wakporo ụlọ m, mana dịka ha mụnyere ya ọkụ ọ gbaghị, ha gaa gbaa be nna m ọkụ."

Eze Awo sị na ndị a kụwara enyo dị n'ihu ụlọ ya ma munye ya ọku mana ọ gbaghị ọkụ maka etu e si rụọ ya.

Ọ sị na ndị omekome a gbakwara ụgbọala ya ọkụ.

Eze Amukamara

Ebe foto si, Eze Amukamara

Ebe ọzọ ndị a gara mkpa mkpa bụ ụlọ Eze Amukamara nke obodo Ezeawo dị na Awo-Omamma.

Eze Awo gwara BBC na ọ bụ maka okwu ya na-ekwu ekwugide ndị si na ha na-achọ nwereonwe Biafra mere e jiri mee ya ihe a e mere.

Ọ sị: "Cheta na ha boro m ebubo na aka m dị n'ọnwụ nwanne m Ikonso. Ụlọ Eze a ha gbakwara ọkụ bụkwa maka ebubo na osuru Ikonso imi."

Eze Awo sịrị na onweghi onye nwụrụ na mwakpo a n'agbanyeghị na ndị mmadụ nọ n'ụlọ oge ihe a mere.

Ọgbaghara na-adasike n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa site n'aka ndị ojiegbe ndị mmadụ na-akpọ "Unknown Gunmen".

N'ụbọchị ụka, ha gbara ụlọ Joe Igbokwe, bụ onye otu patị APC, ọkụ na be ya dị na Nnewi.

Eze Amukamara

Ebe foto si, Eze Amukamara

A gbakwara ụlọ ọrụ ndị Department of State Services (DSS) nakwa nke dị nchekwa okporoụzọ a kpọrọ Federal Road Safety Commission (FRSC) ọkụ n'ụbọchị ahụ.

Ufọdụ mmadụ na-ebo otu na-achọ nnwereonwe Bekee kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) ebubo na aka ha dị na mkpa mkpa a na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ipob n'onwe ha na-agọ n'aka ha adịghị na ya ma na-ebo ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ebubo nọ ọbụ ha na-eme ihe a.

Eze Amukamara

Ebe foto si, Eze Amukamara