Imo State News: Ndị oji egbe agbaala ụlọ ndị mmadụ ọkụ n'Imo Steeti

Mkpamkpa ndị omekome kpara n'Imo Steeti n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba na-apụta ihe dịka akụkọ rutere BBC Igbo na ha gara be Gozie Nwagba n'obodo Obor dị n'okpuruọchịchị Ọrlu n'Imo Steeti were mụnye ya ọkụ.
Ndị bi na mpaghara ahụ sị na ihe mere tinyere ha egwu n'ahụ dịka ndị omekome a gakwara gbaa obi eze obodo ahụ bụ Raphael Ekezie ọkụ.
Nke a gunyere arụ ndị ọzọ ndi oji egbe a kpara na ya bụ steeti dịka ha na-amanye ndị mmadụ ịnọdụ n'ụlọ, nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere.
Akụkọ si na steeti ahụ apụta kọwara na ndị oji egbe a wakporo obi Eze Ekezie, ma mụnye ya ọkụ n'ụbọchị Tọzde, Septemba 30.
Akụkọ ahụ kwukwara na ndị oji egbe ahụ bịara ebe elekere atọ nke ehihie chọrọ Eze Ekezie elu chọọ ya ala mana ha ahụghị ya, tupu ha ejiri iwe mee ihe ha mere.
Ha gara n'ihu hapụrụ ndị obodo ahụ ozi ha sị ka ha ziruo Eze Ekezie na ndị ọzọ, ebe ha kwuru ka ha gbaa mbọ hụ na ha kpọpụtara Glory Okolie (otu nwaanyị ndị uweojii nwụchiri dịka ha boro ya ebubo ịgbara onye ha sị bụ enyi ya nwoke a na-ekwu bụ onye Eastern Security Network (ESN) nke otu Indigenous People of Biafra (IPOB) ama), n'aka ndị uweojii.
Dịka akụkọ si obodo ahụ si kwuo, ha nyere ndị obodo ahụ naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ iji hụ na a gbapụtara Okolie nọrọla n'aka ndị uweojii ihe karịrị ọnwa atọ, maọbụ ha atakaute ya kọnkịrị n'aka ha.
N'agbanyeghị na-agbara ụlọ ndị a ọkụ, onye ntaakụkọ anyi kwuru na atọrọla mmadụ ise n'obodo ahụ.
Gozie Nwagba bụbu onyeisi mdị omeiwu n'Orlu.
Ụgbọala ndị a gbara ọkụ n'ụbọchị Fraịde.

Ndị oji egbe na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ dịka ndị otu Ipob si tinye, gbara ụgbọala abụọ ọkụ n'Imo steeti na Fraịde, ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba.
Dịka onye ntaakụkọ anyị si kwuo, a gbara otu ọkwọụgbọala ọkụ n'ime ụgbọala ya n'Obama Nguru dị n'Aboh Mbaise.
Otu onye hụrụ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome a chụtuchara ndị njem nọ n'ime ya bụ ụgbọala tupu ha amụnye ya na onye na-akwọ ya ọkụ.
Dịka nke a mere, a gbakwara otu gwongworo ọkụ n'ebe a ma dịka Ahịara junction, n'Ahịazụ Mbaise.
Gwongworo ahụ si Imo steeti na-aga Ụmụahịa, Abịa steeti, mgbe ndị omekome a kpatara ya aka.
Ndị hụrụ ka ihe mere kwuru na ọkwọụgbọala ya bụ gwongworo hapụrụ ya gbafuo tupu a mụnye ya ọkụ.
Mbọ niile a nwara inweta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii enweghi isi dịka ha ebulighi ekwentị ha.









