Unknown Gunmen attack: Etu ndị ekperima si wakpo ụgbọala Chris Azubuogu na Nnewi

Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ kpara mkpamkpa n'obodo Ajali nakwa Nnewi, Anambara steeti n'etiti ụbọchị Tozde.
Na Nnewi, ọ bụ ụgbọala Chris Akabogwu bụ onye na-anọcchite anya Nnewi-Ekwsihgo n'Ụlọomeiwu Naịjirịa, ka ha wakporo.
- 'Ọ bụrụ na IPOB chọrọ ka udo chịa n'ala Igbo, ha kwasaa ESN'
- Lee mkpamkpa ndị ojiegbe kpara n'Oko, Nkpor dị n'Anambra steeti na Sept 28
- Anyị ga-akwụ onye nyere anyị ozi maka ndị gburu Dkta Akunyili N20m- Govanọ Obiano
- Chike Akunyili Dora Akunyili's Husband: Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ Dr Chike Akunyili, di Dora Akunyili
Mana otu onye nọ Azubogu nso mana ọ chọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na ọ nọghị n'ụgbọala ya oge mwakpo a mere.
Onye ahụ kwuru na Azubuogu nọ Abuja, mana a tụrụ anya na ọ ga-alọta Nnewi taa bụ Tọzde.
Azubuogu nọbu na pati PDP, ebe o sonyere na ntuliaka imeụlọ maka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti.
Cheta na onye meriri ntuliaka imeụlọ nke ndị PDP bụ Valentine Ozugbo.
Mana Azubuogu hapụrụ PDP banye APC abalị olemole gara aga.

Dịka ndị nọ nso ebe ahụ siri kwuo, ndị omekome ahụ wakporo ụgbọala abụọ, otu 'Toyota Hilux', na otu 'Toyota Prado' sokọrọ ọnụ.
Otu onye n'ime ha gwara BBC Igbo sị, "Ha gbara onye na-akwọ ụgbọala Hilux egbe, ma kpụrụ onye nke nọ n'ime 'Prado' pụọ."

Odoghị anya ma onye ahụ a gbara egbe ọ nwụọla, o nweghịkwa onye ma ebe ndị ekperima ahụ kpụụrụ nwoke nke ọzọ gawa.
Ndị mmadụ kwukawa na nwoke ahụ bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị
Ya bụ ọdachi nke mere n'egbughị oge butere oke n'ọhịa, ngwere n'ụzọ, dịka ndị mmadụ nọ nsọ ebe ihe mere gbawara ọsọ ndụ ha.
Ndị 'unknown Gunmen' wakpokwara ogige ndị uweojii n'Ajali, Anambara steeti taa bụ Tọzde

Na nke yiri ibe ya, ndị bu egbe wakporo ogige ndị uweojii dị n'Ajali, dị n'okpuru Ọchịchị Orumba North, dị na Anambra steeti, gbaa ogige ha ọkụ n'etiti ụbọchị Tọzde.
O dobeghị anya ihe ha mebiri, mana akụkọ kwuru na ndị uweojii gbalagara oge ihe ka nte bakwuru nte n'ọnụ.
N'onyonyo e kesara n'akara whatsapp, a hụrụ otu onye tọgbọ n'ala mana o doghị anya ma onye ahụ ọ nwụrụ anwụ.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ntorobia obodo ahụ gbatara ọsọ bịa nye aka gbuwa mpio iji zọpụta ndị tọọrọ n'ụlọ ahụ na-agba ọkụ.
Akụkọ ka na-abịa.













