Ihe mere ọnwụ Chike Akunyili ji ewute anyị karịa - Ndị Agulu

Aha onyonyo, Ihe mere ọnwụ Chike Akunyili ji ewute anyị karịa - Ndị Agulu

Ụmụ Dọkịta Chike Akunyili apụtala katọọ ogbugbu nna ha na Nkpor n'ụbọchị Tuzde.

N'ozi nwa ya bụ Obumneme depụtara n'akara soshal mịdịa ya, o bere akwa arịrị maka ọnwụ nna ha, ma kwuo na ha nwere olileanya na ọnwụ papa ha agaghị ala n'iyi.

Ọ bụ ụmụ ya niile, nke gụnyere Dr. Ijeoma Akunyili, Dr. Edozie Akunyili, Dr. Somto Akunyili-Asuzu, Njideka Akunyili-Crosby, Chidiogo Akunyili-Parr, na Obumneme Akunyili binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ.

BBC Igbo gakwara obodo ya bụ Agụlụ, ebe ndị mmadụ kọọrọ anyị na obi adịghị ha mma maka ọnwụ Dkt. Chike Akunyili.

Ọnwụ papa anyị bụ ihe nnukwu mwute

Ebe foto si, Obumneme/Akunyili

Nkọwa foto, Ọnwụ papa anyị bụ ihe nnukwu mwute
Nna anyị bụ onye obi ọma

Ebe foto si, Obumneme Akunyili/Facebook

Nkọwa foto, Nna anyị bụ onye obi ọma
Nna anyị bụ onye obi ọma

Ebe foto si, Obumneme/Facebook

Nkọwa foto, Nna anyị bụ onye obi ọma
Nna anyị nwere ụmụụmụ itoolu, mana nke ịkpeazụ ọ hụbeghị anya mana ọ bara ya aha
Nkọwa foto, Nna anyị nwere ụmụụmụ itoolu, mana nke ịkpeazụ ọ hụbeghị anya mana ọ bara ya aha
Anya mmiri akwa ejula anyí n'anya
Nkọwa foto, Anya mmiri akwa ejula anyí n'anya