Ihe mere ọnwụ Chike Akunyili ji ewute anyị karịa - Ndị Agulu
Ụmụ Dọkịta Chike Akunyili apụtala katọọ ogbugbu nna ha na Nkpor n'ụbọchị Tuzde.
N'ozi nwa ya bụ Obumneme depụtara n'akara soshal mịdịa ya, o bere akwa arịrị maka ọnwụ nna ha, ma kwuo na ha nwere olileanya na ọnwụ papa ha agaghị ala n'iyi.
Ọ bụ ụmụ ya niile, nke gụnyere Dr. Ijeoma Akunyili, Dr. Edozie Akunyili, Dr. Somto Akunyili-Asuzu, Njideka Akunyili-Crosby, Chidiogo Akunyili-Parr, na Obumneme Akunyili binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ.
BBC Igbo gakwara obodo ya bụ Agụlụ, ebe ndị mmadụ kọọrọ anyị na obi adịghị ha mma maka ọnwụ Dkt. Chike Akunyili.

Ebe foto si, Obumneme/Akunyili

Ebe foto si, Obumneme Akunyili/Facebook

Ebe foto si, Obumneme/Facebook




