Duncan Mighty: Ihere kwesịrị ime ndị gọvanọ niile na-achị mpaghara 'South-South' na 'South-East'
Duncan Mighty bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa ekwuola na ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa enweghị ọgụgụ isi.
Nke a mere na ha amaghị ihe nwereike ime iji weta ọnọdụ enweghị ọrụ ndị ntorobịa n'isi njedebe.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'abalị Tusde, ma kwukwaa na ya "nwere atụmatụ nwereike ị na-ewebatara gọọmentị otu ijeri naịra (N1billion) kwa ọnwa".
Duncan Mighty, onye e ji 'Port Harcourt first son' nakwa 'Wene Mighty' mara, gara n'ihu kwuo na ịrụ okporoụzọ abụghị ihe gọvanọ kwesịrị iji na-eme ọnụ.
O kwuru sị: "Ọ jọgburu onwe ya na naanị ihe ndị gọvanọ ji etu ọnụ bụ ịrụ okporoụzọ."
"Mana ọtụtụ ndị ntorobịa nọ na-enweghị ọrụ, na-ebugharị egbe maọbụ na-eme yahoo yahoo."
"Ọ bụrụ na ndị ọchịchị nwere ọgụgụisi, naanị mpaghara 'entertainment' ezuola inye ọtụtụ ndị ntorobịa ezigbo ọrụ."

Lee ọkpụrụkpụ ihe ndị ọzọ Duncan Mighty kwuru na mparịtaụka a:
- Ezigbo aha ya bụ Duncan Mighty Wene Okechukwu. Okechukwu bụ aha nna mụtara ya
- Ọ bụ ndị ndị ntorobịa bi n'ime ogbe mmiri a na-akpọ 'creeks' nyere ya aha otutu ya bụ 'Port-Harcourt first son'
- Burna Boy, Timaya, Omah Ley na ndị ọzọ si na Port Harcourt pụta egosila na ndị ntorobịa mpaghara ahụ nwere akaraka mara mma
- Ọ bụ Duncan Mighty kpalitere mmasị iti egwu n'ime ndị na-eto eto na mpaghara anyị
- Ọ bụ ihe ihere na ndị gọvanọ niile chịrịla mpaghara ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, onweghị onye nwere ọgụgụisi iji 'entertainment' wulite ndị ntorobịa.
- Ọtụtụ n'ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa bụcha ndị ohi
Gbasara ndụ ya dịka mmadụ, o kwuru sị:
- Ọ bụ Chineke zọpụtara m n'aka nwunye m nke ochie dịka o chọrọ iji ọgwụ jigide m
- Anaghị m eche echiche ịlụ nwaanyị ọzọ ugbua
- Ụmụ m etochaala, ọ bụghị taa ka m bidoro ịmụ ụmụ
- Abụ m otu nwa. Naanị m ka nne m mụrụ
- Nne m rịara ọrịa ịgba ọbara ihe karịrị afọ iri na asatọ, nke a mere na enweghị ụmụnne ndị ọzọ
- Nna m so na ndị kwadoro m n'egwu a m na-eti ugbua, mana ọ dị mwute na ọ nọghị ndụ hụ oge ihe dịịrị m mma
- Ugbua ana m arụ ụlọọrụ TV na Port Harcourt. Etinyela m ihe karịrị nde naịra narị ise (N500 million) n'ime ya
Gbasara ọchịchị Naịjirịa, o kwuru sị:
- Ọ ga-aka mma ka Naịjirịa kewaa ka onye ọbụla gaa mezie ala nke ya
- Onweghị mpaghara Naịjirịa ọbụla agụụ ga-egbu ma e kewaa obodo a
- Ndị mpaghara Yoruba bụ ndị kacha nwee ọgụgụisi na Naịjirịa, n'ihi na ha na-akwalite ndị nke ha nke ukwuu
- Ọgụ na esemokwu dị n'etiti Rotimi Amaechi na Nyesom Wike bụ ihe mwute na ihe ihere nye ndị Ikwere
- Ikwere nwere gọvanọ nwee Mịnịsta, mana ha anaghị erite ha abụọ uru n'ihi esemokwu


