Unknown gunmen attack : E gbuola mmadụ abụọ n'Oguta, Imo steeti

Mkpu akwa na anyammiri bụ ihe na-afịọ n'obodo Ụmụakụ nke Ejemekwuru dị n'Ugwuta,Imo steeti n'ụzọ ụtụtụ Tozde dịka ndị a mabeghị ndị ha bu egbe gbagburu ndị nche abụọ.
Ụmụnne abụọ; Chijioke Nwaoza na Emeka Nwaozo na ndị ogbo ha nọ ọrụ nche obodo n'abali foro Tọzde(19/05/2021) oge ndị ji egbe bu ụgbọala wakporo ha ebe Elekere Abụọ nke ụzọ ụtụtụ taa,gbawa ha egbe.
Ndị nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na egbe ahụ tụrụ mmadụ abụọ n'ime ha, ha nwụọ, ebe ndị ogbo ndị ọsọ mere oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ.

Ebe foto si, Ezinaụlọ Nwaoza
Nwanne ha bụ Adindu Nwaoza kwuru etu Emeka sịrị nwụọ sị, "Ọ gara ebe ọ na-eche nche, ndị bu ụgbọala Hilux bata ebe ahụ gwawa ha egbe."
"Mgbọ tụrụ ya n'isi, ebe ahụ ka ọ nọ kubie ume."

Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu ndị nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu.
Mmadụ abụọ ahụ nwụrụ anwụ hapụrụ ụmụ isii, ụmụ isii tupu ha alaa mụọ.

Ebe foto si, Nwaoza
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Elkanah Bala kwuru na ọ nụbeghị maka ya bụ ọdachi man kwuo na ya ga-ajụ ese, ma nyeghachi BBC ozi mana o mebeghị nke a oge akụkọ anyị wepụtara akụkọ a.









