Chiwetalu Agu arrest: "Drama' m mere bụ ka a mara na ndị Igbo nọ ya

Ome ihe ejije ama ama bụ Chiwetalu Agu ekwuola na ihe mere ya ji mee anwansi mere o ji dabaa n'aka ndị Agha Naijiria bụ "ka a mara na ndị Igbo nọ ya".
Agu kwuru nke a n'Enugwu n'emume ndị otu ikọrọ ndị ihe ejije, a kpọrọ 'Actors' Guild of Nigeria' ngalaba nke Enugwu kpobaara ụbọchị Tọzde.
Agu kwuru sị, " Anyị bịara ịgwa ndị ọcha na ndị ojii na e nwere ndị a na-akpọ Ndị Igbo,ha bụ ọkụ na-acha- 'Rising Sun'".
" Anyị ga na-amụke ka ọnwa, ụwa a na-ahụ anyị."

Ọ gara n'ihu kwuo sị, "'Drama' (anwansi) ahụ m mere dị mkpa, ka ha mara na ndị Igbo nọ ya."
N'okwu o nwere mmerụ ahụ o nwetara n'aka ndị nwụchiri ya, Chiwetalu Agu kwuru na " "Site n' Upper Iweka rue 82 Division, rue ogige DSS, o nweghị onye metụrụ m aka."
" Ndị agha nile welitere isi chọrọ itinye onwe ya n'okwu a ka hana Chiwetalu Agu nwee ike kpakọọ."

N' inye ndụmọdụ etu udo ga-esi lọghachị naza Ọwụwa Anyanwụ, Agu kporo oku sị: "Onye na-achị ehi abazịla n'ọhịa ndị Igbo maka na ọ bụ ebe ndị mama anyị si eri."
"Onye ndị ọchịehi kpara n'ubi ya, ya gaa gwa ndị uweojii."

Mana Agu tụrụ arịrị na oge gara aga, na ndị kpesaara ndị uweojii na e mebiri ubi ha, na o nweghị ihe ha mere maka ya.
Chiwetalu Agu's arrest: Igbo, anyị hapụkwa be anyị, o ree ure - Patience Ozokwor

N'ozi ya n'ọgbakọ ahụ, Patience Ozokwor bụ onye ejije Nollywood a ma dịka 'Mama G' kpọrọ ndị Igbo oku ka ha malite igosi onwe ha ịhụnanya.
Mama G kwuru na nke a ga-eweta ọganihu mpaghara ahụ.

Ọ kpọkwara oku ka ha wetuo obi ma chọọ udo na mpaghara Owụwa Anyanwụ sị, "Anyị hakwaa be anyị, o ree ure."
Ọ dụrụ ụmụ Igbo, ọkachasị ndị na-eme ihe ejije ọdụ sị, "Buuru ihe ị chọrọ n'obi, na ụbọchị adịghị mma."
"Onye ọbụla nọọrọ nwayọọ, n'ihi na chi jiri eji ga-efo efo."

"Ndị Igbo hugodu onwe anyị tupu anyị kpewe ekpere ka ndị ọzọ hụ anyị n'anya."
"Anyị na-aṅụ ọbara onwe anyị, Igbo chọọnụ ọdịmma onwe ụnụ."
Ọ gara n'ihu too ndị ndu AGN maka mbọ ha gbara n'ịhụ na a tọhapụrụ Chiwetalu Agu.
Ihe Emeka Ike, Charles Okocha, Chinyere Wilfred na ndị ọzọ kwuru maka nnwụchi Chiwetalu Agu

Ebe foto si, Emeka Ike,Chiwetalu Agu, Chinyere Wilfred Harry In
Ọtụtụ ndị ihe ejije Nollywood akatọọla agwa ndịagha kpasara ogbo ha bụ Chiwetalu Agu bụ onye ha nwụchiri n'ụbọchị Tọzde maka iyi agwa Biafra.
N'ozi ha wepụtara n'akara soshal midia, ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ya bụ agwa bụ mkpagbu.
Onye bubụ onyeisi otu jikọrọ ndị n'eme ihe ejije a kpọrọ, "Actors Guild of Nigeria(AGN) bụ Emeka Ike sị na ọ bụ mkpagbu.

Ebe foto si, Emeka Ike
N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, Emeka Ike kpọrọ gọọmentị oku sị, "Tọhapụnụ ndị niile e ji eji maka nkwenye ha. Mkpagbu adịghị mma."
N'otu aka ahụ , Harry Anyanwu na-emekwa ihe ejije onye kpọrọ mere "ara" jụrụ ihe mere e ji nwụchie Chiwetalụ agụ.

Ebe foto si, Harry B Anyanwu/Instagram
Anyanwu gara n'ihu sị, "Olee mgbe ara a ga-ebi?"

Ebe foto si, Chinyere Winifred/Instagram
Chinyere Winifred bụkwa onye ejijie kwuru na akara Instagram sị, " Ihe nke adịghị mma."
Charles Okocha sị, "Ana m akatọ agwa adịghị mma a. Kedụ ihe Chiwetalụagụ mere. Aghọtaghị m ya ma ncha."

Ebe foto si, Charles Okocha/Instagram
Walter Anga tụrụ arịrị na ọ bụ "nwoke tinyerela ndụ ya niile n'ịkpa ndị mmadụ ọchị ọbụladị mgbe di biụlọ na-achụgharị ihe ezunaụlọ ya ga-eri" ka e mere ihe.

Ebe foto si, Walter Anga/Instagram
Cheta na ndị agha Naijiria nwụchiri ome ihe ejije Chwetalu Agu n'abalị asatọ nke ọnwa Septemba, afọ a (7/10/2021) maka iyi akwa Biafra.
Ndị agha boro ya ebubo na ọ na-enye otu a machiri amachi bụ Ipob nkwado mana mecha tọhapụya ụbọchụ 8/10/2021 nyefe ya n'aka ngalaba uweojii nzuzo bụ DSS.
Ihe anọ ị maghị maka Chiwetalu Agu, ọkpọka nwoke n'ihe ejije

Ebe foto si, Vinning Ogu
Chiwetalu Agu bụ onye ihe ejije Nollywood a ma ama maka ị na-ekwu okwu ọchị n'ihe onyonyo ọbụla o sonyere na ya.
O sonyela n'ọtụtụ Ihe ejije gụnyere: Things Fall Apart, Taboo, Wedding Party 2, The Catechist wdg.
O rietala nturuugo dị iche iche gụnyere nzere ọkaibe na ejije ọdinala n'afọ 2012 ('best actor in indigenous movie').
Ma lee ihe ndị ị maghị maka aka ochie ahụ na ewu na soshal midia maka akụkọ na ndị agha nwụchiri ya n'Upper Iweka, Ọnicha, ụbọchị Tọzde maka iyi akwa Biafra:

Ebe foto si, Vining Ogu
1. Ọ bụ ya na-anya onwe ya n'ụgbọala ya
A na-ahụta ya dịka oke mmọnwụ maka afọ ole ọrọnala na Nollywood nakwa ọtụtụ ihe ejije o sonyerela na ya nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ ya dịka nnukwu mmadụ.
Mana Chwetalu Agu anaghị eme ngala inwe ọkwọụgbọala na-akwọ ya. Ọ na-akwọ onwe ya aga ebe ọbụla ọ na-aga.
A na-anụ aha ya maka isonye n'ọtụtụ ihe.
2. Ụgbọala buru ibu dịka (bus maọbụ coaster) na-amasị ya

Ebe foto si, Screengrab
Ndị ogbo ya na-azụ obere ụgbọala mara mma nụdị dị iche iche mana ndị ma ochie dịke a bụ nwa afọ Enugwu steeti kwuru na ụgbọala na-amasịkarị ya bụ ndị nnukwu Bekee kporo 'bus' maọbụ 'coaster.'
3. Ụgbọala ya bụ ụlọ na-aga ije
O nweghị ihe na-adị n'ụlọ ị gaghị ahụ n'ime ụgbọala Chiwetalu Agu.
Ihe ị ga-ahụ n'ime ụgbọala ya gunyere; ite, oche, uwe, akupe, akpụụkwụ na ihe ndị ọzọ e ji ebi ndụ ya.
4. Ọ naghị eri nri na ya ahụla nri

Ebe foto si, Vining Ogu
Chiwetalu Agu na-ebi ndụ ya dịka onye nze;ọ na-ajụgbu ajụgbu tupu ya erie.
Ndị ma ya ọfụma kwuru na ọ naghị eri nri na ya ahụla nri dịka e rie ebe ha na-eme ihe ejije (set) ọ naghị eso eri nri e siri ndị ndị na-eme ihe ejije.
Onye ahụ achọghị ka akpọ aha ya sịrị, "Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji aka ya esi nrị ọ na-eri ebe a na-eme ejije."











