Rear Admiral Ndubuisi Kanu: Lee ka njem ikpeazụ Ndubuisi Kanu, gọvanọ onye agha chịrị Legọs na Imo steeti mbụ, si gaa

Ahụ Real Admiral Ndubuisi Kanu

Ebe foto si, BBC/Ndubusi Kanu's family

Taa bụ Fraide (15/10/2021) ka akwamozu ọchịagha na dike Igbo bụ Rear Admiral Ndubuisi Kanu kpọtụrụ n'Abia steeti.

Ndị nwere agba tụrụ n'ala n'obodo ya maka mmemme akwamozu nke malitere n'ụka 'Method Church Nigeria, dị n' Ohoroho Ovim 'Circuit', Dayọsịs Isuikwuato n'ụtụtụ.

Gladys Kanu, nwunye Ndubuisi Kanu,

Ha gụnyere Onyeisi ndị agha mmiri Naijiria; Osote Govanọ Ebonyi steeti bụ Eric Kelechi Igwe; aka chịburu Imo steeti bụ Ikedi Ohakim, Senatọ Enynnaya Abaribe, Abaribe, Aka chịburu Abia bụ Theodore Orji, Osote Gọvanọ Imo steeti bụ Prof Placid Njoku.

Ndí nwere agba bíara Akwamozu Ndubuisi Kanu

Ndị ọzọ bụ Minista na-ahụ maka igwe na ngwupụta ọnataarachi bụ Mines, Uche Ogah, Onye bụbu Onyeisioche otu PDP Abia bụ Emma Nwaka,na Onyeisi ndị ụka Methodist na Naijiria.

E nyere nchekwa chị ọkụ ebe e mere akwamozu ya dịka ndị agha mmiri na nke elu ala nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ juputara n'ogige ahụ.

Lee ka njem ikpeazụ Ndubuisi Kanu, gọvanọ siri gaa n'Abia ụbọchị Oktoba 14

Rear Admiral Ndubuisi Kanu

Ndị nwere agba n'Abia steeti na mpaghara dị iche iche na Naijiria pụtara n'ikem n'ikem dịka njem ikpeazụ Ọchịagha Ndubuisi Kanu kwụsịrị n'ọgbọ 'Micheal Okpara Auditorium' dị n'Ụmuahia, isiobodo Abia steeti, ụbọchị Tozde (14/10/2021).

Ụgbọala e jiri buru ozu Ọchịagha Ndubuisi Kanu
Nkọwa foto, Ahụ Ọchịagha Ndubuisi Kanu si Imo steeti ebe Gọọmenti steeti ahụ kwanyere ya ugwu ikpeazu n'abalị iri na atọ nke Ọnwa Oktoba bata Abia steeti

Ọchịagha mmiri Ndubuisi Kanu (Rear Admiral), aka chịburu Legọs na Imo steeti ochie nwụrụ n'abalị 13 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 ka ọ gbachara afọ 77.

Ahụ Ọchịagha mmiri Ndubuisi Kanu

Ọtụtụ agaghị echefu Kanu n'ihi ike ọ kpara dịka onye agha Naijiria, kama ọ gbara mbọ dịka onye agha Biafra n'oge Agha.

Gọvanọ Okezie Ikpeazu, nwunye Ndubuisi Kanu ndị isi ọchịchị Ikpeazu na ndị isi agha mmiri
Nkọwa foto, Gọvanọ Okezie Ikpeazu, nwunye Ndubuisi Kanu ndị isi ọchịchị Ikpeazu na ndị isi agha mmiri

Dịka Gọvanọ Okezie Ikpeazu siri kọwa, ọnwụ Kanu bụ nnukwu ihe furu ndị Abia na Naijiria gbaa gburgburu.

Nwunye Ndubuisi Kanu na Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia steeti

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka/Facebook

"Rear Admiral Ndubuisi Kanu bụ onye anaghị echefu ebe o si. ọ bụ onye kwalitere ndọrọndọrọ ọchịchị n'Abia steeti ma bụrụkwa onye ndụmọdụ nye ndị ndu steeti."

Ndí agha mmiri bíara akwa Ndubuisi Kanu

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka/Facebook

N'okwuchukwu ya n'ụka a kaara Kanu, Bishọpụ G.A. Agupusi, nke Dayọsịs Umuahia- East kọwara oku ka mmadụ nile na-aza onwe ha "ajụjụ kachasị mkpa" nke o kwuru bụ "Ị ga-eketa ndụ ebighị ebi?"

Akwamozu Ndubuisi Kanu

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka/Facebook

N'ofufenro ahụ, Osote Gọvanọ Abia steeti bụ Use Oko-Chukwu gụrụ ihe ọgụgụ site n'akwụkwọ Ecclesiastes 7: 1-4, 8-10.

Ahú Ndubuisi Kanu

Ndị biara mmemme ngwanyere ugwu ikpeazụ ahụ gụnyere aka chịburu Imo steeti bụ Ikedi Ohakim.

Etu o siri gaa n'Imo steeti n'Oktoba 13,2021

Hope Uzodimma na ezianụlọ Ndubuisi Kanu

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Nkọwa foto, Hope Uzodimma, oge ọ nabtara ahụ Ndubuisi Kanu

N'abalị 13 Ọktoba, 2021, gọọmentị Imo steeti kwanyere Ọchịagha Ndubuisi Kanu ugwu ikpeazụ site na ịgụgharị ọgbọ 'Heroes Square' aha ya.

N'ozi ya, Gọvanọ steeti ahụ bụ Hope Uzodimma kọwara Kanu dịka onye wetara mmepe obodo n'Imo steeti Ochie malite n'afọ 1976 rue 1977 bụ oge ọ chịrị dịka gọvanọ.

O toro Kanu maka iji ndị nhazi obodo (town planners) were hazie Imo steeti ma kewapụtakwu okpuru ọchịchị dị n'ime steeti ahụ ka o ruo iri abụọ na otu.

Ihe ndị i kwesịrị ị ma maka Ndụbuisi Kanu

Rear Admiral Ndubuisi Kanu

Ebe foto si, Abia Government

  • A mụrụ ya n'abalị atọ nke Ọnwa Novemba, afọ 1943
  • Ọ bụ onye agha Naijiria welitere isi mana o soro lụọ Biafra ọgụ
  • O nwere isi ọma na dịka Agha Biafra biri, a nabatakwara ya ọzọ n'Agha Naijiria.
  • A họnyere ya ndị isi ọchịchị 'Supreme Military Council' n'oge ọchịchị Murtala Muhammed n'afọ 1975
  • Ọ chịrị dịka gọvanọ agha Legọs steeti site n'afọ 1977 rue 1978.
  • Ọ chịrị gọvanọ agha Imo steeti ochie n'afọ 1976 rue 1977
  • O so na ndị welitere isi lụrụ ọgụ maka 'June 12' dịka otu n'ime ndị otu 'National Democratic Coalition (NADECO), bụ otu gbara mbọ ka e nye MKO Abiola ọkwa Onyeisiala dịka onye meriri na ntuliaka Juun 12, afọ 1993 nke ọchịchị Ibrahim Babangida kagburu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: