Ike Nwachukwu: Naijiria ugbua abụghị ihe m tụrụ anya - Ike Nwachukwu

Aha nkeananụānụ, 'Anyị chọọ ka obodo anyị dị mma, obodo a dị mma' Ike Nwachukwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Aka chị buru Imo steeti n'oge ọchịchị Ndị agha bụ Senetọ Ike Nwachukwu atụọla arịrị maka oke nkewa dị na Naijiria ugbua.

Nwachukwu, onye gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka dịka ọ gbachara afọ 80, kwuru na ọnọdụ nkewa dị ugbua abụghị ihe ọ tụrụ anya ịhụ.

"Ihe m tụrụ anya ịhụ bụ obodo e nwere udo, ọnụ na ọganihu."

O kwuru na nkewa dị na Naịjirịa ugbua abụghị ihe kwesiri kama na ndị ọbụla kwesiri ịhụ onwe ha ka nwaanne, agbanyeghị be onye si maọbụ okpukperechị onye ahụ.

"Ndị bụ ndị ala anyị ha abụ Igbo,Yoruba, Hausa, Fulani maọbụ Ijaw anyị niile ga-ahụ na anyị bụ otu, ka ọganihu dịrị mmadụ niile."

O kwuru na o nweghị ndị ga-emeli ya naanị ha.

Ọ tụrụ arịrị maka ọnọdụ enweghị ezi ụzọ, enweghị ọkụ, mmiri nakwa nsogbu ndị ọchịehi ma kwuo na "o nweghị nwa afọ Igbo amaghị ihe a ga-eme ga ala Igbo dị mma?"

Ọ sị, "kama ọ bụ mkpebi na nkwekọrịta idozi ala Igbo ga-eweta mmepe. Ọ bụ anyị ga-emezi obodo anyi mgbe anyị chọrọ".

Gee ihe o kwuru n'uju n'elu:

Buhari, Ikpeazu ekelela Ike Nwachukwu dịka ọ gbara afọ 80

Ọtụtụ mmadụ nwere agba gụnyere onyeisiala Naijiria ekelela Ike Nwachukwu maka ọrụ ọma ya na Naịjirịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Okezie Ikpeazu bụ Gọvanọ Abia steetị zigakwara Nwachukwu ozi ekele dịka ha gosiri na Facebook ha.

Okezie gara Nwachukwu mma maka ezi akaọrụ ya mgbe ọ nọ n'ọchịchị, ọkachasị mgbe ọ bụ onye Igbo mbụ na nke ikpeazụ rụrụ ọrụ dịka ọchịagha nke 'mechanized Division' dị na Kaduna.

N'otu aka ahụ, onye bụbu Gọvanọ Abia steeti bụkwa "Chief Whip" n'ụlọmeiwu ukwu bụ Orji Uzor Kalu kelere Nwachukwu maka ezi akaọrụ ya na nzọụkwụ ọhapụrụ n'ọrụ.

Kalu kwuru na ezi akaọrụ na ezi akparam agwa Nwachukwu gosiri onwe ya na ndụ ya.

Onye bụ Ike Nwachukw?

  • Ike Omar Sanda Nwachukwu bụ nwafọ Igbo sị amụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba nke 1940 na Port Harcourt.
  • Nwachukwu gara akwụkwọ na Ladi-Lak Institute dị na Yaba, Lagos nakwa City College dịkwa ebe ahụ.
  • Ọ gara ọzụzụ ndị agha na Nigeria Military Training College dị na Kaduna nakwa Royal Canadian School of Infantry, Warminster, United Kingdom.
  • O jikwaala ọtụtụ ọkwa na Naịjirịa dịka Gọvanọ Imo steeti (1984 -1985), Ọchịagha ukwu nke Divishọn mbụ nke ndị agba Naịjirịa ( Jan. 1990 - Sep. 1990), Mịnịsta mba ofesi nke Naịjirịa (Sept. Jan. 1993), Senatọ Imo Nọt (1999 - May 2003).
  • Ọ bụ Ike Nwachukwu bufere Imo State University, bụzị Abia State Univeristy ugbua Uturu, Okigwe bụ ebe ọ ka dị ugbua.
  • Ọ rụkwara ọrụ dịka Mịnịsta okwu ọrụ ndị n'aka site n'afọ 1986 ruo 1987.
  • Nwachukwu arụkwaala ọrụ dịka ka onyeisioche na Organisation of Afrcan Unity, Liberty Commitee, nakwa nke Council of Minister, nakwa ndị ọzọ.
  • Ọ nọchitekwala anya Naịjirịa na mgbakọ mbaụwa dị iche iche bụ nke gụnyere United Nations.
  • O ritakwara nturuugo dị iche iche na mbaụwa maka ezi ọrụ ya nke ụfọdụ n'ime ha bụ;
  • Grand Commander of Equatorial Guinea nke onyeisiala mba Equatorial Guinea nyere ya.
  • Federal Republic of Germany's Grand Cross of Merit (GMCS)
  • Grand Master of the National Order of the Southern Cross (GMSC) bụ nke onyeisiala mba Brazil nyere ya.
  • Diplomatic Medal (DMM) bụ nke onyeisiala mba South Koria nyere ya.
  • Grand Cruz de la Order dei Merito Civil de Espana (GCMC)
  • Knight Grand Cross of the Order of St Michael and St George (GCMG) bụ nke Queen Elizabeth nke abụọ nyere ya.
  • Commander of the Order of Mono (COM) nke onyeisiala mba Togo nyere ya.

Akụkọ ga-amasị gị