Ifeanyi Ubah: 'Ọ bụghi eziokwu na a wakporo m n'Alaba unyaahụ'

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah
Ifeanyi Ubah bụ onye ji ọkọlọtọ YPP azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti awụọla mmiri oyi n'akụkọ n'ekwu na ndi mmadụ chụrụ ya na ndị otu ya ọsọ n'ahịa Alaba dị na Legọs.
Maazi Ubah bụ onye na-eme achụmnta vootu n'ahịa dị iche iche na Legọs kemgbe izu ụka a gara ahịa Alaba n'ụbọchụ Tuzde.
Ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia na-egosi ebe ndị mmadụ na-agụ egwu na-eso ụgbọala a na-echi bu Ifeanyi Ubah n'Alaba.

Ebe foto si, Ifeanyi Uba Campaign Organisation
Ndị ahụ na-agụ egwu na-asị "Nnamdi Kanu bụ onye nzọpụta ọzọ".
Maazị Ubah gwara BBC Igbo na nke bụ eziokwu bụ na ndị bịara izute ya n'ahịa ahụ dịka o na-eme achụmnta vootu jụrụ ya ihe ọ na-eme maka aka Nnamdị Kanu e jị eji.
Onyonyo ọzọ gosikwara ebe o so ndị mmadụ agụ egwu na-eto Nnamdi Kanu n'Alaba.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ọ sịkwa na ha sị ya kwuo okwu banyere nwa amadi ahụ, nke ọ gara n'ihu mee dịka ha siri chụọ.
Ọ si na ya kwere nkwa na ya ga-ewere mkpesa niile gakwuru gọọmentị etiti.
Ọ sịkwa na ya gwara ha na a na-agba mbo n'azụ maka okwu Nnamdi Kanu.

Ebe foto si, Ifeanyi Uba Campaign Organisation
Kedụ ihe Ifeanyi Ubah na-eme na Legọs?
Ifeanyi Ubah agaala ọtụtụ ahịa dị na Legọs na-eme achụmta vootu.
Ọ na-asi ka ndị Anambara no n'ahịa ndị a lọta steeti ahụ bịa tuọ vootu na ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba.

Ebe foto si, Ifeanyi Uba Campaign Organisation
Ubah na Osote ya bụ Okey Eze so gaa na Ladipo Auto Parts bụ ebe ọ hụrụ ndị isi ahịa ahụ kpọrọ onwe ha Auto Spare Parts and Machinery Dealers Association (ASPAMDA).
Ubah kwere ndị ahịa ahụ nkwa na ọ ga-eme ka ahịa ha gaa n'ihu na-ebe ọbụna ha nọ ma ha tụnyere ya vootu.

Ebe foto si, Andy Uba campaign Organisation
Kepukepu anyị nụrụ na-ekwu na ndị mmadụ chụsara Ifeanyi Ubah na ndị otu ya mgbe ha gara ịchụ nta vootu na Alaba bụ ebe ha tụrụ ya mmiri dị n'akpa na okwute.
Mana ndị ọrụ Ifeanyi Ubah sị na nke ahụ abụghị eziokwu, na ha mere ịchụ nta vootu ha nke ọma.









