Anambra Election Update: Obiano tụkwasara osote ya bụ Nkem Okeke obi nke ukwu, mana ọ gharịpụla ya - Victor Oye

Nkem Okeke, Willie Obiano, na Victor Oye

Ebe foto si, APGA

Onyeisioche pati APGA bụ Victor Ike Oye ekwuola na obi adịghị ya mma etu osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Nkem Okeke si hapụ APGA wụfee APC.

Oye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels TV na mgbede Tọzde.

O kwuru na onweghị ihe ọbụla na-esere Gọvanọ Willie Obiano na osote ya bụ Okeke.

Victor Ike Oye
Nkọwa foto, Victor Ike Oye, onyeisioche APGA

"Obiano kpasoro Nkem Okeke agwa ọma, onweghị ihe kọrọ ya ụkọ," Oye kwuru.

"Onweghị nghọtahie ọbụla dị n'etiti ha abụọ. Onweghị onye mere ya ihe ọjọọ. Onweghị ụgwọ ọbụla e ji ya."

"Gọvanọ Obiano tụkwasara ya obi nke ukwu, ọ bụ ihe ọjọọ etu Nkem Okeke si gharịpụ Obiano ugbua."

Oye chetara oge Nkem Okeke mere akwamozu nna ya, nakwa etu o si kelee Gọvanọ Obiano maka enyemaka niile o nyeere ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya ma na Nkem Okeke ga na-akwa ngaramara maka ịhapụ APGA baa APC, n'ihi na onweghị ihe a ga-eji ya kpọrọ n'ebe ahụ..

Nkem Okeke, osote Gọvanọ Anambra steeti awụfeela APC

Buhari, Nkem Okeke na Hope Uzodinma

Ebe foto si, Ụlọọrụ Onyeisiala

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari, Dkt Nkem Okeke na Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma

Akụkọ na-efegharị ugbua na-ekwu na osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Nkem Okeke ahapụla pati 'All Progressive Grand Alliance (APGA) banye 'All Progressives Congress (APC).

Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma duuru Dkt Nkem Okeke gaa hụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja taa bụ Wenezde.

Aha onyonyo, Andy Uba bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti na Pati APC

Ọ bụ onye enyemaka mgbasaozi Buhari bụ Bashir Ahmad wepụtara ozi a n'ehihie taa.

Oge BBC Igbo kpọrọ Okelo Madukaife, bụ ọnụ na-ekwuru pati APC n'Anambra, o kwuru na "ebe ọ bụ na ọnụ na-ekwuru onyeisiala ekwuola ya, werenụ ya na ọ bụ eziokwu."

Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ naanị ụbọchị olemole tupu ụbọchị ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti eruo.

N'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba ka ntuliaka ahụ ga-adị.

Gịnị na-emezi n'APGA

APC

Ebe foto si, APC

Nkọwa foto, Ndị omeiwu isii n'Anambra steeti si n'APGA baa APC n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba afọ a

Nke a bụghị nke mbụ ndị welitere isi na pati APGA na-awụfe APC.

Cheta na ndị omeiwu isii n'Anambra steeti wụfere na APC n'ọdị nso a.

Ha gụnyere Nonso Okafor, Timothy Ifedioramma, na Cater Umeoduagu.

Ndị ọzọ bụ Lawrence Ezeudu, Arthur Chiekwu, na Edward Ibuzo.

Ihe Gọvanọ Obiano kwuru maka nke a

Willie Obiano

Ebe foto si, Willie Obiano/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Willie Obiano

N'izuụka gara aga, Gọvanọ Willie Obiano kwuru na nadị niile na-esi n'APGA abanye APC n'Anambra steeti bụcha ozi ka ha na-agara APGA.

O kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja oge ọ gara hụ Onyeisiala Muhammdu Buhari gbasara ọnọdụ enweghị nchekwa dị n'Anambra steeti.

Obiano kwuru sị: "Onweghị pati ọzọ dị n'Anambra, naanị APGA. Onweghị APC ọbụla dị n'Anambra."

"Ndị ahụ ụnụ hụrụ banyere APC bụ ego ka ha gara ịnara. A kwụrụ ha otu narị nde naịra (N100 million) n'otu n'otu."

"Ha ncha ka bụcha ndị APGA. Ha na-agbara anyị ama ihe na-eme n'ime APC."

Akụkọ ka na-abịa.