Emmanuel Ifeajuna: Etu o siri site na dike Naịjirịa bụrụ 'sabo' ndị Biafra

Ebe foto si, Imeobi Onitsha
Ọtụtụ ndị ntorobịa ugbua amaghị maka Emmanuel Ifeajuna nakwa ike ọ kpara n'egwuregwu ịwụlị elu Bekee kpọrọ 'high jump'.
Ifeajuna bụ onye Ọnịcha. Ọ bụ ọkaibe n'egwuregwu, onye agha Naịjirịa nakwa onye agha Biafra.
Ọ lụrụ nwaanyị n'afọ 1959, ma mụta ụmụ nwoke abụọ
N'anya ụfọdụ, Ifeajuna bụ dike bụrụkwa ọkaibe, mana n'anya ndị ọzọ, ọ bụ mma ihu abụọ. Gịnị kpatara nke a?
Ifeajuna: Ọkaibe n'egwuregwu

Ebe foto si, History and Facts Nigeria
Ihe mbụ aha Emmanuel Ifeajuna ji ewu ewu bụ maka egwuregwu 'sports' ebe ọ kpara ike ka Agụ.
O so na ndị nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi ịwuli elu 'high jump' n'egwuregwu 'British Empire and Commonwealth Games' nke afọ 1954.
N'ebe ahụ ka ọ nọrọ turu ugo ọlaedo, n'agbanyeghị na ọ gba akpụkpọ ụkwụ naanị n'otu ụkwụ were wụọ ya bụ asọmpi.
Nke a mere ka Ifeajuna bụrụ onye isi ojii mbụ si Afrịka nke ga-eturu ugo ọlaedo n'asọmpi egwuregwu mbaụwa.
Oge Ifeajuna lọghachiri Naịjirịa, a nabatara ya dịka dike ma tunyekwa ya ugo.
E mechara were onyonyo ya bipụta akwụkwọ nke ụmụaka praịmarị na sekọndịrị ji ede ihe.
Ifeajuna: Nwata akwụkwọ
Ifeajuna banyere Mahadum 'University College' dị n'Ibadan, n'afọ 1954.
Ebe ahụ ka ọ nọ zute ọtụtụ ndị a ma ama dịka: Christopher Okigbo, Chike Obi, Ben Obumselu na Uche Chukwumerije.
O nweara ọzụzụ na mmụta Sayensị, ma mechaa bụrụ onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị 'Ebenezer Anglican Grammar School, n'Abeokuta'.
Ifeajuna: Onye agha Naịjirịa

Ebe foto si, History and Fact Nigeria/Youtube screengrab
Dịka Naịjirịa nwetara nnwereonwe n'afọ 1960, Ifeajuna banyere n'otu ndị agha.
Oteghị aka, ọkwa ya gbalitere ruo 'Major' n'afọ 1966.
Ọ bụ n'afọ ahụ ka ụfọdị ndị agha - nke Ifeajuna bụ otu n'ime ha - weghaara ọchịchị na Naịjirịa site n'igbu ụfọdụ ndị ọchịchị oge ahụ.
Akụkọ kwuru na Praịm Mịnịsta Naịjirịa n'oge ahụ, bụ Abubakar Tafawa Balewa, nwụrụ n'aka Ifeajuna na ndị otu ya dịka ha nwuchiri ya.
Ifeajuna mechara gbaa ọsọndụ gbaga Ghana, mana o mechara a kpọghachi ya na Naịjirịa ebe a tụrụ ya mkpọrọ n'Uyo nakwa Enugwu.
Oge agha Biafra malitere, Ojukwu kpọpụtara Ifeajuna na mkpọrọ o wee sonyere ndị agha Biafra.
Ifeajuna: Onye agha Biafra

O teghị aka agha malitere a chọpụtara na Ifeajuna na ụfọdụ ndị agha Naịjirịa na-enwe mkparịtaụka.
Onyeisiala Biafra bụ Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu boro Ifeajuna na ndị agha atọ ọzọ ebubo na ha na-akpa nkata ịchutu ya n'ọkwa.
Mana Ifeajuna kọwara na ihe ya na ndị agha Naịjirịa na-akpa bụ etu a ga-esi ghara igbu ndị nkịtị.
Nkọwa a ejughi Ojukwu afọ, nke mere e ji maa Ifeajuna ikpe, ma gbuo ya.
Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke Sepụtemba 1967 ka Ifeajuna lara mmụọ n'ụzọ nke bekee na-akpọ 'firing squad'.














