Anambra governorship inauguration: Gọvanọ Willie Obiano o mezuru nkwa ndị o kwere?

Willie Obiano

Ebe foto si, Willie Obiano Facebook

Nkọwa foto, Idu n'iyi ọrụ nke Gọvanọ Willie Obiano n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị 2018

Gọvanọ Willie Obiano banyere ọchịchị Anambra steeti n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị 2014 mana o mezuru nkwa niile o kwere oge ọ banyere ọchịchị?

Gọvanọ Obiano chịrị Anambra steeti ugboro abụọ (nke ugboro abụọ ga-ebi n'ụbọchị 17 nke Maachị 2022), n'ime ọchịchị ya, ndị mmadụ nọ na-eche ka o mezuo ụfọdụ nkwa o kwere nke mere ha ji tụnyere ya vootu.

Ebe ụfọdụ ndị kwenyere na o mezuru nkwa ndị o kwere, ndị ọzọ na-ekwu na ọ chịtaghị aja na steeti ahụ n'ime afọ asatọ ọ nọ n'ọchịchị.

Ka anyị tulee nkwa ndị o kwere site n'afọ 2014 ruo 2021 mara ndị o mezuru na ndị o mezughi.

Gọvanọ Willie Obiano

Ebe foto si, Willie Obiano Facebook

Nkwa Gọvanọ Obiano kwere

Mgbe Obiano kwuputere ebumnobi ya maka ịbụ gọvanọ, o kwuru na "Ọ ga-amasị m ka Anambra steeti bụrụ ebe mbụ ndị mmadụ ga-achọ ịbịa tinye ego n'ịchụ ego ma bụrụkwa ebe azụmahịa na nrụpụta ihe ga na-aga ọkụ ọkụ."

Gbasara ọrụ ọ bịara ịrụ, o kwuru sị "M ga-ahụ na Anambra steeti bụ ebe dị mma ga-amasị ma ndị ụlọ ma ndị ama ịbịa maka ijiegoachụego."

O kwukwara sị "Ọ na-anụ m ọkụ n'obi ịrụ ọrụ, m ga-eburu ọrụ gọọmentị a na-apụ apụ (nke Peter Obi) rụfọrọ wee gaa n'ihu iji wee gbanwee steeti a ma buruo ya ogogo o tozuru ịnọ na Naịjiria nakwa Afrịka."

"Iburu ihe Gọvanọ Obi rụfọrọ gaa n'ihu ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ gọọmentị m."

"M ga-eburukwa atụmatụ ọrụ Anambra Integrated Development Strategy (ANIDS) gaa n'ihu, nke ga-eme ka ọrụ mmepe obodo na-eme ugbua mere na-aga n'ihu."

Atụmatụ 3C

Gọvanọ Obiano kwuru na ọ ga-eji atụmatụ ọ kpọrọ "Continue, Complete and Commission (3Cs)" nke pụtara iburu gaa n'ihu, Ịrụcha nakwa Ịkpọpe ọrụ a rụrụ, wee malite ọchịchị ya.

N'ime 3C a, Obiano kwere nkwa gụnyere ịrụcha ihe karịrị ọnụụlọakwụkwọ praịmarị ruru 1500, ịrụcha ụfọdụ ọnụụlọakwụkwọ na mahadum Anambra steeti dị n'Ịgbarịam na Uli, nakwa ụlọakwụkwọ nkuzi nke Nwafor Orizu Nsugbe, na nrụgharị ụfọdụ ụlọakwụkwọ.

O kwekwara nkwa ịrụcha ihe karịrị kilometa ụzọ 300 na steeti ahụ, ịrụ akwammiri na mpaghara dị iche iche, itinye ọkụ nakwa ịmetụtu aka n'okporoụzọ Ojukwu dị n'Ọnịcha.

O kwere nkwa imezi nakwa ịrụ ụfọdụ ọnụụlọ ọhụrụ n'ụlọakwụkwọ ọzụzụ ndị Nọọsụ dị na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ.

Ihe ndị o mezuru

Ka ọ banyechara ọchịchị, Gọvanọ Obiano wepụtara atụmatụ ọ kpọrọ 'four pillars of development' na Bekee.

Atụmatụ ahụ bụ nke o kwuru ga-elekọta ụzọ ihe anọ n'atụmatụ ya iwulite steeti ahụ.

Ha gụnyere: 1) Iji ngwa igwe arụ ọrụ ugbo (mechanized agriculture); 2) Mmanụ agbịdị na gaasị 3) Azụmahịa 4) Nrụpụta ihe

Ọrụ ugbo:

Otu ebe ndị Anambra kwenyere na Gọvanọ Obiano mere ezigbote ọfụma bụ n'ihe gbasara ọrụ ugbo.

Ọ batara ọchịchị buru ya n'isi dịka o kwere na nkwa.

Ihe ndị a gụnyere ime ka ọ dịrị ndị ọrụ ugbo mfe igbazite ego ha ji akọ ugbo, inye ụfọdụ ego n'efu maka ọrụ ugbo, ịzụta ngwaọrụ wgdz.

Azụmahịa:

Ahịa Main Market Ọnịcha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akụkụ ahịa Main Market Ọnịcha gbara ọkụ n'ọnwa Ọktoba 2019

Anambra bụ steeti e ji azụmahịa mara nke ọma.

N'afọ 2019, ngalaba World Bank gụnyere Anambra steeti n'ime steeti ise ebe azụmahịa na-aga were were.

N'ọnwa Ọgọstụ 2021, Osote onyeisiala Yemi Osinbajo gara gbapee ụlọmmepụta ihe (ebe akụkpọ ahụ dị n'Ogbunike), na igwe ọkụ nke a rụrụ n'Ọka, nke Gọvanọ Obiano wuru na steeti ahụ.

Njem:

Ebe afọ 2014 - 2017, Gọvanọ Obiano buputere ihe ruru ụgbọala 200 na bọọsụ 40 a ga-eji na-ebu ndị njem aga Ọka-Ọnịcha, Ọnịcha-Nnewi nakwa Ekwulobia, na-anarughi ha ego ole ndị ụgbọala ọzọ na-ana ha.

Ụgbọala ahụ gbara ihe dị ka naanị afọ atọ tupu a kwụsị ịhụ ọtụtụ n'ime ha n'ụzọ.

Mana ọ na-abụ a gụrụ gụrụ, a hụ otu maọbụ abụọ n'ime ha.

Ụgbọala Gọvanọ Obiano
Nkọwa foto, Ụfọdụ ụgbọala bọọsụ ahụ ka na-agba n'okpuru Tracas ma a gụrụ gụrụ

Ndị bi na steeti ahụ kwuru na ha amaghị ma ọ bụ elekọtaghị ya ọfụma mere ka ha mebie ọsịsọ.

Ọ rụkwara ụfọdụ ebe ndị mmadụ na-anọ ezere anwụ/mmiri n'ụfọdụ mpaghara Anambara steeti.

Mwulite obodo:

Obiano wepụtara atụmatụ ebe o kenyere obodo ruru otu narị na iri atọ (130) ihe ruru naịra nde iri abụọ (N20m) iji wulite obodo ha n'atụmatụ ọ kpọrọ 'choose-your-project'.

Ọ gwara ha họrọ ọrụ gụnyere nrụgharị ebe nlekọta ahụike, ebe ndị na-efe ala nna na-ebi nakwa ebe ọgbakọ ndị obodo (civic center).

Ọ gwara ha hapụ ịrụ ụzọ ọbụla n'ihi na ọrụ dị n'ụzọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị.

Otu ihe ndị Anambra agaghị eji echefu Obiano bụ ọdọụgbọelu ọ na-arụ n'Ụmụeri.

Aha onyonyo, Anambra State Airport: N'Aba ka e si nweta ngwa ọrụ e ji rụọ ọdọụgbọelu a

N'agbanyeghi na a rụchabeghi ya, o mere ihe ịtụnanya mgbe ụgbọelu feturu ebe ahụ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Epreelụ 2021.

Ọzọ bụ ọgbọegwuregwu ọ na-arụ n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ, akwa atọ ụgbọala na-agba n'elu ya (flyover maọbụ bridge) nke otu n'ime ya dị n'Ọka, nakwa ụlọọgbakọ nke a kpọrọ International Conference Center.

Akwammiri dị n'Ọka

Ọ rụkwara akwammiri nke Aguleri Uno-Aguleri Otu, bụ nke a na-ekwu bụ akwammiri tokarịchara ogologo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Mana ọ dawasịrị isi n'ihe gbasara mgbape mmiri pọmpụ o kwere nkwa ya n'Ọnịcha. Nke Ọka anaghịkwa arụ ọrụ.

Mana o meziri nke Obizi, Ụga na nke Otuọcha.

Nchekwa:

Kemgbe ọ banyere ọchịchị, nchekwa so n'otu ihe chere Gọvanọ Obianọ aka mgba dịka ụkpana osu ọkpọ.

Ozubulu attack

Ka ọ na-erubeghi otu afọ ọ banyere ọchịchị, e budatara ụfọdụ ndị oyi ndụ egwu Boko Haram a nwụchiri anwụchi ka e tinye ha n'ụlọmkpọrọ dị n'Ekwulọbịa; Obiano gbara mbọ hụ na a kpọpụrụ ha na steeti ahụ dịka ọ hụrụ etu ụjọ si jide ndị Anambra n'ihi nke a.

Na mmalite ọchịchị ya, Obiano busoro ndị ntọ, ndị aka n'akpa, ndị ohi na-akpa mkpamkpa n'Anambra agha.

Nke a mere ka ndị Anambra nwee ike imechi anya ha abụọ ma ha laba ụra n'abalị, ma mee ka ndị na-agba oringo nwee ike ịpụ n'abalị gaa kporie ndụ bata.

O nyekwara ndị agha mmiri ihe ruru ụgbọmmiri iri na ise n'ọnwa Septemba 2015, maka nchekwa obodo ndị dị nso mmiri.

Mana ọ bịara dị ka mberede e mechara nyịa dike.

Nso nso a, nsogbu nchekwa bịara tọdo Anambra n'akpịrị dịka ndị omekome a na-akpọkarị 'unknown gunmen' bịara na-egbu ndị mmadụ aghara agahara na steeti ahụ.

Agaghị echefu ọsịsọ mgbe ọsọ gbara n'Ịgbarịam dịka e gburu ụfọdụ ndị Ugwu bi ebe ahụ.

Ụmụakwụkwọ bi n'ogbe ahụ gbara ọsọ ndụ n'ihi na ha amaghị ma a ga-abịa ịbọ ọbọ.

Ndị omekome na-awakpokwa ma na-egbu ndị ọrụ nchekwa; ha wakpokwara ụfọdụ ụlọọrụ gọọmentị gụnyere nke ndị na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (INEC).

Agụmakwụkwọ:

Ụfọdụ ndị Anambra chakere n'ihe gbasara agụmakwụkwọ n'ọchịchị Gọvanọ Obiano.

Ọ bụ n'oge ọchịchị ya ka ụmụakwụkwọ si na steeti ahụ ritere nturugo na teknụzụ na mba Amerịka nke a kpọrọ 'Technovation'.

Aha onyonyo, Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis

Ọ hụkwara na a na-azụ ndị nkuzi n'ihe gbasara mmụta teknụzụ.

Gọvanọ Obiano ji pasentị 15 bulie ụgwọ ọnwa ndị nkuzi na steeti ahụ, n'agbanyeghi na o kwebeghi akwụ ụgwọ opekatampe gọọmentị etiti tinyere.

Ọ naghị ejikwa ụgwọ ọnwa, dịka ndị na-arụ ọrụ na steeti ahụ si kwuo.

Ọ naghị ada n'ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ n'ụbọchị 25 nke ọnwa ọbụla.

Ụzọ:

Ụzọ gọọmentị Anambra steeti rụrụ

Ebe foto si, Anambra government

Ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ na-ekwu na ọ bụrụ na gọọmentị Gọvanọ Obiano gbara mbọ rụọ ụzọ kpọrọ akpọ n'obodo atọ bụ isiobodo na steeti ahụ (Ọka, Ọnịcha na Nnewi), na ọ gaara abụ onye a ga na-aja dike.

Mana ebe ọ kacha rụọ ya bụ ụzọ bụ n'ebe ndị e nwere ike ịkpọ ime obodo.

Gọọmentị Anambra wepụtara ebe ndị ha rụrụ ụzọ na steeti ahụ, dịka o kwuru na ọ rụrụ ihe karịrị ụzọ kilomita otu narị (100) ebe ahụ.

Ahụike:

O melitere ihu ụfọdụ ụlọọgwụ dịka nke Onitsha General Hospital na nke Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu 'University Teaching Hospital' dị n'Ọka.

O wepụtakwara atụmatụ gọọmentị ji adọnyere ndị mmadụ ukwu n'ịkwụ ụgwọ ahụike nke ọ kpọrọ 'Anambra State Health Insurance Scheme' (ASHIS) nke 'Anambra Health Insurance Agency' (AHIA) na-elekọta.

Nke a mere ka ndị Anambara ọbụla nọ n'okpuru atụmatụ ahụ nwee ike ịkwụ naanị puku iri na abụọ (N12,000) kwa afọ iji nata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ọbụla.