Unknown Gunmen Anambra State: Etu ndị ojiegbe siri gbuo mmadụ atọ n'Oba, Anambra State

Onye bu egbe

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-ekwu na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola mmadụ atọ n'Oba, n'okpuru ọchịchị Idemili South, Anambra steeti.

Onyonyo gbasara nke a na-efesa na soshal midia, mana BBC Igbo amatabeghị kpọmkwem ihe merenụ.

Ndị sere onyonyo ahụ sị na ya bụ ihe mere n'okporo ụzọ a na-akpọ 'Oba new road', n'ihu ebe a na-ere mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'De Base Filling Station'

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Toochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha anụla maka ọgbaaghara dapụtara n'Oba, mana ha amabeghị kpọmkwem ihe merenụ nakwa etu o si mee.

"Nyetụ m obere oge ka m nyochaa ya, aga m ezighachitere gị ozi," Ikenga kwuru.

BBC kpọtụkwaara otu onye Oba, o wee kwuo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.

O kwuru sị: "Ee, anyị hụrụ ihe a mere n'Oba taa bụ Satọdee, a gbagburu mmadụ abụọ n'Oba, gbagbukwa otu onye n'Ojoto."

"Mana onye ehụ a gbagburu n'Ojoto bụkwa onye Oba, ọ bụkwa n'otu ogologo iro ka ya bụ ihe mere."

Oba

Cheta na Oba na Ojoto bụ obodo abụọ dịdebere onwe ha nso, otu ogologo okporo ụzọ jikọrọ obodo abụọ a.

Oge anyị jụrụ ya ndị o che na ọ bụ ha mere mwakpo, o kwuru na "Ọ bụghị ndị ohi mere ya bụ ihe."

Ogbugbu mmadụ akarịala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Samuel Ndubuisi

Ebe foto si, Facebook/other

Nkọwa foto, Ndị egberima gbagburu Samuel Ndubuisi n'Enugwu n'ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị 2021

Mpaghara ọwụwa Anyanwụ aghọọla ebe akụkọ igbu mmadụ na-abụzi kwa mgbe kwa mgbe.

Si n'Enugwu gaa Imo, pụta Anambra, otu ihe ahụ na-afịọ.

Onwebeghị ndị ma kpọmkwem ndị na-akpa arụ a, maka nd dịka ọtụtụ si ekwu, ọbụghị ndị ojiegbe ezu ohi na-eme ya bụ ihe.

Ndị ekperima a na-awakpo ma ndị uweojii, ma ndị agha ma ndị nkịtị.

N'abalị ise nke ọnwa Julaị, ndị ekperima Igbagburu Ifeanyi Okeke, onye nwe ụlọọrụ AutoEase n'Enugwu.

Ka abalị abụọ gachara, ndị ojiegbe gbagbukwara Onye bụ Ọkammụta Samuel Ndubuisi ndị ekperima gbagburu ụnyaahụ?, bụ onyeisi ngalaba 'Scientific Equipment Development Institute' (SEDI) n'otu Enugwu ahụ.

N'Imo steeti, n'abalị olemole gara aga, ka ndị amaghị ndị ha bụ gbupụrụ ụmụnwoke abụọ isi n'Orlu.

N'ime abalị ụbọchị Fraịde, Julaị 31, ndị ekperima wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii n'Umuaka, Njaba, Imo steeti.

Ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ebola ebubo na ọ bụ ndị otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ IPOB, na-akpa mkpamkpa niile a.

Mana IPOB agọọla ma kwuo na aka ha dị ọcha.