Two Human Heads in Imo: Etu ndị ogbu isi siri gbupu ụmụnwoke abụọ isi n'Orlu

Ahịa Orie Okporo dị n'Ọlụ,Imo steeti
Nkọwa foto, Ndị omekataraihedaaụjọ gburu nwoke abụọ bepụ ha isi ma dowe isi ha n'elu okpokoro n'ahịa Orie Okpoko dị n'Ọlụ, Imo steeti

Obodo Orlu ka na-ede jiji dịka ndị a maghị ndị ha bụ gbupuru ụmụnwoke abụọ isi ma dowe isi ha n'ọma ahịa Orie Okpoko dị n'Okpuru ọchịchị Ọlụ, Imo steeti.

Ndị mmadụ tetara n'ụra ụbọchị Wenezde (28/7/2021) hụ isi Felix Okechukwu na Bierechukwu Udemba n'el tebulu dị n'ahịa Okporo, Ọlụ.

Felix Okechukwu (dị afọ 70) bụ onye ndị mmadụ na-ekwu na o nwere nkwuwaokwu n'obodo, ebe Bierechukwu bụ onye otenkwụ.

Onye ntaakụkọ anyị gara n'ezinaụlọ Biereonwu nke Amanato Okporo dị n'Ọrlụ, ọ hụrụ ndị na-apụ na-abata dịka ndị mmadụ na-abiara ha mgbarụ.

Otu n'ime ụmụ Udemba bụ nwata akwụkwọ nọ oge o mere gwara BBC Igbo na " Ha bịara na-akpọ nna m oku n'ime abalị, ya pụta ịjụ ha ihe mere ha ji akpọ ya, ha gbaa ya egbe n'obi ọ daa."

Nwatakịrị ahu kwukwara na ya gbapụtara n'ime ụlọ hụ ihe na-eme na ndị ahụ pịara ya mma ha ji ugborogboro.

Nwunye ya bụ Ifechinachi Biereonwu sịrị na ya amaghị ndị bịara ije ahụ.

Ahịa Okporo dị n'Ọlụ,Imo steeti

"Ọ bụrụ na di m matara na ndị ahụ bụ ndị bịara igbu ya egbu, na ọ gaara agba ọsọ ndụ ya."

"Ọ hapụsịrị ụmụ, lawa. Chukwu nna ka anyị na-arịọ ka ọ bịa nyere anyị aka na-zụ ụmụ aka."

Ezinaúló Biereonwu

Ka ọ dị ugbua, e emela emume olili Udemba na ngwuru ya.

Otu onye okenye obodo ahụ bụ onye ma ebe ihe mere si na udo agbaala ọzọ n'obodo Okpoko na obodo ndị ọzọ dị n'Ọlụ n'ihu oke ogbugbu mmadụ nakwa ndakpọ nchekwa.

"A na-agbasi egbe n'ehihie abụọ. Ọ kụhala Elekere Ịsii nke mgbede, onye ọbụla alakpuo n'ihi egwu."

O kwukwara na ndị eze na mpaghara Ọlụ agbachaala ọsọ n'obodo ha n'ihi ihe na-akpọtụ ma rịọ gọọmentị Imo steeti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka inyopụta ndị na-akpa mkpamkpa na mpaghara ahụ.

Oge BBC kpọburu ndi uweojii steeti ahụ, onye nnyemaka Komishona Uweojii Imo bụ Abata kwuru na ha ka na-enyocha ime mere.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: