Insecurity in the South East: Onye bụ Ọkammụta Samuel Ndubuisi ndị ekperima gbagburu ụnyaahụ?

Samuel Ndubuisi

Ebe foto si, Facebook/other

O weela anya ugbua na ya bụ nwaamadị agbagburu n'okporoụzọ awara awara sị Enugwu gawa Pọtakọtụ bụ Ọkammụta Samuel Ndubuisi ụnyaahụ.

Njiji jiri n' Amaechi dị n'Enugwu n'etiti mgbede, ebe elekere anọ nke mgbede Wenezde dịka ndị ji egbe amaghị ndị ha bụ gbagburu otu nwoke aha ya bụ Ọkammụta Samuel Ndubisi.

Ndubisi ji ụgbọala na-eji oji akara njirimara ya bụ SEDI 26D-02 FG na onye uweojii na-eche ya nọ na njem na nso Centenary Estate n'ebe Amaechi Flyover oge chi jiri ehihie jikwudo ya.

Ụgbọala bu Ọkamụta Ndubuisi

Ebe foto si, Facebook other

Nkọwa foto, Ụgbọala bu Ọkammụta Ndubuisi

Onye bụ Samuel Ndubuisi?

Nwaamadị bụ onye Mgbowo dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ nke Enugwụ Steeti.

Ọ bụbu onyeisi Bekee kpọrọ Dean nke ndị Faculty of Engineering, Enugu state University of Science and Technology (ESUT)

Ndubuisi bụ onyeisi ụlọọrụ ndị Scientific Equipment Development Institute (SEDI), Enugu, tupu agbagbuo ya.

SEDI bu ngalaba gọọ,metị etiti Naịjirịa nọ n'okpuru ngalaba Bekee kpọrọ "National Agency for Science and Engineering Infrastructure" (NASENI).

Otu onye ezinụlọ ya gwara BBC Igbo na ugbua ndị be ha amaghịdị ihe ha ga-ekwu.

Ọ sị: "Nwunye ya nọ ebe a, ndị ụmụnna na ndị ọzọ. O nweghịdị one ma ihe ọ ga ekwu."

Dịka ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Ndukwe siri kwuo, "A gbara egbe taa bụ 07/07/2021 ebe elekere anọ nke ehihie n'Okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọt nke tara isi nwoke na onye uweojii na-eche ya."

Ndukwe kwuru na ndị uweojji steeti ka na-eme nnyocha , na ha ga-agwa ọha ihe ha chọpụtara dịka eziokwu na-apụta ihe.

Ka ihe ndị a na-eme onye omeiwu na-anọchite anya Enugwu West bụ Tobi Okechukwu e hibela atụmatụ ndị uweojii ga-eji mee nchọpụta etu e siri gbuo Ọkammụta Ndubuisi.

Dịka ọ na-ekwupụta atụmatụ a, Maazị Okechukwu sị na nchekwa ndụ mmadụ nakwa akụnụba dị gọọmentị n'aka.

Ọ sị na nsogbu dị karịrị gọọmentị Enugwu aka.Maazị okechukwụ sị na nwụchi ndị kpara ike a ga-enye aka gbochie ndị ọzọ na-enye obodo nsogbu site n'ịmị̄ ajọ ihe.

Ndị omeiwu nabatara mkpebi ahụ oge Femi Gbajabiamila bu onyeisi ndị omeiwu nta sị ka eji ọnụ tụọ vootu banyere ya.

Ngalaba na-ahụ maka ihe metụtara ndị uweojii n'ụlọ omeiwu bụ ndị a sị ka ha na ndị uweojii kpaa maka etu a ga-esi nwụchie na taa ndị kpara arụ a ahụhụ.

Akụkọ ga-amasị gị