Nnamdi Kanu: Aka anyị adịghị na mkpọlata ya na Naịjirịa - Kenya

Ebe foto si, Kenya High Commission
Mba Kenya agọrọla aka na ụkwụ ha na nnwuchi nakwa ịkpọnye Naịjirịa Nnamdi Kanu, bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe a kpọrọ indiginous People of Biafra (Ipob) bụ .
Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na Kenya Bekee kpọrọ Kenyan High Commissioner bụ Wilfred Gisuka Machage kwuru nke a.
Maazị Machage sị na akụkọ na aka Kenya dị n'ihe mere Nnamdi Kanu bụ "asịrị gbakaa ute".
O kwuru ka ndị na-ebo Kenya ebubo a wete akaebe.
Maazị Machage na-ekwu okwu dịka ọ na-asa ebubo nwanne Kanu boro na ọ bụ na Kenya ka a nọ nwuchie ya.
Onye nnọchite anya Kenya a sị na mba ahụ agaghị etinye aka maọbụ tinye anya n'ihe na-eme na Naịjirịa.
Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Buhari mere ka BBC mata na ha achọghị ikwu mba a nọ nwuchie Maazị Kanu.
Ọ sị na ihe ka mkpa bụ na aka ha akparala nwaamadị a gbara ọsọ kemgbe afọ 2017.
Kenya bụ mba nke abụọ gọrọ agọ na aka ha adịghị n'ihe na-eme.
Nke a na-abịa dịka mba UK gọchara n'aka ha adịghị na ya.
Akụkọ ga-amasị gị:













