Nasir El-Rufai: Obi dị m nnukwu ụtọ na-anwụchiri Nnamdi Kanu- El-Rufai

Nasir El-Rufai

Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai ekwuola na obi dị ya pọlina pọlịna na nnwụchi Gọọmentị Etiti nwụchigharịrị Nnamdi Kanu,onye ndu otu nnwereonwe a kpọrọ "Indigenous People of Biafra"( Ipob.)

El-Rufai kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Pidgin nwere ụbọchị Fraide.

O kwuru na obi dị ya nnukwu ụtọ n'ihi na Kanu metara ihe e ji kpụrụ ya site ịgba ọzọ oge ikpe ya dị n'ụlọikpe nakwa ibute tigbuo zọgbu n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.

"Obi tọọrọ m ụtọ rinne ka a nwụchiri Nnamdi Kanu n'ihi ihe abụọ; Ọ nọ n'ikpe, gbaa ọsọ. O tinyere ndị kwudoro ya mere e ji tọpụ ya na nsogbu mgbe ọ ọgbara ọsọ."

"Ọ rapụtara ndị dịka Abaribe n'ihe na ọ bụrụ na ọkaikpe chọrọ, ọ gaara akpụrụ Abaribe tinye na mkpọrọ n'ihi na ọ bụ ya soro na ndị kwudoro Kanu dịka iwu sịrị dị."

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook

"Ọzọ, Onye na-agba Naijiria mgba okpuru; ọ na-akpọ ndị mmadụ oku ka ha mụnye ogige ndị uweojii ọkụ, wakpo ụlọmkpọrọ ma tọhapụ ndị e ji eji, na-akpọ kwa oku ka e gbuo ndị agbụrụ ndị ọzọ."

" Ọ na-akpọ obodo ya bụ mba o ji akwụkwọ ha gawa ala Bekee, ụlọ anụọhịa."

"Kedụ ka ị ga-esi nọrọ na mba ọzọ, na-akpọ oku agha n' azụ ụlọ gị?"

"Ọ bụrụ onye ma ihe, o buru agha gawa ebe ọzọ"

"Ọ bụ ihe dị mma na Gọọmentị Etiti ji ụzọ kwesịrị ekwesị , jiri ndị uweojii mbaụwa 'Interpol' were jide ya."

" Ana m ekele Gọọmentị Etiti Maka ihe ha mere. Ha agbalị ka."

Ọ sị na-ọka mma ka Kanu zara ọnụ ya n'ụlọikpe, ọ bụrụ ụlọikpe hapụ ya, mma, ha ma ya ikpe, ọ dị kwa mma.

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe a e mere Kanu bụ "ihe nkuzi nye otu ndị niile na-eti mkpu nwere onwe bụ ndị na-akpa nkata ịkwatu gọvenment Naijiria".

N'ajụjụ ma anya ya adị n'ịzọ ọkwa Onyeisiala maọbụ Osote ya, El-Rufai kwuru na uche ya adịghị na ya.

" Lee ka ntụtụisi m si chaharịa bụrụ isi awọ, mgbe e duru m iyiọrụ, isi m na-eji oji. Nke a kabụkwa naani ọkwa gọvanọ."

"Ọrụ Onyeisiala bụ ọrụ taara akpụ nye onye dị afọ 62 ka m."

O teela ndị mmadụ nyowere na m chọrọ ịzọ ọkwa Onyeisiala kemgbe afọ 2016 nke mere ha ji akpọ m aha ọjọọ dị iche iche mana o nweghị ọsọ ọkwa ọbụla m na-agba."

"Ọ ka mma ka ọkwa onyeisiala gaa Ndịda Naijiria."