NasirEl-Rufai: Gịnị na-esere gọvanọ Kaduna na otu NBA?

Nasir El-Rufai, Paul Usoro

Ebe foto si, Nasir El-Rufai, Paul Usoro/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe abalị abụọ gara aga, otu jịkọrọ ndị ọkaiwu na Naijirịa bụ 'Nigerian Bar Assocation' (NBA) na aka na- achị Kaduna steeti bụ Nasiri El-Rufai na-eme tụmsara banyere oku ha kpọrọ El-Rufai ka ọ bịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha.

Nke bụ n'ihi na ndị isi otu ahụ wepụrụ aha El-Rufai n'ime ndị ga-ekwu okwu n'ọgbakọ NBA nke bụ nnukwu ọgbakọ ha na-enwe kwa afọ nke ga-abịa malite abalị 26 nke ọnwa Ọgọst ruo abalị 28 nke Ọgọstụ, afọ 2020.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mkpebi ndị ndu NBA bịara ka ọtụtụ ndị otu ha horo ntutu ha taa sị na ọ bụrụ na ndị isi ha nye El-Rufai ohere ịbịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha, ha onwe ha ga-agbagha ya bụ ọgbakọ.

Iwe ha bụ na ha na-ebo Gọvanọ El-Rufai ebubo ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrụ n'ihe gbasara ndị mmadụ a na-egbusị na 'Southern Kaduna'.

Mkpebi ahụ rụrụ El-Rufai afọ nke mere o jiri saa NBA site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Muyiwa Adekeye sị na mkpebi ahụ kwadoro ukwu "n'olu otu onye", na ha enyeghị ikpemkwụmọtọ maọbụ ịnụrụ olu ọzọ tupu ha ekpebie ihe ha kpebiri.

Ọ gara n'ihu kwuo sị "n'agbanyeghị mwepụ ndị NBA wepụrụ m dịka onye ga-ekwu okwu n'ọgbakọ ha, o gbochighị m ị ga n'ịhụ itinye olu m n' ihe ga-ebute ọganihu Naijirịa".

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ndị Ọkaiwu ụfọdụ n'Ala Igbo gwara BBC na mkpebi otu ha dịka o kwesịrị.

Onye bụbụ onyeisi ndị NBA n'Ebonyi steeti bụ Ọkaiwu Anthony Okah gwara BBC Igbo n'okwu ahụ na "ọ bụghị ihe otu onye kwuru."

Okah kwuru na ọ bụ ndị ọkaiwu niile si na mpaghara Naijiria nakwa steeti niile nọ na NEC chịkọtara aka kwuo ya n'ihi na "Gọvanọ Elrufai enwebeghị ihe mere iji gosi na ọ chọrọ ka a kwụsị ogbugbu mmadụ na Kaduna."

Ókaiwu Anthony Okah

Ebe foto si, Anthony Okah

Nkọwa foto, Ókaiwu Anthony Okah sị na mkpebi NBA a bụghị "ihe otu onye kwuru."

N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ifeanyị Olumba sị na "ọ bụ ihe e ji atụzị mmadụ aka ka ọ ga mee ihe dị mma, ka a kwụsị ịkwafu ọbara."

Olumba sị na o nweghị ka ya bụ ihe si gbasa agbụrụ maọbụ okpukperechi.

Ọ kpọrọ oku ka El-Rufai ṅomiri aka chiburu Sokoto steeti bụ Shehu Mai Kangiwa, onye o kwuru katọrọ ụdị ogbugbu mmadụ na-eme na Kaduna oge o mere n'oge ọchịchị ya.

Okaiwu Ifeanyi Olumba

Ebe foto si, Ifeanyi Olumba

Nkọwa foto, Okaiwu Ifeanyi Olumba sị na

Ụfọdụ n'ime ndị toro NBA were si na ọ bụ ụdị ihe bụ ihe a chọọ ka eme ndị n'ọkwa ọchịchị obodo na anaghị eme ihe ha kwesịrị ime.

Ụfọdụ sonyere El-Rufai gbarụrụ ihu n' agwa ndị NBA kpasara ya.

Ndị NBA nọ na Duste hụtara ya dịka ịkpa oke agbụụ na okpukpere ha kwuru na ha dọnyere El-Rufai ukwu.

Mana ndị isi NBA si n' eziokwu adịghị n'ebubo ịkpa oke.

N'akwụkwọ mgbasaozi nke onyeisi NBA bụ Paul Usoro binyere aka, o kwuru na mkpebi ahụ nke ndị ime obi otu NBA nwere dịka ha mechara nzụkọ n'abalị iri abụọ nke Ọgọstụ "enweghị ka o si metụtụ agbụụ onye si maọbụ okpukperechi onye,"na ọ bụghị na ha na-ama El-Rufai ikpe ime ihe ọbụla."

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ya bụ okwu aghọọla ọgụ ịtụ okwute n'ime ahịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ bidoro kpọwa oku ka e were aka e jiri soo El-Rufai were sooro ndị ọzọ NBA kpọrọ oku na ọgbakọ ha dịka Nyesom Wike.

Ebe okwu si bido

NBA hiwere ọgbakọ nke ga-abụ mbụ ha na-enwe ọgbakọ n'ikuku(virtual meeting)ma kpọọ ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu oku ịbịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha.

Ndị ha kpọrọ oku gụnyere El-Rufai, onye ha chọrọ ka ọ bịa kwuo gbasara ọnọdụ nchekwa na steeti ya na ihe ndị ọzọ;Nyesom Wike maka inye onye abụghị onye Rivas ọkwa ọkaikpe ukwu na steeti ya na Peter Obi dịka onye mara etu e si ejikwa ego.

Ndị ọzọ bụ Pastọ Tunde Bakare, ụkọchukwu a mara maka ịkpọ okwu aha; Oby Ezekwesili, onye so bido BringBackOurGirls,( ikwu maka atụmatụ Naijiria ọ na-ejikọ ka ọ na-ekewa Naijria), nakwa Salamatu Hussaini Suleiman bụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: