Nnamdi Kanu: Ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ na-agbara Buhari mbọ
Akụkọ dị mkpa

Onyeisi Ipob bụ Nnamdi kanu ekwuola na ndị gọvanọ mpaghara ọnwụwaanyanụ na-arụrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ọrụ, ihụ na ọ lọghachitere n'ọchịchị ọzọ na 2019.
Kanu kwuru nke a n'okwu o zipụtara n'igwe redio Biafra n'ụbochi ụka gara aga.
Nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti

Ọ ga-akpọtụ n'Owerri n'ụbọchị Fraịde bụ abalị iri na asatọ nke Jenụwarị bụ mgbe oge nrụrịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo
Nrụrịtaụka a bụ nke ụlọọrụ mgbasa ozi BBC Igbo na-ahazi ga-enye ndị a ohere ịkọwara ndị Imo Steeti ọrụ ha ga-arụ ma ha baa n'ọchịchị.
Nke a ga-amalite n'elekere abụọ nke ehihie, a ga-agbasa ya n'igwe redio nakwa n'akara Facebook na Instagram bụ BBC News Igbo.
N'ofesi

Ebe foto si, Reuters
Pawel Adamowicz bụ Mayor mba obodo Gdansk nke mba Poland anwụọla n'ụlọọgwụ site na mma a mara ya ebe ọ na-arụ ọrụ ebere.
Ndị uweojii nwụchiri otu nwoke ama ama n'ime mpụ gbara afọ iri abụọ na asaa maka ịkpa arụ a.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'asọmpị English Premier, Manchester City ga-anabata ndị Wolverhampton Wanderers iji mara ma ha a ga-agbago n'ogogo tebulu.
A na-atụ anya na Sergio Aguero na Vincent Kompany bụ ndị si n'ute ọrịa gbakee ga-esonye n'asompi a.
Nkeji
Lee ihe nkiri a were tụọ ndụ mmanụ
Akụkọ ga-amasị gị
Niger Delta agitators akatọla mkpọpụ Onnoghen

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo etinyele ọnụ na nkatọ mkpụkpụ gọọmentị etiti kpụpụrụ ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Walter Onnoghen n'ụlọikpe Code of Conduct Tribunal.
N'aka nke ọzọ, ndị ọgbakọ otu na azọtara ndị Niger Delta oke ha ekwuola na ha ga-ebido ịgbari ebe ana arụpụta mmanụ agbidi dị na mpaghara ahụ ma gọọmentị etiti kpa ya bụ nwaamdị aka.
Trump adọọla Turkey aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Turkey aka na ntị na ya ga-adọtụ akụnaụba ha ma ha kpaa agwa megide ndị Kurd ma ọ bụrụ mba Amerịka si na Sirịa pụọ.
Ndị Kurd bụ ndị mba Turkey na-agụta dịka ndị agha nnupuisi kwadoro mba Amerịka n'oge ha na mba Sirịa lụrụ agha.
N'egwuruegwu,

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu ebe Manchester United ji otu ọkpụ merie Tottenham na Premier League, Barcelona ejirila ọkpụ atọ gwọ ndị Eibar ịba n'asọmpị La liga.
Mmerie ndị Barcalona a nyere Lional Messi ohere inyezU goOlu narị anọ bụ nke mere ya onye mbụ mere otu a n'asọmpi La liga.











